Jump to content

Adewale Aladesanmi

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Templeeti:Infobox royalty Prince Abejide Adewale Aladesanmi (4 Ọgọst 1938 – 21 Jenụarị 2017) bụ onye ọrụ ụlọ akụ nke Naijiria, onye ọchụnta ego na onye isi ndị Yoruba nke ndị Ekiti.

Oge ọ malitere

[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Aladesanmi na 4 Ọgọst 1938 na Nigeria. Nna ya bụ Oba Daniel Aladesanmi II, onye na-achị Ado Ekiti site na 1937 ruo 1983, nne ya bụ Olori Awawu Omosuwaola. Nna nna ya bụ Oba Ajimudaoro Aladesanmi I.

Agụmakwụkwọ na ọrụ

[dezie | dezie ebe o si]

Ọ gụrụ akwụkwọ na Osuntokun School na Christ School dị n'Ado Ekiti. Ọ gara United Kingdom maka agụmakwụkwọ mahadum ya, na-agụ akwụkwọ ndekọ ego na ụlọ akụ na Mahadum Newcastle n'elu Tyne. Ọ laghachiri Naijiria n'afọ 1967 ka ọ nwetachara akara ugo mmụta nkwanye ugwu na ụlọ akụ na ndekọ ego ebe ọ rụrụ ọrụ dịka osote onye isi njikwa kredit na ọrụ na National Bank of Nigeria. Tupu ọ rụọ ọrụ na National Bank ọ rụrụ ọrụ na Lloyds Bank na Barclays na London. Ọ lara ezumike nká na ụlọ akụ n'afọ 1989 ma gọọmenti etiti Naijiria họpụtara ya ka ọ bụrụ onye otu Governing Council of Federal Polytechnic nakwa dịka onye isi ụlọ ọrụ Naijiria National Patroleum Corporation.

Ọnwụ

[dezie | dezie ebe o si]

Aladesanmi nwụrụ na 21 Jenụwarị 2017.[1]

Ihe odide

[dezie | dezie ebe o si]