Jump to content

Ụmụanụmanụ Bi n’Ọhịa Mbà Chaịna

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
The giant panda. Nnukwu anụmanụ a na-aza jayentị panda n’asụsụ Bekee bụ anụmanụ a na-ahụkarị n’ọhịa mbà Chaịna. Ọ bụ otù n’ime ụmụanụmanụ e chekwara nihi na ọ bụrụ na emeghị nke a, agaghị ahụkwa ụdị ha ọzọ. Ị ga-ahụ ya n’ebe a edekọrọ ụmụanụmanụ mbà Chaịna a na agaghị ahụzi n’ụwa ma ọ bụrụ na amaghị ihe e mere: endangered and protected species.
Enwè a, a kpọrọ enwè imi-mbamba, (The snub-nosed monkey), sokwa n’ụmụanụmanụ nọ n'izè ndụ, e chekwara ka ha birikwa n’ụwa.


Ụmụanụmanụ dị ichè ichè a na-ahụ n’ọhịa mbà Chaịna dị ka aja n’ọnụọgụgụ. Dịka otù n’ime mbà ụwa iri na asaa a kpọrọ megadiverse countries a maara ka mbà nwere igurube ihe dị ichè ichè,[1] mbà Chaịna nwere ụdị anụmanụ dị puku asaa, narị ise na iri na isii (7,516) nwere ọkpụkpụ n’etiti azụ, nke a na-akpọ “vertebrates” n’asụsụ Bekee. Ụmụanụmanụ ndị a nwere ọkpụkpụ n’etiti azụ gụnyere azụ̀ dị ụdị anọ (4), nnụnụ dị ụdị iri isii na itolu (69), anụmanụ dịka mmadụ - dị ụdị narị ise na iri isii na abụọ (562) – bụ ndị e dere n’ebe a: mammal, ngwere na agwọ na ụmụanụmanụ ndị yiri ha (Bekee kpọrọ repụtaịlị) dị ụdị narị anọ na atọ (403) na awọ̀ na ụmụanụmanụ ndị yiri ya (Bekee kpọrọ amphibian) dị ụdị narị atọ na iri anọ na isii (346).[2] Chaịna bụ mbà nke atọ kacha nwee ụdị ụmụanụmanụ dị ka mmadụ n’ụwa niile.[3] A bịa n'ụdị nnụnụ e nwere n’ụwa, Chaịna bụ mbà nke asatọ kacha nwee ọnụọgụgụ nnụnụ dị ichè ichè.[4] Chaịna nọ n’ọnọdụ nke asaa ma a bịa na mbà ụwa kacha nwee ụdị ngwere, agwọ na ụmụanụmanụ yiri ha,[5] nọrọ kwa n’ọnọdụ nke asaa na mbà ụwa kacha nwee awọ̀ na ụmụanụmanụ dị ichè ichè yiri ya.[6]


Ụdị ụmụanụmanụ bụ na Chaịna ka Chukwu kenyere ha dị ọtụtụ. Ndị Bekee sị na ụmụanụmanụ ndị a dị endemic na mbà Chaịna. Otù n’ime ha bụ jayentị panda (giant panda.), bụ anụmanụ a maara nke ọma na o bi n’ọhịa Chaịna. Otù ụdị n’ime ụdị isii ụmụanụmanụ dị ka mmadụ na ụdị awọ abụọ n’ime ụdị awọ atọ bụ na Chaịna ka Chukwu kenyere ha.[3][6]


Nihi na Chaịna bụ mbà kacha nwee ọnụọgụgụ mmadụ n’ụwa, ndị ha na ụmụanụmanụ bị n’ohịa na-ekekọrịta ebe obibi nakwa azọ ihe ụkọ nke ndụ dị egwu. Ndị mmadụ na-emebikarị ebe obibi na gburùgburù, na-achọkwa ihe oriri, mgbọrọgwụ na mkpa-akwụkwọ maka ọgwụ omenala (traditional Chinese medicine) n’ebe ọbụla, wee si òtù a na-etinye ihe karịrị narị ụmụanụmanụ asatọ na iri anọ (840) n’izè ndụ maọbụ na-eme ka a ghara ịhụ ha ọzọ n’ụwa.[7] E dere ụdị ụmụanụmanụ ndị a n’ebe a: species are threatened, vulnerable or in danger of local extinction. E nwere iwu na-echekwaba ụmụanụmanụ ndị a nọ n’izè ndụ. N’afọ 2005, ebe e chekwara echekwa na mbà Chaịna dị puku abụọ, narị atọ na iri anọ na itolu (2,349), nke pụtara obosara ala dị Lua error in package.lua at line 80: module 'Module:Convert/data' not found., maọbụ ụzọ iri na ise n’otù narị ala ndị Chaịna[8]

  1. Biodiversity Theme Report. Environment.gov.au (2009).
  2. China: vertebrate species by type 2015 - Statistic.
  3. 3.0 3.1 IUCN Initiatives – Mammals – Analysis of Data – Geographic Patterns 2012. IUCN. Retrieved 24 April 2013. Data does not include species in Taiwan.
  4. Countries with the most bird species. Mongabay.com. 2004 data. Retrieved 24 April 2013.
  5. Countries with the most reptile species. Mongabay.com. 2004 data. Retrieved 24 April 2013.
  6. 6.0 6.1 IUCN Initiatives – Amphibians – Analysis of Data – Geographic Patterns 2012. IUCN. Retrieved 24 April 2013. Data does not include species in Taiwan.
  7. Top 20 countries with most endangered species IUCN Red List. 5 March 2010. Retrieved 24 April 2013.
  8. Nature Reserves. China.org.cn.