Jump to content

Agụmanụmanụ

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
animal diversity

Agụmanụmanụ bụ ótù ngalaba n'ime agụmandụ nke na-amụta Ọha umuanụmanụ nke gụnyere ndokọ, agụmaembryo, evolution, nhazikọrịta, omume na nkesa umuanụmanụ, ma ndị d ndụ na nd nwuchapụ, nakwa etu ha na gburugburu si emekọrịta.

Akụkọàlà

[dezie | dezie ebe o si]

Site oge ochie ga Darwin

[dezie | dezie ebe o si]
Konrad Gesner (1516–1565).Akwụkwọ ya bụ Historiae animalium bụ nke a tụlere dka mbido agụmanụmanụ nke ọhụrụ

Akụkọàlà nke agụmanụmanụ na-esoro amụmamụ Ọha umuanụmanụ site n'oge ochie ga n'oge nkeugbua. N'agbayengh na echiche agụmanụmanụ tolitesa dka ótù mpaghara n'ime sayensị, nd sayens nke agụmanụmanụ wapụta site n'akụkọàlà nkeọnatarachi nke jikọtara nd ọrụ agụmandụ nke Aristotle na Galen n'Ụwa Greek-Rome. Ọrụ ochie nke a gabgara oké nghọlite n'ime nd Oge Etiti site n'aka nd diba n'ọkàkwụkwọ Muslim dka Albertus Magnus. Na Mgbe Renaissance nakwa oge ugbua nke gboo, echiche agụmanụmanụ ghọlitezie íké na Yurop maka mmeghata mmasi nime empirisism na nchọpụta ọtụtụ nd-organism ọhụrụ. Ndị ama ama n'ime oké nghọlite a bụ Vesalius na William Harvey, onye jiri nnwale na nleruanya nwanyọ n'ime agụmaọrụeke nakwa nd agụmaọnatarachi nke gụnyere Karl Linnaeus, Jean-Bapiste Lamarck na Buffon, onye bidoro hazikọta diversiti nke ndụ nakwa ndekọ fossil, yana nghọlite na mkparamàgwà ndịorganism. Mikroskopi kpughere ụwa nke ndị mikrorganism, nakwa debere ntọala maka Nkọwa Mkpụrụndụ. Ntolite mkpà gbanyere agụmachukwu nkeọnatarachi na Ihụnanyamamihe nke-mechanikal, gbara ume ntolite akụkọàlà-ọnatarachi( n'agbanyeghị na ọ sụnyezie n'ime esemokwu nke sina mmewe)

N'ime narịáfọ̀ nke 18, nke 19, na nke 20, agụmanụmanụ ghọnyezie n'usoro ọzụzụ sayensị nke na-abalite. Ndị nnyocha na ndị agụmaọnatarachi dịka Alexander von Humbodlt lebara ányá n'ime mmekọrịta dị n'etiti ndịorganism na gburugburu ha, n' ụzọ mmekọrịta a dabere n'esereseanị, nke debere ntọala maka esereseanịndụ, agụmagburugburu n'agụmàgwànụmanụ. Ndị agụmaọnatarachi bidoro ịjụlụ essentialism na tụlere mkpa nke nwụchapụ na mgbanwe ndị speshie. Nkọwa mkpụrụndụ butere nsirihụ ọhụrụ n'ebe ntọala nke ndụ nọ.

Oge Mmesịa-Darwin

[dezie | dezie ebe o si]

Ihe nghọlite ndị a, nakwa mpụta site na agụmaembryo na agụmandụochie, bụ nke asynthesizie n'ime nkọwa Charles Darwin gbasara evolutiọn sina nhọrọ nke-eke. N'áfọ̀ 1859, Darwin tinyere nkọwa nke organik evolutiọn n'ime ntọala ọhụrụ, site na nchọpụta ya gbanyere ótù usoro organik evolutiọn sina dapụta, ma nyekwa íhé akaebe nke gosiri n'otu ọ si eme ya.

Darwin nyere ntụziaka ọhụrụ banyere agụmamgbanwe n'agụmaọrụeke, site na ijikọrọ ha n'ótù nkọwa nkeagụmandụ : nkọwa nke organik evolutiọn. Mpụta ya bụ iwubegharị nhazikọrịta nke ndị anụmanụ n'usoro agụmagbọezinaụlọ, nyocha ọhụụ gbasara nghọlite ndịanụmanụ, na mgbalị mbụ iji chọpụta njikọ nke genetiks ha. Na nkwụsi narịáfọ̀ nke 19 a hụrụ ọdịda nke Ọmumu Spontaneous na nkunite nkọwa ọrịa sina njé, mana mechanism gbasara nketa ka dị omimi . Na mmalite narịáfọ̀ nke 20, nchọpụtagharị ndị ọrụ Mendel dunyerezie nghọlite ngwá-ngwá n'ime genetiks, na site na ndị áfọ̀ 1930 ntikota genetiks ọnụọgụgụ na nhọrọ nke-eke n'oge ugbua kere agụmandụ nke-evolutiọn.

