Alain Mafart

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Alain Mafart
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịFrance Dezie
aha n'asụsụ obodoAlain Mafart Dezie
Aha enyereAlain Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1951 Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaFrench language Dezie
convicted ofmanslaughter Dezie
Ọrụ ọ na-arụcompetitive diver Dezie
ụdị egwuregwudiving Dezie
ọkwa aghacolonel Dezie
ihe omume dị ịrịba amaMmiri nke Rainbow Warrior Dezie

 

Alain Mafart (amụrụ nafọ 1951) bụ onye agha French nke a maara nke ọma maka òkè ya na bọmbụ nke Rainbow Warrior .

Mafart bụ onye ọrụ DGSE na osote onye isi nke DGSE Training Centre na Corsica. Ọ kwadoro ndị otu mmebi nke gara New Zealand ma tụọ bọmbụ ma kpuo ụgbọ mmiri Greenpeace Rainbow Warrior, naegbu <i id="mwEw">onye</i> naese foto Fernando Pereira.

Ndị uwe ojii New Zealand jidere ya, kweta na ikpe mara ya maka igbu ọchụ ma maa ya ikpe ịga mkpọrọ afọ iri na 22 Nọvemba 1985. Nịgbaso nrụgide ndọrọ ndọrọ ọchịchị siri ike sitere na France na ndị enyi ya na ogbugbo nke United Nations kwadoro netiti New Zealand na France na July 1986, a chụgara Mafart nàgwàetiti Hao na French Polynesia ka ọ rụọ ọrụ afọ atọ. Na nzaghachi, France rịọrọ New Zealand mgbaghara ma kwụọ New Zealand $ 6.5 nde.

Otú ọ dị, na 14 Disemba 1987, Mafart laghachiri Paris mgbe ọ mere mkpesa banyere mgbu afọ. Mgbe a gwọchara ya, a kpọghachighị ya nàgwàetiti ahụ ma na 1988 o debanyere aha na ọmụmụ afọ abụọ na École de Guerre (War College) na Paris.

E buliri Mafart nọkwa ka ọ bụrụ colonel nọnwa Disemba afọ 1993. Dị ka Le Monde si kwuo, Mafart naeje ozi nakụkụ Paris nụlọ ọrụ nwere ọtụtụ ndị ọrụ iwu, gụnyere nke ndị agha nzuzo.

Onye isi ya noge Rainbow Warrior ghọrọ onye enyemaka nke Minista Nchebe Francois Léotard.

O dere akwụkwọ "Carnets secrets d'un nageur de combat: Du Rainbow Warrior aux glaces de l'Arctique" (akwụkwọ ndekọ nzuzo nke onye naegwu mmiri agha": site na Rainbow Warrion ruo Arctic ices) nke metụtara ọrụ ya na bọmbụ ahụ. [citation needed] paragraf 1-7

Mafart mechara bụrụ onye naese foto, na 2016 bụ onye ikpeazụ na Natural History Museum's Wildlife Photographer of the Year award.[1] Nafọ 2014, nokpuru aha Alain Mafart-Renodier, a họọrọ otu nime foto ya maka itinye ya na kalenda Greenpeace nke mba ụwa. Mgbe ha matara onye naese foto ahụ bụ, Greenpeace USA bibiri kalenda 14,000 ọ nwere nahịa mana ha enweghị ike igbochi ọtụtụ ndị ka a naere ha nihu ọha.[2]

Ihe odide[dezie | dezie ebe o si]

  1. "Rainbow Warrior bomber Alain Mafart finalist in prestigious wildlife photography competition", New Zealand Herald, 2016-11-24. Retrieved on 2016-11-25. (in en-NZ)
  2. Knight. "Greenpeace redfaced over calendar", Stuff.co.nz, 2014-09-04. Retrieved on 2016-11-25. (in English)