Alda Neves da Graça do Espírito Santo

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Alda Neves fa Graça do Espírito Santo

Alda Neves da Graça do Espírito Santo ( n'ụbọchị 30 Eprel 1926 ̊ ruo ụbọchị 9 Machị 2010), nke a maara dị ka Alda do Espírito santo ma ọ bụ Alda Graça, bụ onye na-ede uri si São Tomé e Príncipe na-arụ ọrụ n'asụsụ Portuguese.[1] Ọ rụkwara ọrụ na gọọmentị Santomean mgbe nnwere onwe mba ahụ gasịrị.[2]

A mụrụ ya na São Tomé e Príncipe, nke bụbu ógbè Portuguese n'ụsọ oké osimiri nke West Africa, nke João Graça do Espírito Santo na Maria de Jesus Agostinho das Neves. Ezinụlọ ahụ bụ ndị a ma ama n'obodo São Tomé. Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ praịmarị, ọ gara ụlọ akwụkwọ sekọndrị na Portugal. N'afọ 1948, Alda da Graça malitere ịmụ ihe na Lisbon iji ghọọ onye nkuzi ụlọ akwụkwọ praịmarị.[3]

Ebenside[dezie | dezie ebe o si]

  1. Alda Graça do Espírito Santo — Katya Aragão's Special Tribute. Saotomeblog.com (16 March 2010). Archived from the original on 13 September 2010. Retrieved on 8 March 2012.
  2. (2012) "Graça, Alda da", in Akyeampong: Dictionary of African Biography, Volume 6. OUP USA, 500–501. ISBN 9780195382075. 
  3. David. City Icon: Alda Neves da Graça do Espírito Santo - Sao Tome. Archived from the original on 16 October 2020. Retrieved on 24 November 2016.