Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Mmiri n'Ụlọ Ọrụ Australia

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

E guzobere Australian Greenhouse Office (AGO) n'afọ 1998 n'ime Gọọmentị nke Australia dị ka ụlọ ọrụ kwụ otu ébé n'ime ngalaba gbụrụ-gbúrụ ébé obibi iji nye usoro gọọmentị niile màkà ihe ndị na-ekpo ọkụ. Ọ bụ ụlọ ọrụ gọọmentị izizi n'ụwa nké raara onwé ya nye ibelata gas na-ekpo ọkụ, na-achịkwa nzaghachi Australia màkà mgbanwe ihu igwe, ma nye ọha na eze ozi gọọmentị kwadoro.

Ónyé édémédé Guy Pearse were ụlọ ọrụ ahụ n'ọrụ dị ka ónyé ndụmọdụ. Ọfịs ahụ were David Evans n'ọrụ site n'afo 1999 ruo afọ 2005 iji mee ndekọ carbon na iwu ihe nlereanya.[1]

Akụkọ ihe mere eme[dezie | dezie ebe o si]

Ụlọ ọrụ ahụ bụ ọrụ na-ahụ màkà ijikwa mmemme Energy Star na Australia ma nye ego màkà nnwale bọs fuel cell na Perth. E mepụtara usoro nyocha iji nyéré ndị kansụl mpaghara aka imeziwanye arụmọrụ ike nke ọkụ ha, okpomọkụ, ikuku na ikuku oyi.[2]

N'afọ 2001, ụlọ ọrụ Australian Greenhouse Office wepụtara Australian Minimum Energy Performance Standards (MEPS), nkè e dezigharịrị n'afọ 2006 ruo n'ọkwa siri ike.[3]

N'afọ 2004, ọ ghọrọ akụkụ nkè Ngalaba Na-ahụ Maka Gburugburu Ebe Obibi na Ihe Nketa. Mgbè ntuli aka gọọmentị etiti nke afọ 2007 gasịrị, e kewara ọrụ AGO n'etiti Ngalaba Mgbanwe ihu igwe ọhụrụ na Ngalaba Gbụrụ-gbúrụ Ébé Obibi, Mmiri, Ihe Nketa na Nkà. N'ọnwa Machị 2010, ndị fọdụrụ na ọrụ AGO- (Renewable Energy Efficiency Division) kwagara na DCC, na-emepụta Ngalaba Mgbanwe ihu igwe na Energy Efficience ọhụrụ.

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

  • Mgbanwe ihu igwe na Australia
  • Mmetụta nke okpomọkụ ụwa na Australia
  • Ike na-agbanwe agbanwe na Australia

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. David Evans. "No smoking hot spot", The Australian, News Limited, 18 July 2008. Retrieved on 28 September 2012.
  2. Harvey Grennan. "Waste adds $344m to carbon cost", The Sydney Morning Herald, Fairfax Media, 16 September 2008. Retrieved on 28 September 2012.
  3. "Motor efficiency evolution", Manufacturers’ Monthly, Reed Business Publishing, 1 January 2009. Retrieved on 28 September 2012.

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]