Aminata Tall

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Aminata Tall
Personal details
ChildrenAugust 23, 2003

Aminata Tall (Amụrụ n'afọ 1949 na Diourbel) bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke Senegalese Democratic Party (PDS).

Tall gara ụlọ akwụkwọ Girls' Normal Schools nke Thiès na Rufisque, ebe ọ nwetara D-series Baccalauréat. Ọ nwetara nzere doctorate na Canada ma kụzie na École normale supérieure nke Dakar .

Ọ bụ Minista Steeti, Minista nke Ndị Ọchịchị Obodo na Nkwado, bụkwa onye nnọchi anya Nzukọ Mba na onye isi obodo Diourbel. Otú ọ dị, n'afọ 2007, ọ jụrụ nhọpụta ya dị ka osote onyeisi oche nke National Assembly ma ghara isonyere gọọmentị Cheikh Hadjibou Soumaré.

N'ọnwa Ọktoba afọ 2009, ọ ghọrọ odeakwụkwọ ukwu nke onye isi ala nke Republic of Senegal, na-anọchi Abdoulaye Baldé onye a họpụtara ka ọ bụrụ Minista nke ndị agha. Ọ ghọrọ onye isi oche nke Social and Environmental Economic Council n'ọnwa Jenụwarị 17, 2013.