Aganju

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

  

Aganju
water deity
ụdịekerenwoke Dezie
okpukpere chi/echiche ụwaYoruba religion Dezie

Aganju (nke a maara dịka Agayú, Aggayu, Ajanjú maọbụ Aganyú na mpaghara ndị na-asụ Spanish) bụ onye Orisha. A na-ejikọta ya na Saint Christopher na okpukpe Cuban a maara dịka Santería. N'asụsụ Yoruba, aginjù (ọ bụghị Aganjú) pụtara ọzara, ebe obibi na-adịghị mma maọụ ebe a na-apụghị ịbanye.

Aganju nwere njikọ chiri anya na Shango. N'omenala ụfọdụ, a na-akọwa Aganju dị ka nna Shango; n'ọdịnala ndị ọzọ, akọwapụtara ya dịKa nwanne Shangoo. Ma Shango ma Aganju bụ, n'otu oge, ndị ọchịchị nke alaeze ukwu Oyo bụ ndị ghọrọ chi.

Okpukperechi Yoruba[dezie | dezie ebe o si]

N'ógbè Yoruba nke Naijiria na Benin Republic, a maara Aganju dịka eze dike a na-eme ka ọ bụrụ chi site n'obodo Shaki nke dị na steeti Oyo nke Nigeria ugbu a. A na-ekwu na ọ na-eji mma agha aga ije ma na-asịkwa na ọ na-alụ ọgụ site n'ịgba ọkụ, n-adịghị ka Sango onye na-iji égbè ígwé na àmụ̀mà alụ ọgụ. Shaki dị na mpaghara savannah nke ugwu Yorubaland nke nwere monoliths na nkume.

Santería (Lucumí/Regla de Ocha)[dezie | dezie ebe o si]

Na Cuba, Aganju bụ chi ugwu mgbawa maka ndị na-eme okpukpe Santeria / Lucumi. Mana enweghi ugwu mgbawa na Cuba maọbụ Yorubaland, ma Aganju ejikọghị ya na ugwu ọkụ n'etiti ndị Yoruba. Otú ọ dị, Biu Plateau nke dị n'ebe ugwu ọwụwa anyanwụ Naijiria nwere ọtụtụ ugwu mgbawa. Biu Plateau dị ihe dịka kilomita 580 (360 miles) site na Abuja, isi obodo Naijiria na ihe dịka 720 (450 mi) sitere na Oyo, Naịjirịa. Ugwu ndị a na-agbọpụta ọkụ adịla kemgbe ma ha dịkwa anya na Yorùbáland n'ụzọ ala. O yikarịrị ka njikọ nke Aganjú na ugwu mgbawa na Cuba abụghị nke okenye karịa narị afọ gara aga n'etiti ndị Creole. Nke a bụ n'ihi na Aganjú na-eche na ya na Oroíña nke okwukwe Cuban Orisa (Ọ̀rànmíyàn na asụsụ Yorùbá).

Candomblé[dezie | dezie ebe o si]

N'ọdịnala Afro-Brazilian nke Candomblé, a na-efe Aganjú ofufe dịka ngosipụta maọbụ àgwà nke Orisha Shango, nke a-akpọkarị Xango Ajanjú. Aganjú na-anọchite anya ihe niile na - na na: A na-akpọkwa ya aha ótútú "Xangô menino" n'etiti ndị ọrụ Candomblé.

Ihe ọgụgụ ndị ọzọ[dezie | dezie ebe o si]

  • Jo Anna Hunter Ìyánifá Ọmó̩tinú__ilo____ilo__, njem m gaa Aganjú: The Orisa so Hard to Find ̆ BlackMadonnaEnterprises.com and Oro Pataki Ajanju: A Cross Cultural Approach Towards the Understanding of the Fundamentos of Orita Agarju in Nigeria and Cuba, In Orira Yoruba God and Spiritual Identity in Africa and the Diaspora, nke Toyin Falola, Ann Genova dezigharịrị. New Jersey: Africa World Press, Inc.