Abule-Ado explosion

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Mgbawa Abule-Ado bụ mgbawa na ọkụ mberede nke mere na mpaghara Abule-Addo gburugburu Festac Town, Amuwo Odofin Local Government Area, Steeti Lagos, Naijiria.[1][2][3] Mgbawa na ọkụ ahụ malitere n'ihe dị ka elekere itoolu nke ụtụtụ na Sọnde 15 Machị, na afọ 2020; a gbanyụrụ ọkụ ahụ n'ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ elekere iri na otu nke ehihie.[4][5]

Dị ka ụlọ ọrụ Naịjirịa National Petroleum Corporation (NNPC) si kwuo, mgbawa na ọkụ ahụ kpatara mgbe otu gwongworo kụrụ n'ime cylinders gas dị n'ụlọ ọrụ nhazi gas dị nso na paịpụ gas mebiri emebi. Mmadụ 276,000 hapụrụ dị ka Gọọmentị Lagos Steeti si kwuo.[6][7][8][9]

Ụlọ ọrụ Naịjirịa National Emergency Management Agency mara ọkwa na ka ọ na-erule 15 Machị, na afọ 2020 ọnụ ọgụgụ ndị nwụrụnụ bụ mmadụ 23 na mmadụ 25 merụrụ ahụ na ụlọ 50 mebiri emebi. Nke a gụnyere ụmụ akwụkwọ na ụlọ ọrụ dị na Bethlehem Girls College, Abule-Ado nke e bibiri.[10][11][12] Onye isi ụlọ akwụkwọ nke Bethlehem Girls College na Abule Ado nke Lagos, Henrietta Alokha, nwụrụ mgbe ọ na-anwa ịzọpụta ụmụ akwụkwọ ya n'ọkụ ọkụ n'ụlọ akwụkwọ ahụ.[13][14]

Gọọmentị steeti Lagos nke Babajide Sanwo-Olu duziri mepụtara ego enyemaka maka ndị mgbawa ahụ metụtara na 16 Machị, na afọ 2020. A na-egosi ego ahụ dị ka ego mberede ijeri naira 2 na Gọmentị Steeti Lagos na-enye onyinye nde naira 250 na mmalite ya.[15][16][17]

Ihe odide[dezie | dezie ebe o si]

  1. Ronke. "Young Girl Rescued From Lagos Explosion Site", channelstv.com.
  2. "Houses Burnt, Vehicles Damaged As Explosion Rocks Abule Ado In Amuwo Odofin", channelstv.com.
  3. "BREAKING: Pipeline explosion in Abule Ado, Lagos", tribuneonlineng.com.
  4. "Family of four, 11 others die in Lagos explosion", punchng.com.
  5. "Lagos Explosion: Fire Now Extinguished ― NNPC", tribuneonlineng.com.
  6. "Houses Burnt, Vehicles Damaged As Explosion Rocks Abule Ado In Amuwo Odofin", channelstv.com.
  7. Lagos gas blast kills 15, destroys several buildings, Nigerian officials say. reuters.com.
  8. "Lagos Inferno: The explosion that rocked Nigeria", bbc.co.uk.
  9. pm. "Lagos explosion: 276,000 people displaced – LASG", Guardian Nigeria, 18 March 2020.
  10. "NEMA says 15 killed in latest Lagos explosion tragedy", pulse.ng.
  11. Alao. "Video: Bethlehem Girls College ruined by Lagos explosion", thenationonline.net.
  12. "What caused the blast that destroyed a girls' school". Retrieved on 2020-10-23. (in en-GB)
  13. Adediran. "Lagos Explosion: How school principal died saving students", premiumtimesng.com.
  14. Odita. "Principal pays ultimate price during rescue of pupils from explosion".
  15. Olatunji. "Sanwo-Olu sets up N2bn relief fund for victims of Lagos explosion", thecable.ng.
  16. Ogundele. "BREAKING: Abule-Ado explosion: Lagos sets up N2B emergency relief fund", thenationonlineng.net.
  17. Ufuoma. "Lagos Explosion: Sanwo-Olu seeks contributions to N2 billion relief fund for victims", premiumtimesng.com.