Ali Bedri

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Ali Bedri
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịSudan Dezie
Aha enyereAli Dezie
aha ezinụlọ yaBedri Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya26 Novemba 1903 Dezie
Ebe ọmụmụRufa'a Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya13 Jenụwarị 1987 Dezie
ŃnàBabikr Badri Dezie
Ọrụ ọ na-arụphysician Dezie
Ihe nriteOnye otu Order nke Alaeze Ukwu Britain, Fellow of the Royal College of Physicians of London Dezie

Ali Bedri Àtụ:Honorific suffix (Àtụ:Lang-ar; 26 Nọvemba 1903, Rufaa - 13 Jenụwarị 1987) bụụrụ onye ọ́gwọ́ ọrịa si mba Sudan, na minista mbụ maka Ahụike kemgbe Sudan kwụụrụ onwe ha.

Ndụ na Ọrụ Ya[dezie | dezie ebe o si]

Mmalite Ndụ na Agụmakwụkwọ Ya[dezie | dezie ebe o si]

aka-èkpè

A mụrụ Ali Babiker Bedri na 26 Nọvemba afọ 1903 na Rufaa, Steeti Blue Nile. Ọ bụụrụ nwa Sheikh Babiker Bedri (Àtụ:Lang-ar), lụọ ọgụ megide ndị Agha ọgụ si mba Britain nke Kitchener na ọgụ nke Omdurman n'afọ 1898 ma bụrụ onye mbụ gbara mbọ maka agụmakwụkwọ ụmụ nwanyị na mba Sudan.[1][2] Ali Bedri nwetara agụmakwụkwọ mbụ ya na Rufaa, ebe nna yá hiwere ọtụtụ ụlọ akwụkwọ. O mechara debanye aha na Gordon Memorial College dị na Khartoum, ebe ọ gụchara dịka onye nkuzi n'afọ 1923. N'agbanyeghị na o bubu ụzọ chụọ akaraka ya n'ikuzi nkuzi, o kpebiri ịgafe n'ahụike, wee bụrụ otu n'ime ụmụ akwụkwọ mbụ debara aha ha na Ụlọ Akwụkwọ Ahụike Kitchener.[3] N'afọ 1928, o jị nzere ọkachamma pụta [4] wee rụọ ọrụ dịka onye ọrụ ahụike na Singa, Dongola, Ùgwù Nuba, na Sennar.[5]

Bedri mechara gaa ghọọ ótù n'ime ndị si mba Sudan ijide ọ́kwá onye ọrụ ahụike dị elu na Ụlọ ọgwụ Omdurman Hospital na Ụlọ ọgwụ Khartoum. N'afọ 1937, o mere njem gaa mba United Kingdom maka ọ̀zụ̀zụ̀ igakwu n'ihu na Ulọ ọgwụ Hammersmith . E mere ya onye òtù w:Royal College of Physicians n'afọ 1952.[6]

Ọrụ Ya[dezie | dezie ebe o si]

Mgbe ọ laghachịrị Sudan, ahọpụtara Bedri dịka dọkịnta mbụ si Sudan ijide ọ́kwá osote osote onye isi ndị ọrụ ahụike n'okpuru Eric Pridie. Ahụmahụ o nweburu mgbe ọ bụ onye nlekọta ahụike n'ọtụtụ akụkụ Sudan nyere ya ohere ịghọtakwu ihe niile gbasara ahụike nke mba ahụ nakwa uru ọ bara ikepụta ọrụ nlekọta ahụike na-arụsi ọrụ ike. Ka ọ lere anya hụ na ego e wepụtara maka ịrụ ọrụ dị ntakịrị, tinyekwuo n'ihe ịma mgba nke Agha Mba Ụwa Nke Abụọ na-eweta, Bedri nwere ọrụ siri ike nke ịghọrọ mkpa ndị nke ga-ebu ụzọ a ga-egbo. Site na ntụziaka nke ndị nkuzi mba Britain ya na ndị tọrọ ya n'ọrụ nyere ya, o meputara ihe ụkpụrụ mgbaso nke mere ya ka ọ buru onye mbụ sere ọdịdị na oyiyi nke ọrụ ahụike mba Sudan kwụụrụ onwe ya.[6]

A họpụtara Bedri ka o soro na Kansụl ndị Ndụmọdụ maka Mgbago úgwú Sudan na kọmitii Sudanisation, [7] ma n'agbanyeghị na ịbụ onye ọrụ gọọmenti ya ekweghị ka o soro na ndọrọ ndọrọ ọchịchị pụtara ìhè, o kwenyesiri Ike na nnwere onwe mba Sudan.[8] N'afọ 1948, ahọpụtara Bedri dịka otu n'ime ndị nzukọ omebeiwu nke mbụ, ma emesia ahọpụta ya dịka Minista n'ahụ maka Ahụike.[6][9][10] Bedri jere ozi dịka Minista n'ahụ maka Ahụike na Sudan site n'afọ 1948 ruo afọ 1952,[11] bụ oge ọ rụrụ ọrụ pụtara ìhè n'imelite na ịbasakwu ọrụ ahụike nke mba ahụ.[6][9] Ka ọ bịanyechara aka ịtụrụ gọọmenti onwe onye nke mba Sudan Vootu ya, Bedri gbara ọrụ ya arụkwaghịm dịka Minista n'ahụ maka Ahụike ma laghachị n'ọrụ ahụike nke onwe onye ya .[6] N'oge ọrụ ya dịka Minista Ahụike tupu Nnwere onwe mba Sudan, Ali Bedri tinyere n'ọrụ ámụ̀mà ihe ọ chọrọ imepụta n'ime afọ iri nke bu n'obi iguzobe usoro ọrụ ahụike na-arụsi ọrụ ike na mba ahụ. Bedri hutara uru ọ bara bụ ịgụtukwu akwụkwọ nke ndị nweterela nzere mbụ ha nakwa ọzụzụ nye ndị dọkịnta Sudan ma n'ọgwụ mgbochi ma n'ọgwụ ọgwụgwọ, nakwa mkpa ọdị ịzụ ndị ndị na-ahụ maka ndị ahụ ha ezuchaghị okè, ndị ọrụ nọọsụ, na ndị ọrụ na ngalaba ahụike nne na nwa.[6]

