A Date With Life
Appointment with Life (Àtụ:Lang-ar, Maw`ed Ma` al-Hayat) bụ Ihe nkiri ejije mba Egypt nke afọ 1953 nke Ezz El-Dine Zulficar tụziri aka ya, dee ma mepụtakwa ya. Ndị so mepụta ihe nkiri a gụnyereFaten Hamama, Shoukry Sarhan na Shadia.
Atụmatụ
[dezie | dezie ebe o si](Faten Hamama) kpara àgwà Amal, naanị otu nwa nwanyị nke dọkịta a ma ama, onye ya na Fatimah (Shadia) bi. Fatimah nwere mmasị na Mamdouh, nna Amal, ebe Amal na-ahụkwa Ahmed (Shoukry Sarhan), onye injinia n'anya. Nna Amal matara banyere ọrịa na-egbu egbu nke nwa ya nwanyị nwere, ma kpebie izochinahụ ya eziokwu ahụ. Ndị dọkịta agwala ya na ọ bụ naanị ihe dị ka ọnwa isii ka o nwere ịdị ndụ, ma ọ bụrụ na enweghị ike ịgwọ ya. Amal chọpụtara, nna ya ewee chezie ya eziokwu n'ihu. Ọ rịọrọ onye ọkachamara si mba ọzọ nwere nkà, onye nwere ike ịgwọ ọrịa ya n'ezie. O mechara, mgbe ọ gbakere, lụọ ịhụnanya ya ogologo oge, bụ Ahmed.
Ndị bụ isi mere ihe nkiri a
[dezie | dezie ebe o si]- Faten Hamama
- Shukry Sarhan
- Shadia
- Hussein Riad
- Omar El-Hareery
Edensibia
[dezie | dezie ebe o si]- Film summary (Arabic). Faten Hamama's official site. Retrieved on 2007-01-25.
- Film summary (Arabic). Arabic Movies. Archived from the original on September 16, 2004. Retrieved on 2007-01-25.