Agadzagadza
Agadzagadza bụ ihe aghụghọ sitere na akụkọ ifo nke ndị Bura, otu n'ime ndị bi na Naịjirịa.[1][2][3] Ọ bụ agụ owuru agama ma na-apụta dị ka akụkụ nke nkọwa nke aetiological maka mmalite nke ọnwụ na ọdịbendị ha.[4]
Akụkọ ifo nke Agadzagadza
[dezie | dezie ebe o si]N'akụkọ ifo ahụ, ndị Bura enweghị echiche nke iru uju, ọrịa ma ọ bụ ọnwụ.[5] N'ihi nke a, mgbe nwoke mechara daa ọrịa ma nwụọ, ndị mmadụ ga-ekpebi ihe merenụ na ihe ha kwesịrị ime ya. E kpebiri na ha ga-eziga onye ozi nye Chineke Eluigwe maka enyemaka. Dị ka onye ozi, ha họọrọ ikpuru.[1][6][7]
Mgbe ikpuru ahụ zutere chi eluigwe, o kwuru, sị: "Otu nwoke anwụọla, ha zitekwara m ịjụ gị ihe ha kwesịrị ime ya".[8] Chi eluigwe nyere ya ntụziaka ndị a: "Gaa gwa ha ka ha were ozu ahụ, kobe ya n'osisi ma tụba ya ụrọ ruo mgbe ọ laghachiri na ndụ. Mgbe ọ laghachiri na ndụ, ọ dịghị onye ọzọ ga-anwụ. "[1][6][7][8] Ikpuru ahụ malitere njem laghachi na ndị Bura iji nye ntụziaka.
Nnabata nke onye nghọgbu
[dezie | dezie ebe o si]N'amaghị ama nke ikpuru ahụ, ihe ọzọ e kere eke (agadzagadza lizard) anọwo na-ege ntị na mkparịta ụka dị n'etiti ikpere na chi eluigwe.[7][1][8] Dị ka onye aghụghọ, ngwèrè ahụ chọrọ ịmepụta ọgba aghara, na n'ihi na ọ bụ ngwèrè, o nwere ike ịga njem ngwa ngwa karịa ikpuru ahụ.[1][6][8]
Agadzagadza buru ụzọ rute ndị mmadụ.[7] Ọ gwara ha na chi eluigwe zitere ya kama ikpuru, n'ihi na ọ bụ ihe e kere eke kacha agasi ike.[1] Agadzagadza gwara ha na ụzọ ziri ezi isi dozie ọnọdụ ahụ bụ "igwu ili, fụchie ozu ahụ na ákwà, ma lie ya n'ili", nke bụ ụgha.[1][6][7]
Nlaghachi nke ikpùrù
[dezie | dezie ebe o si]Ikpuru ahụ, n'amaghị ihe niile merenụ, mechara jiri ntụziaka ya bịa.[1][7] Mgbe ndị mmadụ ghọtara na a ghọgburu ha, ndị ahụ were iwe n'ihi ikpuru ahụ maka ije nwayọ, ma taa ya ụta maka eziokwu ahụ bụ na ha emeela ọnọdụ ahụ n"ụzọ na-ezighi ezi. Ikpuru ahụ megidere ya na ndị mmadụ zitere ya n'ọrụ ahụ, mana n"enweghị ndidi họọrọ ige ntị na ndụmọdụ nke ihe ọzọ e kere eke. Ikpuru ahụ kwuru na n'ihi aghụghọ ahụ, ndị mmadụ kwesịrị iwepụ nwoke ahụ n"ili, ma gakwuru chi eluigwe ọzọ maka ndụmọdụ.[1] Ndị mmadụ achọghị itinye mgbalị ọ bụla ọzọ iji wepụta ozu nwoke ahụ n'ala. ma họrọ ịghara ịchụso okwu ahụ.[1][7][9][10]
Mmetụta o nwere na mmadụ
[dezie | dezie ebe o si]Ọ bụụrụrụ na-agbasoro ntuziaka Chi igwe n'ahụ nwoke ahụ, mmadụ akaraghị ahụ ọnwụ ọzọ, ma ndị mmadụ n'ihi nnupu isi leghaara anya imezi mmejọ ha ọnwụ ga-abụ ihe nketa ha ebeebe.[1][6][7]
Edemsibịa
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ 1.00 1.01 1.02 1.03 1.04 1.05 1.06 1.07 1.08 1.09 1.10 Crump (2015). Eye of Newt and Toe of Frog, Adder's Fork and Lizard's Leg. University of Chicago Press. ISBN 9780226116006. Kpọpụta njehie: Invalid
<ref>
tag; name ":1" defined multiple times with different content - ↑ Mshelia (2014). The story of the origins of the Bura/Pabir people of Northeast Nigeria : language, migrations, the myth of Yamta-ra-wala, social organization and culture. Bloomington, IN: Authorhouse. ISBN 978-1-4969-0432-4.
- ↑ Scheub (2005). African tales. University of Wisconsin Press. ISBN 9780299209438.
- ↑ Blench. A Dictionary of Bura.
- ↑ Helser, M.A., F.R.G.S. (1930). African Stories. New York, Chicago, London and Edinburgh: Fleming H. Revell Company.
- ↑ 6.0 6.1 6.2 6.3 6.4 Thury, Eva M. (2005). Introduction to mythology : contemporary approaches to classical and world myths, Devinney, Margaret Klopfle, 1941-, Fourth. ISBN 9780190262983. OCLC 946109909. Kpọpụta njehie: Invalid
<ref>
tag; name ":0" defined multiple times with different content - ↑ 7.0 7.1 7.2 7.3 7.4 7.5 7.6 7.7 Hyel and the Corpse in the Tree (Bura, Pabir/Nigeria) in A Dictionary of African Mythology. Oxford Reference. Oxford University Press. Kpọpụta njehie: Invalid
<ref>
tag; name "Hyel" defined multiple times with different content - ↑ 8.0 8.1 8.2 8.3 Scheub (1990). The African Storyteller: Stories from African Oral Traditions, Revised, Kendall/Hunt Publishing Company, 53–55. ISBN 9780840360373. Retrieved on 26 August 2019. Kpọpụta njehie: Invalid
<ref>
tag; name "Scheub2" defined multiple times with different content - ↑ Cotterell, Auerbach (2004). Encyclopédie de la mythologie. Parragon. ISBN 1405422351. “"...les hommes ne déterrent pas le cadavre"”
- ↑ Takruri, Akan (12 February 2017). 100 African religions before slavery & colonization. ISBN 978-1365752452. OCLC 973086143.