Ụlọ ọrụ gas nke East Mediterranean

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

East Mediterranean Gas Company (EMG) bụ ndi nwe na ndi na-arụ ọrụ nke Peace Pipileine Al Arish-Ashkelon pipeline. EMG bụ ụlọ ọrụ jikọtara aka nke Mediterranean Gas Pipeline Ltd MGPC nke bụ nke "Evsen Group of Companies" (17 pacenti), EMED BV (39 pacenti), East Gas Company EGC (9 pacenti), na Egyptian General Petroleum Corporation (10 pacenti).[1]

E wubere EMG n'afọ 2000 iji bubata Gas nke Ijipt na Obodo Israel, ọrụ ahụ malitere mbupụ gas ahụ n'afọ 2008, n'afọ 2012 ka a kwụsịrị nkwekọrịta Gas na EMG.

N'afọ 2019 a gbanwere ebe EMG iji kwe ka gas sitere n'okike si Israel gaa obodo Ijipt, gas sitere n"okike malitere ịgafe na paịpụ udo gaa Ijipt n'afọ 2020.

 

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. "PTT buys 25% of East Mediterranean Gas Co.", Oil & Gas Journal, PennWell Corporation, 2007-12-07. Retrieved on 2011-02-05.