Akua Sarpong-Ayisa

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Akua Sarpong-Ayisa
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịGhana Dezie
Aha enyereAkua Dezie
aha ezinụlọ yaSarpong Dezie
Ebe ọmụmụMampong Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye ọchụnta ego Dezie
ebe agụmakwụkwọKwame Nkrumah University of Science and Technology Dezie

Akua Sarpong-Ayisa (amụrụ na Mampong ) bụ onye Ghana na-achụnta ego. Ọ tọrọ ntọala ma bụrụ onye na-ahaxi ụlọ ọrụ okooko osisi a kpọrọ "Unique Floral" nke na-arụ ọrụ n'ofe West Africa . [1] [2] [3] Edepụtara ya dị ka otu n'ime Glitz 100 Inspirational Women, ọzọkwa WomanRising deputara ya na ndepụta ụmụ nwanyị otu narị kasị pụọ iche n'ọchụnta ego na Ghana n'afọ 2016 na 2017. [4] [5] [6]

Mbido Ndụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Sarpong-Ayisa na Mampong nke dị na mpaghara Ashanti nke Ghana. Ya na ụmụnne ya na ndị nne na nna, ọ tolitere na Accra . [1]

Agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ praịmarị na St John's Preparatory School dị na Accra, ọ gara n'ihu na Oda Senior High School ebe ọ gụrụ akwụkwọ sekọndrị. Site ebe ahụ, ọ gara Mahadum Sayensị na Nkà na ụzụ Kwame Nkrumah ebe ọ ga-agụ maka njikwa ala mana o nweghi ike imecha ya n'ihi mmechi nke ụlọ akwụkwọ ahụ nwa oge. N'oge mmechi nke ụlọ akwụkwọ ahụ, o were Ghana Airways mee ihe ọmụmụ onye nlekọta ụgbọ elu. [1]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Sarpong-Ayisa rụrụ ọrụ na National Lotteries Ghana tupu ọ rụọ ọrụ dị ka onye na-akwụ ụgwọ ego na Bank for Housing tupu ọ gaa mahadum. [1] Ka ọ gachara nkuzi onye nlekọta ụgbọ elu mgbe agụmakwụkwọ mahadum ya gachara, ọ rụrụ ọrụ dịka onye nlekọta ụgbọ elu maka Ghana Airways afọ iri abụọ na abụọ.

N'ime afọ ya dị ka onye nlekọta ụgbọ elu, Sarpong-Ayisa malitere ịnwe mmasị na okooko osisi. Ọ zụtara okooko osisi ndị mara mma na Netherlands, United States, na United Kingdom maka ụlọ ya na maka onyinye ọ ga-enye ndị ezinụlọ na ndị enyi ya. [1] Ọ malitere azụmahịa okooko osisi n'ihi ndụmọdụ di ya na 1991 wee mesịa kpọọ azụmahịa ahụ "Unique Floral". [1] Azụmahịa ya gbasaara iji nye ifuru nakwa inye ọrụ nhazi ifuru na Ghana na mba ndị gbara ya agbata obi n'ofe West Africa. [1] Okooko osisi ya gụnyere okooko osisi ndị e si South Africa, Etiopia, na Netherlands ebubata, yana okooko osisi ndị a na-akụ na ndị a họọrọ n'ugbo ifuru ya dị n'oke ala iri abụọ ya dị na Aburi na mpaghara ọwụwa anyanwụ Ghana. [1] Azụmaahịa ifuru ya na-ere ahịa agbasawanyela imepe ụlọ akwụkwọ ọzụzụ ịchọ mma ifuru ọgbara ọhụrụ na Accra. [1]

Ihe nrite na nnabata[dezie | dezie ebe o si]

  • Edepụtara ya na ndepụta nke WomenRising maka ụmụ nwanyị otu narị kacha nwee mmetụta na 2016 [7] [5]
  • Edepụtakwara ya na ndepụta nke WomenRising maka ụmụ nwanyị otu narị kacha nwee mmetụta na 2017 [6]
  • Ihe nrite nturu ugo onye ndu mba ụwa nke Center for Transformational Leadership [8] [9]

Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 1.4 1.5 1.6 1.7 1.8 Up close with celebrated floral entrepreneur; Akua Afriyie Sarpong-Ayisa (en-US). Today Newspaper (2017-01-27). Archived from the original on 2020-02-15. Retrieved on 2019-09-07.
  2. Unique Floral celebrates 25 years in floristry, event designing (en). www.ghanaweb.com. Retrieved on 2019-09-07.
  3. Little things around inspires me to create new things- Akua Sarpong-Ayisa. Pulse (2017-03-31). Retrieved on 2019-09-09.
  4. Amoako (2016-07-16). Glitz top 100 inspirational women. Glitz Africa. Retrieved on 2019-09-09.
  5. 5.0 5.1 WomanRising. 2016 – 100 Most Outstanding Women Entrepreneurs In Ghana – WomanRising (en-US). Archived from the original on 2019-09-04. Retrieved on 2019-09-07.
  6. 6.0 6.1 WomanRising Announces 2017 100 Most Outstanding Women Entrepreneurs List. The BFT online (2017-11-20). Retrieved on 2019-09-09.
  7. Mrs Joyce Ababio named in 100 Most Outstanding Women Entrepreneurs in Ghana (en-GB). JACCD (2016-05-11). Archived from the original on 2020-02-15. Retrieved on 2019-09-07.
  8. Online. Six receives Global leadership Awards. www.peacefmonline.com. Retrieved on 2019-09-07.
  9. Six receives Global leadership Awards. ghananewsagency.org. Retrieved on 2019-09-09.