Ụlọ Ọrụ Na-enye Ọkụ site na Mmiri Sahofika

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Àtụ:Infobox dam

Sahofika Hydroelectric ọdụ ike nke a na-akpọkwa Sahofika ọdụ ike, bụ ụlọ ọrụ ọkụ eletrik nwere narị abụọ na ise a na akpọ megawatts na bekee (275,000 ) nke a na'ewu na Madagascar.[1]

Ebe[dezie | dezie ebe o si]

Ụlọ ọrụ ọkụ eletrik dị n'ofe a na akpọ Osimiri Onive, ihe dị ka ọnụ ọgụgụ kilomita otú narị (62 mi), na mpụga isi obodo Antananarivo.[1]

Nchịkọta[dezie | dezie ebe o si]

Ụlọ ọrụ ọkụ eletrik bụ nnukwu ọrụ na ahụ màkà mmepụta ọkụ eletrik na Madagascar. Dam ahụ ga-adị ta mita iri isii (197 ) n'ịdị elu, na-emepụta ọdọ mmiri nwere mpaghara 6.7 uare kilomita (3 sq mi). Site na ọdọ mmiri ahụ, mmiri ga-agafe paịpụ nke dị mita narị asaa na iri otu na isii (2,349 ) n'ogologo iji rute n'ụlọ ọkụ. Ụlọ ọkụ ahụ nwere turbines asaa, nke ọ bụla dị na nke akpọrọ megawatts 29.3, maka ngụkọta mmepụta nke megawatts narị abụọ na ise. A ga-ewepụ ike a na-emepụta na ụlọ ọrụ ike a site na eriri nnyefe voltaji dị elu nke narị abụọ na iri abụọ kiloVolts ọhụrụ gaa ebe Jirama, ụlọ ọrụ ọkụ eletrik nke mba, ga-etinye ya na grid ọkụ eletrik mba.[1][2] A bịanyere aka na nkwekọrịta ịzụta ike afọ 25, n'etiti NEHO na Jirama.[3]

A na-atụ anya na ụlọ ọrụ ọkụ a ga-enye ndị mmadụ dị ka nde asatọ ike, ma nyere Madagascar aka izere mpụga nke tọn carbon dioxide 900,000 kwa afọ.[1][2]

Ndị mmepe, ndị nwe ya na ego[dezie | dezie ebe o si]

Ọrụ a bụ ọrụ mmekọrịta ọha na eze (PPP), n'etiti (a) Gọọmentị Madagascar na (b) otu a na-akpọ Nouvelle énergie hydroélectrique de l'Onive (NEHO) ma ọ bụ New Onive Hydroelectric Energy Consortium, nke gụnyere ụlọ ọrụ French Eiffage na Eranove na ụlọ ọrụ Themis.[1] Gọọmentị Madagascar ga-enye € 30 nde maka mmepe nke ụlọ ọrụ ọkụ a.[1][2][4]

Ụlọ akụ mmepe Afrịka, site na nke akpọrọ African Development Fund, gbazinyere gọọmentị Madagascar ego bụ nde anọ € 4.02 maka ọrụ a. Na mgbakwunye, a na-atụ anya na Arab Bank for Economic Development in Africa (BADEA) na European Union, ga-enye ego ọzọ maka ọrụ a.[2][4]

Ọnụ ego na owuwu[dezie | dezie ebe o si]

Ngụkọta ego maka ụlọ ọrụ ọkụ ahụ bụ US $ 895 nde (ihe dị ka € 836 nde). A họọrọ ndị otu NEHO ka ha mee ọmụmụ ihe, nye ego, wuo ụlọ ọrụ ọkụ eletrik, rụọ ọrụ ụlọ ọrụ ahụ mgbe emechara ya ma debe ya n'ọdịnihu. Gọọmentị Madagascar ga-enye € 30 nde iri atọ, maka ọrụ ahụ ma bụrụ onye nwere òkè na ụlọ ọrụ ọkụ eletrik mgbe arụchara ya. E bidoro iwu ya n'ọnwa Disemba afọ 2019 ma na-atụ anya na a ga-arụ ọrụ ahụ n'afọ 2024.[5]

Ihe owuwu ndị metụtara ya[dezie | dezie ebe o si]

Ọrụ owuwu ahụ gụnyere (a) ụlọ ọrụ ọkụ ọhụrụ (b) eriri nnyefe 220kV ọhụrụ, na-atụ ihe dị ka kilomita 75 (47 ) na (c) mmezigharị nke ihe dị ka kilomita 110 (68 mi) nke okporo ụzọ. A na-atụ anya na ụlọ ọrụ ọkụ eletrik ga-abịa n'ịntanetị na afọ 2024.[1]

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

 

  • Ihe Mmiri Africa
  • Ụlọ Ọrụ Ike Madagascar
  • Ụlọ Ọrụ Ike Hydroelectric Volobe

Ndemsibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 1.4 1.5 1.6 Jean Marie Takouleu (26 May 2020). Madagascar: ADF supports Sahofika hydropower project with a €4 million loan. Afrik21.africa. Retrieved on 14 September 2020.
  2. 2.0 2.1 2.2 2.3 African Development Bank (22 May 2020). Madagascar: Government of Madagascar gets Euro 4 million from African Development Fund for Sahofika hydropower project. African Development Bank. Retrieved on 14 September 2020.
  3. Jean Marie Takouleu (26 November 2021). Madagascar: Jirama to buy electricity from Sahofika hydroelectric plant. Afrik21.africa. Retrieved on 9 June 2022.
  4. 4.0 4.1 Sihle Qekeleshe (26 May 2020). AfDB Funds Madagascar's Sahofika Hydropower Project. Africaoilandpower.com. Archived from the original on 29 June 2020. Retrieved on 14 September 2020.
  5. Africa Energy Portal (11 June 2019). Madagascar: Construction of Sahofika hydroelectric plant to begin in December. Africa Energy Portal. Retrieved on 14 September 2020.

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]

  • AfDB ga-enye nkwa $ 100m maka 205MW Sahofika hydropower project na Madagascar Ka ọ na-erule 19 Disemba 2019.