Gaa na ọdịnaya

Abdel-Rahim Ahmed

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

 

Abdel-Rahim Ahmed (1944-1991) bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Palestine bụ otu onye n'ime ndị guzobere Arab Liberation Front (ALF). Ọ rụrụ ọrụ dị ka onye òtù kọmitii ezege nke òtù na-ahụ maka nnwere onwe Palestine bụ Palestine Liberation Organisation (PLO).

Akụkọ ndụ Ya

[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Ahmed n'otu obodo nta, Haditha, Mandatory Palestine, n'afọ 1944. [1]"Abdel-Rahim Ahmed, A P.L.O. Leader, 47", The New York Times, 1 July 1991, p. B10. Retrieved on 30 December 2023.</ref> Ezinụlọ ya hapụrụ obodo ahụ wee biri na Jọdan mgbe Nakba gasịrị n'afọ 1948. [2]"Abdel-Rahim Ahmed; Leader of Arab Liberation Front", Los Angeles Times, 1 July 1991. Retrieved on 30 December 2023.</ref> Ọ gụsịrị akwụkwọ na Mahadum Damaskọs ebe ọ nwetara nzere mmụta n'isi ọmụmụ ọrụ ugbo.][1]

Ahmed sonyeere ndọrọ ndọrọ ndị olu agha megide Israel mgbe ọ dị afọ iri na ụma.[2] Ọ bụ otu n'ime ndị guzobere ALF nke dị na Baghdad nke e guzobere n'ọnwa Eprel afọ 1969 wee bụrụ akụkụ nke PLO na Julaị afọ ahụ.[3][4] A kpọrọ ya aha dị ka odeakwụkwọ ukwu nke ALF n'afọ 1975 nke bụ ọkwá o jidere ruo mgbe ọ nwụrụ n'afọ 1991. Mgbe oge ọchịchị ya gasịrị, òtù ALF nwere nkewa dị ịrịba ama n'etiti ndị na-akwado Iraq na ndị na-akwado Yasser Arafat.[3] A họpụtara ya ka ọ bụrụ onye òtù kọmitii ezege nke PLO.[5]

Ahmed lụrụ nwanyị ma nwee ụmụ anọ, ụmụ nwanyị atọ na otu nwa nwoke. [1]

Ahmed nwụrụ site na ọrịa kansa ụbụrụ na akpa ume n'ụlọ ya dị na Amman, Jọdan, mgbe ọ dị afọ iri anọ na asaa na 30 June 1991.[1][2] E liri ya na Amman.][1]

Edensibia

[dezie | dezie ebe o si]
  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 1.4 "Abdel-Rahim Ahmed, A P.L.O. Leader, 47", The New York Times, 1 July 1991, p. B10. Retrieved on 30 December 2023."Abdel-Rahim Ahmed, A P.L.O. Leader, 47". The New York Times. 1 July 1991. p. B10. Retrieved 30 December 2023.
  2. 2.0 2.1 2.2 "Abdel-Rahim Ahmed; Leader of Arab Liberation Front", Los Angeles Times, 1 July 1991. Retrieved on 30 December 2023."Abdel-Rahim Ahmed; Leader of Arab Liberation Front". Los Angeles Times. 1 July 1991. Retrieved 30 December 2023.
  3. Arab Liberation Front (Palestine). fotw.info. Retrieved on 30 December 2023. “citing GlobalSecurity.org
  4. Arab Liberation Front. encyclopedia.com. “Citing Dictionary of the Israeli-Palestinian Conflict
  5. Cheryl A. Rubenberg (Spring 1983). "The Civilian Infrastructure of the Palestine Liberation Organization: An Analysis of the PLO in Lebanon until June 1982". Journal of Palestine Studies 12 (3). DOI:10.2307/2536151.