Jump to content

Alok Kumar Ghosh

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

 

Alok Kumar Ghosh (nwụrụ 7 Ọgọst 2021) [1] bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị India si steeti Assam. Ọ bụbu onye otu Assam Legislative Assembly maka Mariani.

Mbido ndụ na agụmakwụkwọ

[dezie | dezie ebe o si]

Ghosh bụụrụ nwa-nwoke nke Bholanath Ghosh. Ghosh gafere H.S.L.C. Ule na afọ 1974 site na ụlọ akwụkwọ sekọndrị Railway, Mariani, Dist. Jorhat, Assam. [1]

Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị

[dezie | dezie ebe o si]

Ghosh bụ onye na-azọ ọkwa onyeisiala na Nationalist Congress Party maka Mariani n'afọ 2001. O nwetara vootu 16198 , 26.16% nke ngụkọta vootu. Rupam Kurmi meriri ya.[2][3]

Rupam Kumri nwụrụ n'afọ 2004 nke dugara na ntuli aka. Ọ bụ onye na-azọ ọkwa onyeisiala na Trinamool Congress ma nweta vootu 18424 wee ghọọ MLA nke mpaghara ahụ.

Na ntuli aka Assam Legislative Assembly nke afọ 2006, ọ nataghị nhọpụta Trinamool Congress kama ọ ghọghachiri onye Nationalist Congress Party. O nwetara vootu 30,454, Rupjyoti Kurmi ji vootu 3017 merie ya.

Na ntuli aka Assam Legislative Assembly nke afọ 2011, Ghosh laghachiri na Trinamool Congress. O nwetara vootu 2,86969, 37.67% nke ngụkọta vootu ma Rupjyoti Kurmi meriri ya na vootu 7058.

Na ntuli aka Assam Legislative Assembly nke afọ 2016, Ghosh laghachiri na pati Nationalist Congress. O nwetara vootu 34908, 38.55% nke ngụkọta vootu ma merie Rupjyoti Kurmi site na vootu 1793.

Na ntuli aka Assam Legislative Assembly nke afọ 2021, ekweghị ka ọ nweta tiketi BJP n'ihi ya, o tinyere akwụkwọ dị ka AGP mana e mechara wepụ nhọpụta ya.

Ọrụ mmekọrịta mmadụ na ibe ya

[dezie | dezie ebe o si]

A maara Ghosh maka ọrụ ebere ya. O nyela ọtụtụ narị ndị ogbenye nri esi nri n'oge mkpọchi Covid. Ọ gbara 'NaMo Canteen' na ọwụwa anyanwụ Assam's Mariani site na 2018 bụ nke nyere ụfọdụ ndị ogbenye 300 nri anaghị eri anụ zuru oke kwa ụbọchị. A na-ana ndị ọrụ kwa ụbọchị Rs 8 kwa nri ebe a na-enye ndị arịrịọ na ụmụ mgbei nri ahụ n'efu..[4]

Ọrịa na ọnwụ

[dezie | dezie ebe o si]

N'abalị iri na otu n'ọnwa Machị 2021, Ghosh dara ọrịa ma kpọga ya n'ụlọ ọgwụ awa ole na ole mgbe a jụrụ akwụkwọ nhọpụta ya maka ntuli aka mgbakọ. Na mbụ, Ghosh anọwo na-arịa ọrịa ndị metụtara obi ma tinye pacemaker.   [citation needed]

Na 7 Ọgọstụ 2021, mgbe ọtụtụ ọnwa nke ọrịa gasịrị, Ghosh nwụrụ n'ụlọ ọgwụ Siliguri na West Bengal. Ọ hapụrụ nwunye, nwa nwoke na ụmụ nwanyị abụọ. Ọtụtụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị ka Bimal Bora, Ranoj Pegu na Sarbananda Sonowal nyere ya otuto.[5] Sonowal kwuru "Onye ọrụ mmekọrịta ọha na eze a ma ama, ọnwụ ya bụ nnukwu mfu nye anyị niile".

N'abalị iri abụọ na itoolu n'ọnwa Ọgọstụ, Chief Minister Himanta Biswa Sarma gara n'ụlọ Ghosh na Siliguri, izute ndị ezinụlọ ya. [6] Sarma, tinyere ọtụtụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị gụnyere Ashok Singhal, Bhubaneswar Kalita na Sanjoy Kishan kwetara ọmịiko n'ememe ncheta Ghosh. [7][8]

Ebem si dee

[dezie | dezie ebe o si]
  1. Alok Kumar Ghosh(Nationalist Congress Party(NCP)):Constituency- MARIANI(TITABAR) - Affidavit Information of Candidate. myneta.info. Retrieved on 2022-03-27.
  2. Mariani Election Results 2016, Candidate list, Winner, Runner-up and Current MLAs. Elections in India. Retrieved on 2022-03-27.
  3. Mariani Assembly Constituency Election Result - Legislative Assembly Constituency. resultuniversity.com. Retrieved on 2022-03-27.
  4. NewsDesk (2021-03-12). Former Assam MLA hospitalised after nomination paper rejected (en-us). thenewsmill.com. Retrieved on 2022-03-27.
  5. News (2021-08-07). Assam: Former Mariani MLA Alak Kumar Ghose passes away (en-US). NORTHEAST NOW. Retrieved on 2022-03-27.
  6. Assam Chief Minister Himanta Biswa Sarma reaches former MLA's house at Siliguri (en-US). Siliguri24x7news (2021-08-29). Archived from the original on 2022-10-05. Retrieved on 2022-03-27.
  7. Sanjoy Kishan tribute (en). Twitter. Retrieved on 2022-03-27.
  8. Himanta Biswa Sarma condolences (en-GB). Twitter. Retrieved on 2022-03-27.