Gaa na ọdịnaya

Agulu

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Agulu
human settlement, tourist attraction, lake
Asụsụ obodoAsụ̀sụ̀ Ìgbò Dezie
Asụsụ njiemeAsụ̀sụ̀ Ìgbò Dezie
Mba/obodoNaijiria Dezie
Dị na ngalaba nhazi mpagharaAnambra State Dezie
Dị na mpaghara ogeUTC+01:00 Dezie
Nhazi ọnọdụ6°7′0″N 7°4′0″E Dezie
Asụsụ ọ na-asụAsụ̀sụ̀ Ìgbò Dezie
Map
Agulu Lake 2

Agulu bụ nnukwu obodo na steeti Anambra, Naịjiria. Ọ dị n'okpuru ọchịchị-imeobodo Anaocha. N’obodo a ka e nwere ọdọ mmiri nke e ji "Agulu Lake" mara. Ọtụtụ ndị Agụlu bụ ndị a na-anụ āhà ha nke ọma. Ha gụnyere Peter Obi (bụ gọvanọ Anambra Steeti ọtụtụ afọ̀ gara aga) na Joy Emodi (bụbu sinetọ nọchitere anya ndị Anambra North n’ọgbakọ ndị omebe iwu ala Naịjiria). Ụfọdụ ndị ọzọ bụ Dora Akunyili (bụ onyeisi NAFDAC na mgbe gara aga), Ifeanyi Eric Okoye (bụ CEO na Juhel Pharmaceuticals, ndị na-emepụta ọgwụ̀) na HE Ambassador Justin Okechukwu Kingland (DRM). Ambassador Kingland chọpụtara "Face of Agulu", Anambra State. A makwa Agulu dịka ebe mbuze na-eme, karịsịa n'Agulu-Nanka.

Agulu nwere ụlọ ọrụ nzipu ozi na ụlọ ụka dị ichè ichè (nke gụnyere St Peter's bụ ụlọ ụka Anglican, Madonna Assumpta bụ ụlọ ụka Katọliki, nakwa ọtụtụ ụlọ ụka Anglican, Roman Katọlik, Pentikọstalụ, na ndị ọzọ). Obodo a nwekwara ngàlàbà mmụta sayensị ọgwụ nke ụlọ akwụkwọ mahadum Nnamdi Azikwe, nakwa ụlọ ọrụ mpaghara ndịda ọwụwa anyanwụ nke National Agency for Food, Drug Administration and Control (NAFDAC). [1]

Obodo Agulu nwere obodo ntà mejupụtara ya, nke ọnụọgụgụ ha dị iri abụọ. Obodo ntà ndị a gụnyere: Nwanchi, Nneohia, Okpu, Ama-Ezike, Odidama, Amorji, Isiamaigbo, Ukunu, Uhueme, Obeagu, Obe, Nkitaku, Okpu-Ifite, Umubialla, Amatutu, Umuowelle, Umunnowu, Ifiteani, Umugidiifite, na Nneo.

Edensibia

[dezie | dezie ebe o si]
  1. Post Offices- with map of LGA. NIPOST. Archived from the original on 7 October 2009. Retrieved on 2009-10-20.