2Shotz

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
2Shotz
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya3 Maachị 1979 Dezie
Ebe ọmụmụSurulere Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye na-abụ abụ, onye egwu Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum nke Ȯra Lagos Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)1997 Dezie

William Orioha (amụrụ ya na 3 Mach 1979), onye ama ama dịka 2Shotz,ọ bụbu onye rapa na onye na-ede egwu na Naịjirịa Ọ bụzị onye na-ese foto na onye na-eme ihe nkiri na US [1] O meriri Ọkachaa tikọọ egwu na Headies 2006. [2] E wepụtara abọm mbụ ya na 2004. Egwu atọ kwadoro ya: "Carry Am Go", "Odeshi" na "Delicious". [3] Studiyo abọm ya nke abụọ bụ nke ezigbo pụtara na 2005. O weputara studiyo abọm nke atọ ya "Commercial Avenue" na 2007. Emepụtara studiyo abọm ya nke anọ Music Business na 2008. 2Shotz wepụtara "I am William" na "Loud Silence" dịka studiyo abọm nke ise na nke isii na 2010 na 2016. [4] Ọ bụ onye egwu hipụ họpụ na-arapụ nabekee, Pidgin na Igbo . [5]

Mmalite ndụ na agụm akwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

kwwụkwọa

A mụrụ 2shotz na Surulere, Legọọsụ Steeti, Naịjirịa na ezinaụlọ dị atọ. Ọ bụ onye Ụmụahịa, Abịa Steeti. Ọ gara sekọndịrị sukulu ya Government Koleji Ụmụahịa. 2shotz gụchara akwụkwọ, nweta digirii ya na "industrial relations and personnel management" na Mahadum Legọọsụ (LASU)

Ọrụ egwu[dezie | dezie ebe o si]

2Shotz malitere ịti egwu mgbe ọ nọ n'ụlọ akwụkwọ sekọndrị ma kpebie ịchụso ọrụ na egwu tupu ọ debanye aha na LASU. Na 1999, ya na 2Ply jikọtara ọnụ wepụta otu ọrụ. Ha binyere aka n'ụlọ mmepụta egwu eLDee 's Trybesmen na 2000 wee wepụta abọm mbụ ha bụ Men at Work n'okpuru Lebeelu ahụ. Egwu a bụ "For the Men" kwadoro abọm ahụ. 2Shotz binyere akwụkwọ nkwekọrịta solo nke ya na "Trybe Records" nke na-eso mgbasa nke otu ahụ na 2000. [6] Ọ mechara sonye n’otu egwuregwu a na-akpọ The Trybe ma dekọọ egwu na 2001 “Oya". [7] N’afọ 2005, ọ malitere ndekọ lebeelụ ya nke aha ya bụ "Umunnamu Music". [1] [8] Ọ sonyeere ndeko lebeelụ Obi Asika na "Storm Records" ka otu afọ gasịrị, ọ hapụrụ lebeelụ ahụ iji lekwasị anya na "Umunnamu music". [9] Na 2016, ọ hapụrụ egwu ịchụso ọrụ na foto na ime ihe nkiri ma kwuo na anaghị eto ya nke ọma na Naijiria. [10] [11]

Ndụ onwe[dezie | dezie ebe o si]

2Shotz lụrụ enyi ya nwanyị, onye ọ zutere na Twitter, na ụlọikpe na-ahụ maka alụmdi na Ikoyi na 12 Epurel 2013. [12] [13] Ha nwere nwa nwanyị amụrụ na Ireland na 12 Maachị 2015. [14] 2Shotz na nwunye ya gbasara na Disemba 2015 mgbe o boro ya ebubo iti ya ihe n'ụlọ ha. [15]

Ihe nkiri[dezie | dezie ebe o si]

Studiyo abọm[dezie | dezie ebe o si]

  • Pirated Copy (2004)
  • Original Copy (2005)
  • Commercial Avenue (2007)
  • Music Business (2008)
  • I AM William (2011)
  • Loud Silence (2016)

Otu Egwu[dezie | dezie ebe o si]

  • "Delicious" (2004)
  • "Odeshi" (2004)
  • "Carry Am Go" (2004)
  • "Make Dem Talk" (2006)
  • "Which Level" (2007)
  • "Incase U Never Know" (2008)

Onyinye na nhọpụta[dezie | dezie ebe o si]

Afọ Awọdụ Ige Nnata Rịzọọtụ
2011 The Headies Ọkachamma Abọm Rapụ I am William Ahọpụtara
2009 Egwu nke Afọ "Incase U Never Know"

(ya na Timaya)
Ahọpụtara
2006 Ọkachamma Egwu Etikọrọ ọnụ "Delicious"

(ya na Big Lo)
Merie

Nsidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 "Meet 10 Nigerian artistes who faded from the scene".
  2. Winners - The Headies 2006. Archived from the original on 2019-03-09. Retrieved on 2020-11-19.
  3. "[TB ~ 2shotz - Carry Am Go + Odeshi + Delicious Remix ft. Big Lo]".
  4. "2-Shotz - the Veteran, the Visionary".
  5. "2Shotz drops album No. 5".
  6. Enisan, Daniel. "Throwback: 2Shotz - "Incase You Never Know" ft. Timaya", tooXclusive, 24 May 2018. Retrieved on 24 November 2019.
  7. Sokunbi, Deji. "Do You Remember This #ThrowbackTrack? Listen to Da Trybe - Oya", BellaNaija, 18 June 2015. Retrieved on 24 November 2019.
  8. Eribake, Akintayo. "Stop calling me old school – 2shotz", The Vanguard Newspapers, 5 October 2014. Retrieved on 24 November 2019.
  9. Ohunyon, Ehis. "10 Artistes Who Left Storm Records", music.informationng.com, 20 November 2015. Retrieved on 24 November 2019.
  10. Opa, Ogbeni. "Nigerian Rapper, 2Shotz dumps music, Proudly a photographer, filmmaker now in US", WithinNigeria, 7 March 2018. Retrieved on 24 November 2019.
  11. "I Was Never Appreciated In Nigeria – Rapper 2Shotz", Naijaloaded, 8 April 2018. Retrieved on 24 November 2019.
  12. Omigie, Abiodun. "Exclusive Photos: 2Shotz and partner Precious say 'I do'", Nigerian Entertainment Today, 13 April 2013. Retrieved on 24 November 2019.
  13. "2shots Tells How He Met With His Wife", Information Nigeria, 20 April 2014. Retrieved on 24 November 2019.
  14. "Rapper 2shotz welcomes daughter", The Nation Newspaper, 15 March 2015. Retrieved on 24 November 2019.
  15. "Rapper 2Shotz’s wife Precious cries out about Alleged Domestic Violence", BellaNaija, 3 December 2015. Retrieved on 24 November 2019.