Bedri gakwara n'ihu n'ịrụ ọrụ pụtara ìhè dịka onye isi oche nke Sudan Medical Council site n'afọ 1968 ruo afọ 1974,[12] ma rụkọọ ọrụ ya na Red Crescent.[6] Ahụtara ya gbaa gburugburu dịka isi sekpụ ntị n'ọgwụ na ọgwụgwọ mba Sudan ebe o guzobere ntọala tọrọ àtọ̀ maka ọzụzụ ndị ọrụ na ịrụ ọrụ ahụike, wee dowe ụkpụrụ mgbaso dị elu maka akparamàgwà akụkụ àkwà na ịrụ ọrụ dịka onye ọkachamara n'oge enwere ọgwụgwọ ole ma ole nye ọtụtụ ọrịa, nakwa ọgwụ mmịkpọ ndụ na-adịghị chaachaa maka ọrịa ndị na-efe èfè. Ọ bụụrụ onye a ga-agwanwu okwu, ma dịkwa njikere inye ndụmọdụ nye ndị ya na ha na-arụkọ, nkekanke ndị dọkịnta ka dị ntorobịa.[6]

Bedri bụụkwara onye òtù nọ n'ihu na ụlọ ọrụ Female Circumcision,[13][14] Onye ntụziaka nke Family Planning Association,[15] ma hiwe kwa ụlọ akwụkwọ naanị ụmụ nwanyị nke mbụ na mba Sudan.[16]

Personal life and death[dezie | dezie ebe o si]

Bedri lụrụ Hurum El Amin.[17] Ha abụọ mụrụ nwa nwoke , ụmụ nwanyị anọ, na ụmụ ụmụ dị iri na abụọ ma agukọọ ha ọnụ.[6]

Bedri nwụrụ na 13 Jenụwarị afọ 1987.[6]

Ihe Nrite na Nkwanye Ùgwù Ya[dezie | dezie ebe o si]

Emere Bedir onye òtù Royal College of Physicians n'afọ 1952,[6] na onye òtù Order of the British Empire.[18][19]

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. Reynolds, Reginald (1955). Beware of Africans: A Pilgrimage from Cairo to the Cape (in en). Jarrolds. 
  2. Reynolds, Reginald (1955). Cairo to Cape Town: A Pilgrimage in Search of Hope (in en). Doubleday. 
  3. (2020-01-29) Clio Medica. Acta Academiae Internationalis Historiae Medicinae. Vol. 11 (in en). BRILL. ISBN 978-90-04-41823-3. 
  4. Bayoumi, Ahmed (1979). The History of Sudan Health Services (in en). Kenya Literature Bureau. 
  5. The Kitchener School of Medicine: 20th-century medical education in Sudan | RCP Museum.
  6. 6.00 6.01 6.02 6.03 6.04 6.05 6.06 6.07 6.08 6.09 6.10 Ali Bedri | RCP Museum.
  7. Al- Teraifi, Al- Agab A. (1977). "Sudanization of the Public Service: A Critical Analysis". Sudan Notes and Records 58: 117–134. ISSN 0375-2984. 
  8. Sanderson, Lilian Passmore (1981). Against the Mutilation of Women: The Struggle to End Unnecessary Suffering (in en). Ithaca. ISBN 978-0-903729-66-6. 
  9. 9.0 9.1 inauthor:"Ann Crichton-Harris" - Google Search.
  10. Affairs, Royal Institute of International (1947). Chronology of International Events and Documents (in en). Royal Institute of International Affairs. 
  11. Cruickshank, Alexander (1962). The Kindling Fire: Medical Adventures in the Southern Sudan (in en). London. 
  12. Sudan Medical Council (en-US).
  13. (1982) Sudan Notes and Records (in en). Sudan Notes and Records.. 
  14. Boddy, Janice (2018-06-05). Civilizing Women: British Crusades in Colonial Sudan (in en). Princeton University Press. ISBN 978-0-691-18651-1. 
  15. Network, Women's International (1977). Women's International Network News (in en). Women's International Network. 
  16. inauthor:"Anti-slavery Society for the Protection of Human Rights" - Google Search.
  17. Ali Babiker Bedri (en) (2014-07-18).
  18. (1953) Middle East, a survey and directory (in en). 
  19. (1953) The Middle East: A Survey and Directory of the Countries of the Middle East (in en). Europa Publications.. 

Àtụ:Portal bar