Ọwara Oké Osimiri Azzurro

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Àtụ:Infobox ship imageÀtụ:Infobox ship careerÀtụ:Infobox ship characteristics

E bidoro ụgbọ mmiri North Sea MS Golfo Azzurro na 1987 dị ka Maarten Cornelis, ọ bụkwa ụgbọ mmiri mbụ na Netherlands nke nwere EUR SumWing.[1][2] Site na 2016-2017 ọ bụ ụlọ ọrụ NGO Spanish Proactiva Open Arms kwụrụ ụgwọ ya ma jiri ya mee ihe maka ọrụ ọchụchọ na nnapụta dị nso na mmiri Libya.[3]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Dị ka TX 33 Maarten Cornelis, na 2009 e ji ya nwalee "SumWing" nke kpatara obere nsogbu nala oké osimiri karịa omenala beam trawl nihi na nku ya naefe nelu ala mgbe ọ naegbu azụ. Ọ naejikwa obere mmanụ karịa ịkụ azụ ọdịnala.

Nafọ 2010, ụlọ ọrụ Golfo Azzurro Foundation gbazitere ụgbọ mmiri ahụ bụ ndị ya na Sea Shepherd Conservation Society jikọrọ aka ma, site na iji ego sitere na Brigitte Bardot Foundation, jiri ụgbọ mmiri ahụ mee ihe maka ọrụ nlekota nzuzo na Danish Protectorate of the Faroe Islands.[4][5]

Nabalị iri na asaa nọnwa Ọgọstụ, ndị uwe ojii Danish banyere nụgbọ mmiri ahụ ma nyochaa ya wee hapụ ya ka ọ gaa nokpuru ndị Royal Danish Navy. E kenyere ụgbọ mmiri Thetis nke Denmark <i id="mwKA">Triton</i> iji nyochaa omume ha.[6]

Na June 2016 Golfo Azzurro kpọrọ 'Boat Refuge Foundation', ntọala Dutch, ka ha gaa ịchọ ma napụta iji zọpụta ndị gbara ọsọ ndụ na Oké Osimiri Mediterenian. Ọ bụ Adrian J. Sonneveld, Captain na shipmanager naelekọta ụgbọ mmiri ahụ. Ọ bụ ndị naeche nche nụsọ oké osimiri nke Ịtali naahụ maka ọrụ ọchụchọ na nnapụta. Golfo Azzuro naarụ ọrụ nokpuru ọkọlọtọ Panama. The Boat Refuge Foundation kwụrụ ụgbọ mmiri ahụ maka ọnụahịa ihe atụ. Ụlọ ọrụ Golfo Azzurro Foundation dị na Rotterdam.

N'ọnwa Disemba afọ 2016 ụlọ ọrụ NGO nke Spain bụ Proactiva Open Arms kwụrụ ụgwọ Golfo Azzurro, (NGO Boat Refuge Foundation kwụsịrị ọrụ ọchụchọ na nnapụta na Nọvemba afọ 2016) wee malite ịchọ na nnapụisi nakụkụ mmiri Libya. Noge ahụ, Pro Activa Open Arms naeme nchọta na nnapụta nke ọma na ụgbọ mmiri ASTRAL.

Noge ọchụchọ na nnapụta na Mediterenian, netiti Ọgọst 2016 na Ọgọust 2017, Golfo Azzurro napụtara ihe karịrị ụmụ nwanyị, ụmụ nwoke na ụmụaka 8,500, ma kwado ndị NGO ndị ọzọ na ihe dị ka mmadụ 1500 nọ na nsogbu. Dị ka ụgbọ mmiri nnapụta ndị ọzọ, ọ chere egwu sitere naka ndị nche osimiri Libya ihu.[7]

Nime ọnwa mbụ nke ọrụ nchọta na nnapụta René Hazenkamp si Netherlands (otu nime ndị ọrụ; onye naesi nri) mere ihe nkiri banyere Golfo Azzurro na ndị ọrụ ya.[8] Ihe nkiri a, GANGWAY TO A FUTURE, gosipụtara na Jenụwarị 2018 na International Film Festival Rotterdam.

Ihe odide[dezie | dezie ebe o si]

  1. oceanguardians.org. Archived from the original on August 25, 2010. Retrieved on September 5, 2010.
  2. Koopvaardy. Archived from the original on July 24, 2011. Retrieved on Sep 6, 2010.
  3. Behrakis. "Spanish migrant rescue ship threatened by Libyan coastguard: witness", Reuters, 2017-08-15. Retrieved on 2020-11-16. (in en)
  4. Death in the Ferocious Isles: Sea Shepherd under Escort by the Danish Navy. Sea Shepherd Conservation Society. Archived from the original on August 28, 2010. Retrieved on August 31, 2010.
  5. Paul Watson eigur Golfo Azzurro. Portal.fo. Retrieved on September 1, 2010.
  6. Stichting Golfo Azzurro. Retrieved on September 5, 2010.
  7. Behrakis. "Spanish migrant rescue ship threatened by Libyan coastguard: witness", Reuters, 2017-08-15. Retrieved on 2020-11-16. (in en)
  8. Gangway to a Future – Refugees Welcome Film Fest (en-US). Retrieved on 2020-11-16.

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]