Nchọcha

[dezie | dezie ebe o si]

Nke-Ndokọ

[dezie | dezie ebe o si]

Agụmandụ mkpụrụndụ na-egụrụ gbanyere ndị onwunwe nke-ndokọ n'agụmaọrụeke ndị mkpụrụndụ,ha gụnyere omume ha, mmekọrịta na gburugburu. Ha na-eme ihe a n'ogo mikroskopi na molekul, maka ndị ótù-mkpụrụndụ organism dịka bakteria nakwa ndị-mkpụrụndụ nkeọkàchamara nọ n'ime ndị ọtụtụ-mkpụrụndụ organism dịka ndị mmadụ. Ịghọta ndokọ nakwa ọrụ ndị mkpụrụndụ dị mkpa maka ndị sayensị nke-agụmandụ niile. Myiri na ọdịiche n'etiti ndị ụdị mkpụrụndụ dị iche iche dị mkpa ọkachasi n'agụmandụ nkemolekul.

Agụmahụ na-atụlere ndị ụdị ndokọ nke-mikroskopi dị iche iche dịka ndị organ na ndị usoro organ. Ọ na-elekwasiri ányá n'otu ndị organ na ndị usoro organ si na-erụkọrịta n'ime ahụ ndị anụmanụ na mmadụ, na gbakwunyerezie otu ha si arụ ọrụ n'onwe ha. Agụmahụ na agụmandụ nke-mkpụrụndụ bụ amụmamụ abụọ dịkwa nso nakwa inwere íké hazikọta ha n'ótù amụmamụ nke-ndokọ.

Nke-Agụmaọrụeke

[dezie | dezie ebe o si]
Eserese si n’aka Handbuch der Anatomie der Tiere für Künstler .

Agụmaọrụeke na-egụrụ gbanyere usoro nke-mechanik, ahụnìhè na biochemikal dị n'ahụ ndị organism dị ndụ. Ọ bụ amụmamụ na-elekwasiri ányá n'otu ndị ndokọ n'ahụ si na-erụkọrịta dịka ótù íhé. Isiokwu nke 'ndokọ ịrụ ọrụ' dị isi sekpụnti n'agụmandụ. Amụmamụ nke-agụmaọrụeke bụ íhé a kewara n'ime agụmaọrụeke umuakụmakụ n'agụmaọrụeke umuanụmanụ, mana ụfọdụ ụkpụrụ nke agụmaọrụeke dị nkezuruọha, n'agbanyeghị ụdị organism ha na-egụrụ gbanyere. Ọmumaatu bụ íhé a na-amụta gbanyere agụmaọrụeke nke ndị mkpụrụndụ yeast nweíké bụ íhé ntinye ga ndị mkpụrụndụ mmadụ. Mpaghara nke agụmaọrụeke umuanụmanụ gbasara ndị ngwaọrụ na usoro nke agụmaọrụeke ndị mmadụ na ndị speshie abụghị-mmadụ. Agụmaọrụeke na-egụrụ otu a dịka ọmumatu, usoro nerve, immune, endokrine, nkuume na mgbarubegharị-ọbara si na-erụ ọrụ na mekọrịta.

Nke-Evolution

[dezie | dezie ebe o si]

Nchọcha nke-evolutiọn na-elekwasiri ányá n'ísí mmalite na mgbada ndị speshie, yana mgbanwe ha n'oge gafesịa, ma gụnyere ndị ọkàmmụta sayensị nke site n'ọtụtụ agụmakwụkwọ gbasara nhazikọrịta umuorganism. Dịka ọmumaatu, n'izugbe ọ gụnyere ndị sayensị niile nwere ọzụzụ pụrụ iche n'ótù agụmakwụkwọ dịka agụmamammal, agụmannunu, agụmaherpeton, maọbụ agụmahụhụ, mana na-eji ndị organism ahụ dịka usoro iji aza ajụjụ niile gbasara evolutiọn.

