Amina Moussou Ouédraogo Traoré
Amina Mousso Ouédraogo aha ya bụ Aminata Mousso Traoré (amụrụ na June 12, 1948) bụ onye ọka iwu na onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Burkinabé. Ọ bụ Nwanyị mbụ nọrọ n'ọkwa onye ogbugbo nke Burkina Faso site na 2005 ruo 2011.[1]
Mbido ndụ na agụmakwụkwọ
[dezie | dezie ebe o si]Amina Mousso gụrụ akwụkwọ na ụlọ akwụkwọ sekọndrị Philipe Zinda Kaboré. Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ baccalaureate, ọ nwetara agụmakwụkwọ iji gaa n'ihu na ọmụmụ ya na France na Mahadum Aix-en-Province. O nwetara akara ugo mmụta n'iwu n'afọ 1976 na nzere masta n'iwu. Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ, ọ laghachiri na mba ahụ.[1] Ọ bụ nwanyị mbụ nwere ọkwa onye ogbugbo nke Burkina Faso . [1][2]
Amina Mousso bụ otu n'ime Ndị majie mbụ nke Burkina Faso.
Ọrụ
[dezie | dezie ebe o si]Amina Mousso Ouédraogo Traoré malitere ọrụ ya na ụlọ ikpe na Burkina Faso na 1979. O sonyeere Ụlọikpe Kasị Elu nke Ouagadougou dị ka onye nnọchiteanya nọchiri anya onye ọka iwu ma bụrụ onye ọka iwu. Mgbe ahụ na 1991, ọ bụ nwanyị mbụ mgbe Tiémoko Marc Garango na Jean-Baptiste Kafando gachara n'ọkwa onye ogbugbo Burkina Faso. Ọ malitere ịmepụta otu ndị ọkàiwu ndị inyom Burkina Faso. Ọ bụkwa odeakwụkwọ ukwu nke otu ndị ogbugbo nke mba ndị otu West African Economic and Monetary Union (UEMOA).[1] Ọ lara ezumike nká ma na-aga n'ihu na-abụ onye otu ndị isi oche nke Higher State Control Authority (ASCE-LC). [1][3]
Onyinye na mmata
[dezie | dezie ebe o si]Na Disemba 26, 2011, ọ natara utu aha nke National Officer of the Order of Merit . [1]
Ndụ onwe onye
[dezie | dezie ebe o si]Aminata Mousso lụrụ Alioune Ouédraogo, Prọfesọ nke Physics na Mahadum Ki Zerbo nke Ouagadougou. Ọ bụ nne ụmụ abụọ (ụmụ nwoke). [1]
Ihe odide
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ 1.0 1.1 1.2 1.3 1.4 1.5 Pioneer African Women in Law (en). African Women in Law. Retrieved on 2022-11-12. Kpọpụta njehie: Invalid
<ref>
tag; name ":0" defined multiple times with different content - ↑ Amina Ouédraogo prend officiellement fonction - leFaso.net. lefaso.net. Retrieved on 2022-11-12.
- ↑ Lepays (2018-07-11). Révélations : (fr-FR). Editions Le Pays. Retrieved on 2022-11-12.