Agulu

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Agulu
human settlement, tourist attraction, lake
Asụsụ obodoAsụ̀sụ̀ Ìgbò Dezie
asụsụ njiemeAsụ̀sụ̀ Ìgbò Dezie
mba/obodoNaijiria Dezie
dị na ngalaba nhazi mpagharaAnambra Steeti Dezie
dị na mpaghara ogeUTC+01:00 Dezie
nhazi ọnọdụ6°7′0″N 7°4′0″E Dezie
Map
Agulu Lake 2

Agulu bụ nnukwu obodo na steeti Anambra, Naijiria . Ọ dị n'okpuru ọchịchị Anaocha . Ọ bụ ebe ọdọ mmiri Agulu. Ndị Agụlu gụnyere Gọvanọ Anambra Steeti gara aga Peter Obi, Senator Joy Emodi, Dora Akunyili bu onyeisi NAFDAC na mgbe gara-aga, Ifeanyi Eric okoye CEO Juhel pharmaceuticals, onye na-eme egwu, HE Amb. Justin Okechukwu Kingland (DRM), Founder Face Of Agulu, Anambra State. A makwa Agulu maka ebe mbuze nke Agulu-Nanka.

Obodo a nwere ụlọ ọrụ nzipu ozi, ụlọ ụka dị iche iche nke gụnyere ụka Anglican St Peters, ụka Katoliki Madonna Assumpta, nakwa ọtụtụ ụka Anglican na Roman Katọlik, ụka Pentikọstal wdg. Obodo a nwekwara ngalaba mmụta sayensị ọgwụ nke ụlọ akwụkwọ mahadum Nnamdi Azikwe, nakwa ụlọ ọrụ mpaghara ndịda ọwụwa anyanwụ nke National Agency for Food, Drug Administration and Control (NAFDAC). [1]

Obodo Agulu nwere obodo nta ndị ọzọ nke ọnụ ọgụgụ ya di iri abụọ. Nke a gụnyere: Nwanchi, Nneohia, Okpu, Ama-Ezike, Odidama, Amorji, Isiamaigbo, Ukunu, Uhueme, Obeagu, Obe, Nkitaku, Okpu-Ifite, Umubialla, Amatutu, Umuowelle, Umunnowu, Ifiteani, Umugidiifite, na Nneo .

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. Post Offices- with map of LGA. NIPOST. Archived from the original on 7 October 2009. Retrieved on 2009-10-20.