Angel Wainaina

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Angel Wainaina

Angela "Angel" Wainaina (1983 - 28 Jenụwarị 2009) bụ onye Kenya na-eme ihe nkiri, onye na-egosi redio na onye na-eti egwu.

Ndụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Wainaina n'afọ 1983 na Kawangware, nke dị na Nairobi, Kenya.[1] O sonyeere otu klọb ihe nkiri na Kambui High School. Ọ bụ onye nke abụọ na asọmpi Miss Kenya n'afọ 2005. Ọ bụ onye na-ede uri na onye na-eti egwu n'okpuru ala. O mere Sergeant Maria na ihe ngosi telivishọn a ma ama "Cobra Squad".[2]

N'abalị 15 ọnwa Jenụwarị afọ 2007, ọ malitere ịrụ ọrụ na Ghetto Radio, dịka nwanyị mbụ MC nke Kenya.[3] Ihe ngosi ya "Chanuka Dada" bụ ihe a ma ama, ma a maara ya nke ọma maka nkwado mmekọrịta mmadụ na ibe ya. E nyere ya ihe nrite mgbasa ozi nke Young Women African Summit.

Ọnwụ[dezie | dezie ebe o si]

Wainaina nwụrụ na 28 Jenụwarị afọ 2009 na ọkụ ụlọ ahịa Nakumatt. Emere olili ya na Holy Family Cathedral na Nairobi.

Edemsibịa[dezie | dezie ebe o si]

  1. Trouw.nl, 9 February 2009: Angel Wainaina 1983–2009 (in Dutch)
  2. Daily Nation, 30 January 2009: Cobra Squad star feared dead in blaze
  3. AllAfrica.com, Nairobi's 'Glass House' Experience and Post-Election IDPs