Ụlọ Ọrụ Nuklia nke Malaysia

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Ụlọ ọrụ nuklia nke Malaysia (Agensi Nuklear Malaysia, ANM) bụ ụlọ ọrụ nyocha teknụzụ nuklia nke Malaysia nke dị na Bangi, Selangor.

ANM na-ewebata ma na-akwalite itinye sayensị nuklia na teknụzụ maka mmepe mba.

Akụkọ ihe mere mgbe gara aga[dezie | dezie ebe o si]

E guzobere ANM na 19 Septemba 1972, a maara ya mgbe ahụ dịka centa na ahụ maka itinye akwụkwọ nke ihe nuklia Malaysia (CRANE). A kpọrọ ya Tun Ismail Atomic Research Centre (PUSPATI).

Na Juun 1983, e debere PUSPATI n'okpuru nkwado nke Praịm Minista ma kpọọ ya Nuclear Energy Unit (UTN). E debere ya n'okpuru ministri na ahu maka sayensị, teknoloji nakwa ihe gbasara mbaraezi n'ọnwa Ọktoba afọ 1990. N'ọnwa Ọgọstụ afọ 1994, a gbanwere aha ya ka ọ bụrụ Malaysian Institute for Nuclear Technology Research (MINT).

N'abalị iri abụọ na asatọ n'ọnwa Septemba n'afọ 2006, mgbe e mezigharịrị ya, e nyere MINT njirimara ọhụrụ, nke bụ Malaysian Nuclear Agency. Ebe ọ dị, nso na ụlọ akwụkwọ agụmakwụkwọ dị elu. Ọ dị nso na mpaghara etiti nke na ahu maka centa gburugburu, Putrajay na Multimedia Super Corridor, Cyberjaya.

Mgbanwe aha ahụ sochiri mgbanwe buru ibu na nhazi nke isi azụmahịa ya iji guzobe ike nuklia na Malaysia dị ka ụdị ọzọ nke ike na-agbanwe agbanwe.  

Ọrụ nhazi[dezie | dezie ebe o si]

Ọrụ ANM bụ:

  • Na-eme nchọpụta na mmepe (R&D), ọrụ na ọzụzụ na ngalaba teknụzụ nuklia maka mmepe mba;
  • Na-agba ume itinye n'ọrụ, nyefee na ịzụ ahịa nke teknụzụ nuklia; na,
  • Na-ahazi ma na-achịkwa ihe omume nuklia nke mba na nke mba ụwa, ma na-arụ ọrụ dị ka ụlọ ọrụ na-ahụ maka mmekọrịta na International Atomic Energy Agency (IAEA) na Comprehensive Nuclear-Test-Ban Treaty Organization (CTBTO).

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]

Àtụ:Federal Government of Malaysia