Aiwel (onye akụkọ ifo)

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Aiwel, nke a makwaara dị ka Aiwell Longar, bụ dike akụkọ ifo nke e weere dị bụ nna nna nke ndị Bor na ndị Dinka nke Sudan.[1][2]

Ihe Ngosịpụta[dezie | dezie ebe o si]

Dịka Asante na Mazama si kwuo (2009), a mụrụ Aiwel site n'aka nna mmụọ mmiri na nne mmadụ. Dịka ọtụtụ ndị dike akụkọ ifo ndị ọzọ, Aiwel nwere ike ime mmụọ ma nwee ike ịrụ ọrụ ebube.[3]

Akụkọ ifo[dezie | dezie ebe o si]

Ọmụmụ nke Aiwel[dezie | dezie ebe o si]

Dịka Lynch na Roberts si kwuo (2010), e nwere nsụgharị abụọ nke akụkọ ifo na-egosi ọmụmụ Aiwel. Na nsụgharị mbụ nke akụkọ ifo ahụ, a mụrụ Aiwel n'aka nwanyị di ya nwụrụ na-ebe ákwá n"akụkụ osimiri. Nwanyị isi mkpe ahụ chọrọ ịmụ nwa nwoke, mana di ya nwụrụ, ọ nwere naanị nwa nwanyị ugbu a. Chi osimiri ahụ hụrụ ihe merenụ wee kpebie ịgọzi ya nye ya nwa nwoke. Ka ọ na-esi n'osimiri ahụ pụta, nwanyị isi mkpe ahụ tụụrụ ime.[1]

N'oge na-adịghị anya, nwanyị ahụ di ya nwụrụ mụrụ nwa nwoke, Aiwel. Ọ bụ ezie na a mụrụ ya n'oge na-adịbeghị anya, Aiwel enweela ike ịgagharị ma kwurịta okwu n"ụzọ zuru ezu. Nwanyị isi mkpe ahụ mechara chọpụta nkà Aiwel. Otú ọ dị, ọ dọrọ ya aka na ntị na ọ ga-anwụ ma ọ bụrụ na ya agwa onye ọ bụla ihe Aiwel nwere ike ime. N'ụzọ dị mwute, ọ gwara mmadụ, ọnwụ wee bịa maka ya. Aiwel tolitere n'aka nna ya mgbe nne ya nwụsịrị. N'ikpeazụ, ọ laghachiri n'obodo nne ya.[1][3]

N'ụdị nke abụọ nke akụkọ ifo ahụ, nwanyị ahụ di ya nwụrụ na nwa ya nwanyị nọ n'iyi iji jide azụ mgbe chi osimiri wụbara ya. Site mgbe ahụ gaa n'ihu, ọ tụụrụ ime. O were afọ asatọ tupu o mụọ Aiwel. Nwa nwanyị isi mkpe ahụ anabataghị Aiwel dịka nwanne ya nwoke n'ihi na o lere ya anya na ọ gaghị ekwe omume n"ihi agadi nwanyị ahụ di nwụrụ. Aiwel nọgidere n'ime obodo ahụ n"agbanyeghị nke ahụ, ọ bụ ezie na ọ gbalịrị ịlanarị ma ghọọ onye a jụrụ ajụ.[1]

Edemsibịa[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 Lynch (2010). African Mythology, A to Z (in en). Infobase Publishing. ISBN 978-1-4381-3133-7.  Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name ":0" defined multiple times with different content
  2. Cox (2010-02-10). An Introduction to the Phenomenology of Religion (in en). A&C Black. ISBN 978-1-4411-7159-7. 
  3. 3.0 3.1 Asante (2009). Encyclopedia of African Religion (in en). SAGE. ISBN 978-1-4129-3636-1.  Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name ":1" defined multiple times with different content