Jump to content

Alexia Mupende

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Alexia Mupende
TitleFormer General Manager at Waka Fitness, in Kigali, Rwanda

Alexia Uwera Mupende (17 Nọvemba 1984 - 8 Jenụwarị 2019) bụ onye Rwandan na-ese onyinyo, onye na-eme ihe nkiri na ọkachamara n'ihe gbasara ahụike, onye n'oge ọnwụ ya, bụ onya na-ahu maka odịmma ọha obodo na Waka ebe a na eme ka ahụ sie ike, na Kigali, isi obodo Rwanda.[1]

Mmalite na agụmakwụkwọ

[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Alexia Uwera na Kenya. Ọ gara ụlọ akwụkwọ na Uganda, nweta asambodo sekondri ya na Namasagali College na Kamuli District. Ọ gara n'ihu nweta diplọma ụlọ akwụkwọ sekọndrị ya na St. Lawrence College, na Central Region nke Uganda. Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ kwagara Rwanda ebe ọ gụsịrị akwụkwọ na Bachelor of Information Technology na Mahadum nke Rwanda .[1]

Alexia Mupende bụ onye na-ese onyinyo mba ụwa, onye nọchitere anya mba ya, Rwanda, na mmemme ejiji na Kampala, Uganda, Geneva, Switzerland, Dubai, United Arab Emirates, Colombo, Sri Lanka na Mumbai, India. Iji gbakwunye ego ọ na-enweta n'ọrụ n'ihe ngosi, ọ rụrụ ọrụ dị ka onye isi njikwa nke ulọ mmega ahu akpọrọ waka, klọb mmega ahụ na obodo Kigali.[2][3]

Ọnwụ

[dezie | dezie ebe o si]

N'uhuruchi Tuesday, 8 Jenụwarị 2019, a chọtara ozu Alexia Uwera Mupende n'otu n'ime ụlọ ihi ụra n'ụlọ nna ya na Nyarugunga Sector, Kicukiro District, mpaghara dịpụrụ adịpụ nke obodo Kigali. A mara ya mma ọtụtụ ugboro.[4]

Ndị ọrụ nchekwa Rwanda mara ọkwa na ha na-achọ Antoine Niyireba, onye dị afọ iri abụọ na atọ, onye na-arụ ọrụ n'ụlọ nne na nna ahụ nwụrụ anwụ. Ọ bụ onye a na-enyo enyo na ogbugbu ahụ.[5]

Ihe ndị ọzọ a na-atụle anya

[dezie | dezie ebe o si]

N'oge ọ nwụrụ, ọ kwere nkwa ịlụ di na Febụwarị 2019, a tọhapụrụ akwụkwọ ịkpọ òkù maka agbamakwụkwọ ahụ.[6][7]

  • Cynthia Munwangari

Ndesibịa

[dezie | dezie ebe o si]
  1. 1.0 1.1 Muhwezi (9 January 2019). Mystery as Rwandan model, actress Alexia Mupende is stabbed to death by houseboy. PMLDaily. Retrieved on 10 January 2019.
  2. Opobo (12 June 2016). Mupende braving the odds to showcase Africa's richness. Retrieved on 10 January 2019.
  3. Softpower Reporter (9 January 2019). Rwanda's Celebrated Model And Actress Alexia Mupende Killed By Housemaid. Softpower Uganda. Retrieved on 10 January 2019.
  4. Mwai (8 January 2019). Top Rwandan model Alexia Mupende murdered. Retrieved on 10 January 2019.
  5. Linda M. Kagire (9 January 2019). Tributes pour in for model Alexia Mupende.
  6. BBC (9 January 2019). Top Kenyan-born Rwandan model Alexia Mupende 'murdered'. Archived from the original on 3 February 2019. Retrieved on 10 January 2019.
  7. Monitor Reporter (9 January 2019). Shock as top Rwandan model Alexia Mupende is murdered by shamba boy. Retrieved on 10 January 2019.

Njikọ mpụga

[dezie | dezie ebe o si]
  • Ndị uwe ojii na-ekwu na ọ bụ onye ọrụ ụlọ gburu ihe nlereanya Rwanda, ka ọ na-erule 10 Jenụwarị 2019.