Agụmandụ nke-evolutiọn bụ nke sitere na agụmandụochie, nke na-eji ndekọ fossil na-aza ajụjụ banyere ụdị na ọsọ evolutiọn, nakwa n'obere na nghọlite n'ime ndị mpaghara dịka genetiks nke-ọnụọgụgụ. Site na nghọlite n'usoro mbịba-mkpịsịaka DNA n'ime ngwụcha narịáfọ̀ nke 20, ntinye n'ọrụ usoro ndị a n'ime agụmanụmanụ amụbawanyere nghọta nke ọnụọgụgụ ụmụanụmanụ. Na ndị áfọ̀ nke 1980, agụmandụ nke-nghọlite abanyerezie agụmandụ nke-evolutiọn site na mwepubụ ya puọ synthesis nkeugbua nke soro n'amụmamụ agụmandụ nke-nghọlite nke-evolutiọn. Amụmamụ ndị ọzọ atụlere dịka ágba agụmandụ nke-evolutiọn bụ phylogenetiks, systematiks, na taxonomy.

Nhazikọrịta

[dezie | dezie ebe o si]

Nhazikọrịta nke-sayensị n'agụmanụmanụ, bụ usoro nke ndị agụmanụmanụ chikọtara na hazikọta ndị organism n'ime ótú nke-agụmandụ, dịka genus maọbụ speshie. Nhazikọrịta nke-agụmandụ bụ ụdị taxonomy nke-sayensị. Nhazikọrịta nke-agụmandụ nke-ugbua nwere mgbọr gw ya ọrụ Karl Linnaeus, onye chikotara ndị speshie n'usoro agwara ah ha. Nchikota ndị a agabịgago ntụlegharị maka imeziwanye ka ọ rube ísí n'ebe ụkpụrụ Darwin maka ótù mgbada . Phylogenetiks nke-molekul, na-eji nsoje DNA dịka data, achụpụla ọtụtụ ntụlegharị n'oge na-adịbeghị ányá ma ọ ga-aga n'ihu na-eme ya. Nhazikọrịta nke-agụmandụ diri sayensi gbasara systematiks nke-anụmanụ.

Tebụl Linnaeus nke alaeze umuanụmanụ site na mbipụta mbụ nke Systema Naturae (1735).

Ọtụtụ ndị ọkàmmụta sayensị na-atụle ugbua na usoro alaeze ise bu nke ochie. Usoro nhazi ọzọ nke oge a na-ebido site n'usoro ngalaba atọ : Archaea (nke nsinambụ ya bụ Archaebakteria); Bakteria (nke nsinambụ ya bụ Eubakteria); Eukaryota (gụnyere protist, fungi, umuakụmakụ na ụmụanụmanụ ). Ngalaba ndị a na-egosipụta ma ndị mkpụrụndụ nwere nuklei maọbụ na ha enweghị ya, yana ọdịiche na nyakọrịta nke-kemịkal nọ na mpụga mkpụrụndụ

Ọzọkwa, alaeze nke ọbụla na-agbawadata ugboro ugboro ruo mgbe ahazikota ndị speshie n'ótù-ótù. Nsoro bụ: Ngalaba ; alaeze ; phylum ; klaasị ; nsoro ; ezinaụlọ ; genus ; speshie. A na-enweta aha sayensị nke ndị organism sitere na genus na speshie ya. Dịka ọmụmaatụ, edepụtara ndị mmadụ dịka Homo sapiens. Homo bụ aha genus na sapiens bụ aha speshie, ha abụọ jikọtara n'ọnụ imepụta aha ahu. Mgbe ị na-ede aha sayensị nke organism, ọ di mmá imebulite mkpụrụabidii nke-mbụ n'aha genus ma meobere mkpụrụabidii niile na-ekọwapụtara. Na mgbakwunye, enwere íké ịkọwa ya n'usoro italik maọ bụrụ nke-ahịrị n'okpuru.

Usoro nhazikọrịta nke-nchikota bụ Linnaean taxonomy. Ọ gụnyere ogo na binomial nomenklature. Nhazikọrịta, taxonomy, na mbamaha nke ndị organism nke-agụmanụmanụ bụ nke Nsoro Mbamaha Agụmanụmanụ nkeNzuruụwa na-achịkwata. E biputara mbipụta njikọ, BioCode na 1997 iji nwetakwu iguzorosíké mbamaha, mana a kabatabeghị ya.

