Afọ ọsịsa

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
afọ ọsịsa
class of disease, symptom or sign
obere ụdị nkegastrointestinal system disease, clinical sign, feces and droppings symptom, disease Dezie
ihe kpatara yaRotavirus Dezie
health specialtyinfectious diseases, gastroenterology Dezie
drug or therapy used for treatmentcarbonic acid, lidamidine, oral rehydration solution Dezie
ICD-9-CM787.91, 009.2 Dezie
ICPC 2 IDD11 Dezie
NCI Thesaurus IDC2987 Dezie
Afọ ọsịsa
Nhazi na ihe ndị enwetara n’ime
Ọsịse elektrọn nke rotavirus, ihe na ebute ruo 40% nke ọgwụgwọ ọrịa nke afọ ọsịsa n’ụmụaka ndị na erubeghị afọ ise.[1]
ICD-10A09, K59.1
ICD-9787.91
DiseasesDB3742
MedlinePlus003126
MeSHD003967

Afọ ọsịsa bụ ọnọdụ nke ịnwe usoro eriri afọ na esighi ike ma ọ bụ gbara mmiri opekata mpe ugboro 3 kwa ụbọchị. Ọ na anọkarị ụbọchị ole ma ole, ọ nwere ike ịdapụta na ahụ ịta mmiri n’ihi mmiri na apụ. Ihe nrịbama nke ahụ ịta mmiri na ebidokarị na ọpụpụ nke ndọtị anụahụ yana mgbanwe na omume. Nke a nwere ike ịbanye na mamịrị gbadara, ọpụpụ nke agba anụahụ, obi na akụ ọsọ ọsọ, yana mgbada na nzaghachi ka ọ na akawanye njọ. Nsi na esighi ike mana na adịghị mmiri mmiri n’ụmụ ntakịrị ndị a na enye ara nne, agbanyeghị, ọ nwere ike ịdị mma.[2]

Ihe na ebutekarị ọrịa nke mgbiri afọ bụ nje, ahụhụ na ebu ọrịa, alị, ma ọ bụ ọnọdụ akpọrọ afọ okuku. A na enwetakarị ọrịa ndị a site na nri ma ọ bụ mmiri metọrọ emetọ na nsị, ma ọ bụ site ozugbo n’aka onye ọzọ nwere ọrịa ahụ. Enwere ike ịkewa ya n’ụzọ atọ: afọ ọsịsa nsị mmiri mmiri na anọ obere oge, afọ ọsịsa nsị ọbara na anọ obere oge, yana ọ bụrụ na ọ gafee izu abụọ, afọ ọsịsa jụrụ ọgwụgwọ. Afọ ọsịsa nsị mmiri ahụ na anọ obere oge nwere ike ịbụ n’ihi ọrịa nke otoro. Ọ bụrụ na ọbara dị na ya a na akpọkwa ya afọ ọbara.[2] Imirikiti ihe na adịghị efe efe nwekwara ike ịdapụta na afọ ọsịsa gụnyere: hyperthyroidism, ojuju lactose, ọrịa eriri afọ koro eko, mkpokọta nke ọgwụgwọ, yana nzipụta eriri afọ na agbakasị ahụ yana ihe ndị ọzọ.[3] N’ọtụtụ oge anaghị achọ ọchichọ nje na nsị iji mara ihe butere ya kpọmkwem.[4]

Mgbochi nke afọ ọsịsa na efe efe bụ site na nzacha na mkpocha emelitere, mmiri ọnụnọ dị ọcha, yana ịsacha aka. Ịnye ara ihe dị ka ọnwa isii ka akwadoro dị ka ọ bụ ịgba ọgwụ mgbochi maka rotavirus. Mkpokọta ntighachi mmiri n’ahụ (ORS), nke bụ mmiri dị ọcha nwere nnu na suga ziri ezi, bụ ọgwụgwọ nke ahọpụtara. Akwadokwara Mkpụrụ ọgwụ Zinc.[2] Ekpebiri na ọgwụgwọ ndị a azọpụtala ọnụọgụ nde 50 ụmụaka n’ime afọ 25 gara aga. [1] Mgbe ndị mmadụ nwere afọ ọsịsa, akwadoro na ha gara n’ihu na eri nri dị mma, ụmụ ọhụrụ gaa n’ihu na anụ mmiri ara.[2] Ọ bụrụ na ORS azụmahịa adịghị, enwere ike iji mmiri emere n’ụlọ.[5] Maka ndị nwere nnukwu ahụ ịta mmiri, enwere ike ịchọ mmiri nkwunye.[2] Imirikiti oge; agbanyeghị, enwere ike ijikwa ya nke ọma yana mmiri site na ọnụ.[6] Ọgwụ mgbochi, anaghị ejikarị ya, enwere ike ịkwado ya n’ebe ụfọdụ dị ka ndị nwere afọ ọsịsa nsị ọbara yana ahụ ọkụ, ndị nwere afọ ọsịsa sotere njem, yana ndị na amụba ahụhụ ma ọ bụ alị akọwapụtara na nsị ha.[4] Loperamide nwere ike ịnyere aka belata ọnụọgụ nke ọgụga eriri afọ mana akwadoghi ya maka ndị nwere nnukwu ọrịa.[4]

