4 Bourdillon

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
4 Bourdillon
building
mba/obodoNaijiria Dezie
nhazi ọnọdụ6°26′42″N 3°26′2″E Dezie
Map
Bourdillon, Ikoyi Lagos
Bourdillon road sign

4 Bourdillon bụ otu n'ime ụlọ obibi kachasị elu na mpaghara odida anyanwu Africa. Ọ dị na nkuku nke Bourdillon na Thompson Road, Ikoyi, Lagos. Ọ bụ Twin Tower nke 25 Floors nwere ụlọ ịrị anọ na otu (Flats, Duplex Flats na Duplex Penthouses). Ụlọ obibi ịrị anọ na otu ahụ nwere ụlọ nwere ebe ndina atọ, anọ nakwa ise ya na Penthouses.

Ihe ndị ọzọ dị n'ụlọ ahụ nwere gụnyere ahịhịa ndụ, mmiri, ọdọ mmiri, ogige egwuregwu tennis, ụlọ mmega ahụ na ụlọ klọb. O nwekwara ebe a na-adọba ụgbọala n'okpuru ala. Penthouses ya nwere ogige elu ụlọ na balconies gbagọrọ agbagọ. Ọ bụ balustrade glazed na-enye ohere ịhụ agwetiti Lagos nke ọma

Ndị na-ese ụkpụrụ ụlọ bụ Design Group Nigeria, P&T bu otu haziri ụlọ ahụ ebe Kaizen Properties na El-Alan Group mepụtara ya. El-Alan bụkwa onye isi ọrụ ngo. E bidoro iwu ya n'afọ 2015 ma wuchaa ya na mbido afọ 2020.[1][2][3][4]

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

Ndepụta ụlọ kachasị elu na Naịjirịa

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. Neil Minshi. "Lagos Luxury Property: No matter how bad the economy is, they buy", Financial Times, June 8, 2021. Retrieved on August 22, 2021.
  2. 4 Bourdillon. Luxury Villas. Retrieved on September 15, 2021.
  3. "NEW SKYSCRAPERS SPRING UP IN IKOYI, LEKKI & BANANA ISLAND", City People, August 9, 2021. Retrieved on September 15, 2021.
  4. No 4 Bourdillon. EstateIntel. Retrieved on September 15, 2021.

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]

Ebe nrụọrụ weebụsaịtị

  • Video on YouTube

Ebe a na-ewu ụlọ