Anne-Marie Goumba

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Anne-Marie Goumba
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịCentral African Republic Dezie
Aha ọmụmụAnne Marie Mbakondé Dezie
Aha enyereAnne-Marie Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya9 Ọktoba 1954 Dezie
Ebe ọmụmụRwanda Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaFrench language, Asụsụ Sango Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jiMember of the Pan-African Parliament, Member of the National Assembly of the Central African Republic, Member of the National Assembly of the Central African Republic Dezie
ebe agụmakwụkwọCatholic University of Central Africa Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịPatriotic Front for Progress Dezie

Anne-Marie Goumba (amụrụ ya na 9 Ọktoba nke afo 1954), bụ onye otu National Assembly nke Central Afrikan Republik na dịka onye otu Pan-Afrikan Parliament site na Central African Republic. Ọ bụ nwanyị di ya nwụrụ nke onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Central Afrika ogologo oge aha ya bụ Abel Goumba.

Mmalite ndu[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Anne-Marie Mbakondo na 9 Ọktoba n’afo 1954 na Nyanza, nke Obodo Rwanda. O bu ụzọ gụọ akwụkwọ dị elu na École Normale Supérieure na Save, Rwanda, tupu ọ gaa gụọ akwụkwọ na Université Catholique d'Afrique Centrale . O mechara rụọ ọrụ nkuzi dịka prọfesọ na Butare Faculty of Medicine n'etiti afọ 1973 na afo 1977. Mgbe ọ nọ ebe ahụ, ọ zutere Abel Goumba, onye bụkwa onye nkuzi na nsogbu ahụike ọha na eze, o mechara lụọ ya.[1]

Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị[dezie | dezie ebe o si]

Di ya bụ onye na-eme mgbanwe ndọrọ ndọrọ ọchịchị na obodo Central Afrika ogologo oge, onye guzobere ihe mechara bụrụ Patriotic Front for Progress party. Ọ kwadokwara ọrụ nke FPP, ma guzo na ntuli aka nke etiti Afrịka n'afọ 2005 ma họpụta ya dịja onye nnọchi anya mpaghara nke ise nke Bangui na pasenti 37.32 na ntuliaka nke 8 Mee. N'otu ntuli aka ahụ, di ya hapuzikwara oche ya. Mgbe a kpọchara ya aha na National Assembly nke Central Afrikan Republik, a kpọrọ ya aha dịka onye nnọchi anya Central Afrika na Pan-African Parliament.[1] N'ọnwa Jenụwarị n’ afọ 2015, o toro mbọ ndị na-eme iji chekwaa udo na Rwanda, na-ekwu na ọ bụ ezie na ọ biri na Central African Republic ruo afọ 30, ọ dịghị mgbe ọ na-echefu na ọ si Rwanda.[2] Ọ bụ onye nhazi nke otu na-abụghị nke gọọmentị Les Flamboyants, nke na-achọ igbochi ime ihe ike megide ụmụ nwanyị na ụmụaka.[3]

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 Bradshaw (2016). Historical Dictionary of the Central African Republic. Lanham, MD: Rowman & Littlefield, 312–314. ISBN 978-0-81087-991-1.  Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "dictionary" defined multiple times with different content
  2. "Rwandais de Centrafrique : Rapatriés au vu du comportement des RDF", Rwanda News, 29 January 2015. Retrieved on 1 November 2016. (in French)
  3. PRESU: les travaux connaissent une avancée (French). Journal de Bangui (25 February 2016). Retrieved on 1 November 2016.