Ahmed Marafa

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Ahmed Marafa
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
Ahmed Marafa
Speaker of the Niger State House of Assembly
[[ Ambassador to Àtụ:CountryPrefixThe]]

Ahmed Mohammed Marafa bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Naijiria nke ahọpụtara ka ọ bụrụ onye isi oche nke ụlọ ọgbakọ omebe iwu nke asatọ nke Niger na 2015. Marafa bụ onye a họpụtara na ọgbakọ omebe iwu steeti site na Chanchaga n'elu ikpo okwu All Progressives Congress.  Ọ bụ Bashir Lokogoma na-anọchite anya Wushishi Constituency họpụtara ya maka ọkwa okwu ọnụ ma Bako Alfa sitere na Bida North Constituency kwadoro ya.[1][2][3]  Mgbe ọ ṅụsịrị iyi ọchịchị, Marafa kwuru na ya ga-emepụta iwu bara uru nke ga-ebuli ọnọdụ ndị mmadụ elu.[1][2]

Na Nọvemba 2015, a họpụtara Marafa onye isi oche nke Northern Nigeria Speakers Forum nke bụ otu ndị na-ekwuchitere ụlọ ọgbakọ omebe iwu steeti iri na itoolu.[1][2]  N'ime ntuli aka nke 2019, Marafa kparịrị ndị ntorobịa na-abụ abụ 'otu okwu naanị' na ya.  Egwu a pụtara na ha akwadoghị ịzọ ọkwa ya ọzọ na ọgbakọ omebe iwu steeti ahụ.  E jidere ndị ntorobịa anọ ndị na-abụ abụ a ma kpụga n'ụlọ ikpe majisteetị maka ebubo atọ ha na-ebo ebubo imekọ ihe ọnụ, na-akpali ọgbaghara na ihe ọjọọ.[3].[3]

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. Niger Assembly elects Marafa as Speaker - Premium Times Nigeria (en-GB) (2015-06-09). Retrieved on 2020-06-13.
  2. Niger State Speaker, Rt. Hon. Marafa Ahmed commends the House For Outstanding Performance. Nigerian Voice. Retrieved on 2020-06-13.
  3. 4 youths docked for "one term only" chants at Niger Speaker (en-US). Vanguard News (2018-08-08). Retrieved on 2020-06-13.