Angélique Delahaye

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Angélique Delahaye
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịFrance Dezie
Aha ọmụmụAngélique-Mathilde-Andrée Prud'hon Dezie
Aha enyereAngelique, Mathilde, Andrée Dezie
aha ezinụlọ yaDelahaye Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya22 Febụwarị 1963 Dezie
Ebe ọmụmụLyon Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaFrench language Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, onye ọchụnta ego, farm operator, syndicalist Dezie
Ọkwá o jimember of the European Parliament, Mayor of Saint-Martin-le-Beau, Q66499946, Q65520801, member of the European Parliament Dezie
ebe agụmakwụkwọTours University Dezie
Ebe ọrụStrasbourg, City of Brussels Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịUnion for a Popular Movement, The Republicans, Rurality Movement Dezie
Onye òtù nkeFédération nationale des syndicats d'exploitants agricoles Dezie
Ihe nriteOfficer of the Legion of Honour, Knight of the Legion of Honour Dezie

Angélique Delahaye (amụrụ na 22 Febụwarị 1963) bụ onye ọrụ ugbo na onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke France. Ọ bụ onye isi oche nke Fédération nationale des producteurs de légumes (English: National Federation of Vegetable Producers) site na 2001 ruo 2012, na onye otu ndị nduzi nke Féderación nationale des syndicats d'exploitants agricoles (English) Ọ rụrụ ọrụ dị ka onye otu European Parliament site na 2014 ruo 2019, ọ bụkwa onye isi obodo nke Saint-Martin-le-Beau site na 2014 rue 2020.

Mbido ndụ na ọrụ ugbo[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Delahaye na Lyon ma too na Soisy-sur-Seine. Ọ malitere ọrụ ugbo ya n'afọ 1989, ya na di ya Thierry na-elekọta ugbo akwụkwọ nri na Saint-Martin-le-Beau, Touraine. N'afọ 1991, ọ sonyeere ndị nduzi nke Fédération nationale des producteurs de légumes (FNPL) (English: National Federation of Vegetable Producers), alaka nke Féderación nationale des syndicats d'exploitants agricoles (FNSEA) (Engish: National Federation for Agricultural Holders' Unions). Ọ ghọrọ onye isi oche nke FNPL, ya mere ọ bụ onye otu ndị nduzi nke FNSEA, n'afọ 2001, na-ejide ọkwa ahụ ruo n'afọ 2012.[1] Kemgbe afọ 2013 ọ bụkwa onye isi oche nke Solaal (Association Solidarité des producteurs agricoles et agroalimentaires) (English: Solidarity association of agricultural and agro-food producers), ma nata ọkwa nke Knight na Officer of the Legion of Honour maka ọrụ ya, ebe e buliri ya n'ọkwa onye isi na July 2021.[2][3]

Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị[dezie | dezie ebe o si]

Delahaye banyere na ndọrọ ndọrọ ọchịchị na 2010, nke Hervé Novelli kwadoro, onye ya na ya rụkọrọ ọrụ mgbe ọ bụ odeakwụkwọ nke steeti maka azụmahịa. A họpụtara ya ka ọ bụrụ onye kansụl mpaghara maka Centre-Val de Loire na ntuli aka mpaghara France nke afọ 2010, ma mesịa gbaa arụkwaghịm n'ọkwa ya na FNSEA. Na Machị 2014, a họpụtara ya ka ọ bụrụ onye isi obodo nke Saint-Martin-le-Beau n'isi nke ndị UMP.[1][2]

N'ọnwa Mee afọ 2014, a họpụtara Delahaye ka ọ bụrụ onye omeiwu Europe, site na nkwado nke Bruno Le Maire na Jean-François Copé bụ ndị mere mkpọsa maka Brice Hortefeux ka ọ bụrụ ya onye ibe ya.[4]

Na Jenụwarị 2020, Delahaye kwupụtara na ọ ga-agba ọsọ maka oge nke abụọ dị ka onye isi obodo nke Saint-Martin-le-Beau. Alain Schnel meriri ya na ntuli aka mbụ na Machị, na-enweta 39.03% nke votu.[2][5]

Ihe odide[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 Angélique Delahaye, une agricultrice en route pour le Parlement européen (fr). L'Obs. Archived from the original on 4 August 2021. Retrieved on 4 August 2021. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name ":0" defined multiple times with different content
  2. 2.0 2.1 2.2 Angélique Delahaye brigue un second mandat (fr). lanouvellerepublique.fr. Retrieved on 4 August 2021. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name ":1" defined multiple times with different content
  3. Promotion du 14 juillet : des personnalités agricoles récompensées - (fr-FR). Terres et Territoires (15 July 2021). Archived from the original on 4 August 2021. Retrieved on 4 August 2021.
  4. Angélique Delahaye (UMP) fait à 51 ans son entrée au Parlement européen (fr-FR). France 3 Centre-Val de Loire. Archived from the original on 4 August 2021. Retrieved on 4 August 2021.
  5. Saint-Martin-le-Beau (37270) : résultats des élections municipales 2020 - Premier tour (fr). lanouvellerepublique.fr. Retrieved on 4 August 2021.