Agụmàgwànụmanụ

[dezie | dezie ebe o si]
Umu Kelp gull na-emetụ na ntụpọ uhie nọ n'ọnụ nne ya maka ịkpalite meghachi ịgbọ agbọ

Agụmàgwànụmanụ bụ amụmamụ nke sayensi na nke akpaghị ókè banyere omume umuanumanu n’okpuru onodu eke, ọ megidere agụmakparamàgwà, nke gbadoro ányá n'amụmamụ nzaghachi nke-àgwà n'ime mwube laboratory. Ndị agụmàgwànụmanụ na-elekwasiri ányá tụmadị n'evolutiọn nke akparamàgwà na nghota akparamàgwà n'aha gbanyere echiche nhọrọ nke-eke . N'ótù uche, onye agụmàgwànụmanụ nke mbụ n'oge ugbua bụ Charles Darwin, onye akwụkwọ ya, The Expression of the Emotions in Man and Animals, metụtara otụtụ ndị agụmàgwànụmanụ n'ọdịnihu

Esereseanịndụ

[dezie | dezie ebe o si]

Esereseanịndụ na-egụrụ gbanyere nkesawa ndi organism n'ụwa, na-elekwasiri ányá n'isiokwu dịka ndị tektonik plate, mgbanwe ụdidiụbọchị, mgbasa, njegharị na nke-kladistik. Okike maka amụmamụ a dị íhé ejiàmà Alfred Russel Wallace, onye agụmandụ nkeBriten, ya na Charles Darwin depụsara ụfọdụ ndị orụ ha n'ótù

Ndị alaka nke agụmanụmanụ

[dezie | dezie ebe o si]

N’agbanyeghị n'amụmamụ gbanyere ndụ umuanụmanụ dị ochie, mpụtanìhè ya ugbua dị ọhụrụ. Ihe a na-egosi ngafe site n'akụkọàlà nke-eke ga agụmandụ na mbido nke narịáfọ̀ nke 19. Kemgbe Hunter na Kuvier, agụmandụ nkentụnyere nwere njikọnyelu eseresemgbanwe n'umuanụmanụ, na-akpụpụ ndị mpaghara agụmakwụkwọ n'oge ugbua dịka agụmahụ, agụmaorụeke, agụmatissue, agụmateraton n'agụmàgwànụmanụ. Agụmanụmanụ nkeugbua tolite na mbụ n'ime ndị mahadum Germani na Briten, Na Briten, Thomas Henry Huxley, bụ onye atakakpo. Echiche ya bụ maka agụmamgbanwe n'umuanụmanụ. Imilikiti tụlere ya dịka onye nkachasi n'agụmahụ nkentụnyere n'okara nkeikpeazụ na narịáfọ̀ nke 19. Na myiri Hunter, nkuzi ya gụnyere íhé nkuzi na nkuzi omeme nke laboratory, nke megidere adịmadị gara-aga nke gbasara íhé nkuzi naanị

Nwanyo nwanyo agụmanụmanụ gbasa n'ofé agụmahụ nkentụnyere nkeHuxley egụnyere ndị na-esonụ n'okpuru ọzụzụ ahu:

  • Esereseanụmanụ, nke a makwaara dịka Esereseanụmanụ nke-nkọwa, bụ sayensị nke na-akọwa gbasara umuanụmanụ na ebe obibi ha
  • Agụmahụ nketụnyere, gbasara ndokọ umuanụmanụ
  • Agụmaọrụeke Umuanụmanụ
  • Agụmagbugburu nkemkparamàgwà
  • Agụmàgwànụmanụ na-egụrụ àgwà ụmụanụmanụ
  • Agụmanụmanụ Ndị enweghị-vertebrate
  • Agụmanụmanụ Ndị vertebrate
  • Agụmanụmanụ Ana
  • Ndị agụmakwụkwọ gbasara nhazikọrịta umuorganism dịka agụmamammal, agụmammadụ, agụmaherpeton, agụmannunu, agụmazụ̀, nakwa agụmahụhụ na-ehụgosi na hazikọta ndị speshie nakwa ịgụrụ ndị ndokọ na mechanism nke diri ndị ótú.

Ndị agụmakwụkwọ dị nso:

  • Agụmandụ nke-evolutiọn: A na-atụle nghọlite nke umuanụmanụ n'umuakụmakụ na ederede banyere evolutiọn, genetiks ọnụọgụgụ, nketa, mgbanwe dị iche iche, Mendelism nakwa mmeputakwa .
  • Agụmandụ nkeMolekul na-amụta ndị genetik mechanism nke-nghọlite dị nkịtị n'ime umuanụmanụ n'umuakụmakụ
  • Agụmandụochie : amụmamụ banyere ndị ụdị ndụ nke nwụchapụ.
  • Systematiks, kladistiks, phylogenetiks, esereseanịakụmakụ, esereseanịndụ, nakwa taxonomy hazikọ na chikọta ndị speshie sitena n'ótù mgbada na mkpakọrịta nke-mpaghara .

Ebensibịa

[dezie | dezie ebe o si]

Agụmanụmanụ site na Wikipidia Inglish.