Abra Amedomé

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Abra Amedomé
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
Aha enyereAbra Dezie
aha ezinụlọ yaAmedomé Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jiMember of the National Assembly of Togo, minister Dezie

Abra Amedomé, nke amụrụ Abra Julie Mawupé Vovor bụ nwanyị ndọrọ ndọrọ ọchịchị Togolese.

N'ịbụ onye a zụrụ dị ka onye na-ahụ maka ọgwụ na France, Montpellier, Abra Julie Amedome laghachiri Togo wee ghọọ onye ọchụnta ego nwere ihe ịga nke ọma. Ọ bụ nwanyị pharmatian mbụ na Togo. Ọ lụrụ prọfesọ Antoine Afantchao Amedome (prọfesọ nke ọgwụ).Ọ rụrụ ọrụ dị mkpa n'òtù na-achị mba, na afọ 1975 ọ ghọrọ onye isi oche nke Union National des Femmes Togolaise. N'afọ 1979 ọ ghọrọ minista na-ahụ maka mmekọrịta mmadụ na ibe ya na mmepụta ụmụ nwanyị, na-aga n'ihu n'ọrụ a ruo n'afọ nke afọ 1983.[1] Ọ bụ otu n'ime ụmụ nwanyị isii a họpụtara ka ọ bụrụ ndị omeiwu nke Togo na afọ1979; ndị ọzọ bụ Cheffi Meatchi, Kossiwa Monsila, Essohana Péré, Zinabou Touré, na Adjoavi Trenou.[2]

Ebesidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. Kathleen E. Sheldon (2005). Historical Dictionary of Women in Sub-Saharan Africa. Scarecrow Press, 1–. ISBN 978-0-8108-5331-7. 
  2. Togo : La sous-représentativité des femmes au Parlement dure depuis 1961 !. fr.africatime.com. Archived from the original on 12 September 2017. Retrieved on 12 September 2017.