Ihe dị ka nsogbu ijeri 1.7 ruo 5 nke afọ ọsịsa na eme kwa afọ.[2][3] Ọ kachasị eme na obodo ndị na etolite etolite, ebe ụmụaka na eto eto na enweta afọ ọsịsa na ọkara ugboro atọ kwa afọ.[2] N’ụwa gburugburu, ebe 2012, ọ bụ ihe nke abụọ kachasị ebute ọnwụ n’ebe ụmụaka nọ na erughi afọ ise (ọnụọgụ 0.76 ma ọ bụ 11%).[2][7] Ọtụtụ mmemme nke afọ ọsịsa bụkwa ihe na ebutekarị kwashiokor yana ihe kachasị ebute ya n’ebe ndị na erubeghi afọ ise nọ.[2] Nsogbu ndị ọzọ na atọke aka nwere ike ịdapụta gụnyere ntolite anụahụ na ụbụrụ isi na adịghị mma.[7]

Nrụtụ aka[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 whqlibdoc.who.int (PDF). World Health Organization.
  2. 2.0 2.1 2.2 2.3 2.4 2.5 2.6 2.7 2.8 Diarrhoeal disease Fact sheet N°330 (April 2013). Retrieved on 18 June 2014.
  3. 3.0 3.1 (2013) Anesthesia for otolaryngologic surgery. Cambridge: Cambridge University Press, 282–287. ISBN 1107018676. 
  4. 4.0 4.1 4.2 (Apr 17, 2014) "Acute infectious diarrhea in immunocompetent adults.". The New England journal of medicine 370 (16): 1532–40. DOI:10.1056/nejmra1301069. PMID 24738670. 
  5. (2012) Principles and practice of pediatric infectious diseases, 4th, Edinburgh: Elsevier Saunders. ISBN 9781455739851. 
  6. Nation’s Emergency Physicians Announce List of Test and Procedures to Question as Part of Choosing Wisely Campaign. Retrieved on 18 June 2014.
  7. 7.0 7.1 Global Diarrhea Burden (January 24, 2013). Retrieved on 18 June 2014.

Okwu okwu[dezie | dezie ebe o si]

Okwu afọ ọsịsa sitere na Grik oge ochie διάρροια site na διά dia</link> "saịtị" na ῥέω rheo</link> "efere".

Ọsịsa bụ mkpoputa n'asụsụ bekee America, ebe afọ ọsịsa bụ mkpoputa na bekee .

Okwu ọjọọ maka ọnọdụ ahụ gụnyere "ndị na-agba ọsọ", "ndị squirts" (ma ọ bụ "squits" na Briitain [1] ) na "trots". [2]

Mmetụta ahụike[dezie | dezie ebe o si]

Ọrịa afọ ọsịsa nwèrè íke ịnwe mmetụta na-adịghị mmá ná ahụike aṅụ áhụ ná ụtọ uche. "Nwatakịrị na-adịghị edozi ahụ nkè sitere ná ìhè ọ bụla na-ebelata ahụike anụ ahụ ná ịrụ ọrụ n'ime ndị okenye, " [3] ná afọ ọsịsa bụ ịsị ihe na-akpata nsogbụ ndị na-edozi ahụ n'oge ọ bụ Nwatakịrị. [4] [5], ihe akaebe na-egosi na ọrịa afọ ọsịsa nwere mmetụta dị ukwuu na mmepe uche na ahụike; egosila na, ọbụlagodi mgbe a na-achịkwa ọrịa helminth na inye ara n'oge, ụmụaka nwere afọ ọsị aka siri ike nwere akara dị ala na usoro nyocha ọgụgụ isi. [3] [2]

Ọsịsa nwere ike ịkpata electrolyte imbalances, kidney impaired, dehydration, na defective immune system responses. Mgbè á na-enye ọgwụ, arụmọrụ nkè ọgwụ áhụ bụ ịmepụta mmetụta ọgwụgwọ na enwéghị mmetụta a nwèrè ike ịbụ n'ihi ná ọgwụ áhụ na-aga ngwá ngwá site ná usoro mgbárí nri, na-ebelata ógè enwere ike ịmị yá. Ndị dọkịta na-anwa ịgwọ afọ ọsịsa site n'ibelata ọgwụ, ịgbanwe usoro ọgwụ, ịkwụsị ọgwụ ahụ, na rehydration. Ntinye áká na Njikwa afọ ọsịsa anaghị arụ ọrụ mgbè nílé. Ọsịsa nwèrè íke ịnwe mmetụta dị ukwuu ná ndụ n'ihi ná enwéghị ike ịṅụ mmịrị bụ otú n'ime ihe ndị na-eduga n'itinye ndị okenye n'ụlọ nlekọta ogologo ógè (ụlọ ndị agadi). [6]

  1. Àtụ:Wiktionary-inline
  2. Àtụ:Wiktionary-inline
  3. 3.0 3.1 Disease Control Priorities Project. Public Health Significance of Diarrheal Illnesses. The World Bank Group. Archived from the original on 25 January 2014. Retrieved on 12 October 2013.
  4. (July 1992) "Diarrhea as a cause and an effect of malnutrition: diarrhea prevents catch-up growth and malnutrition increases diarrhea frequency and duration". The American Journal of Tropical Medicine and Hygiene 47 (1 Pt 2): 28–35. DOI:10.4269/ajtmh.1992.47.28. PMID 1632474. 
  5. (February 2000) "Nutritional deficiencies and later behavioural development". The Proceedings of the Nutrition Society 59 (1): 47–54. DOI:10.1017/S0029665100000069. PMID 10828173. Grantham-McGregor SM, Walker SP, Chang S (February 2000). "Nutritional deficiencies and later behavioural development". The Proceedings of the Nutrition Society. 59 (1): 47–54. doi:10.1017/S0029665100000069. PMID 10828173.
  6. (December 2015) "Drug-induced secretory diarrhea: A role for CFTR". Pharmacological Research 102: 107–112. DOI:10.1016/j.phrs.2015.08.024. PMID 26429773.