Anne Mireille Nzouankeu

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Anne Mireille Nzouankeu
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịKameroon Dezie
Aha enyereAnne Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya20. century Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaFrench language Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ntaakụkọ Dezie

Anne Mireille Nzouankeu bụ onye nta akụkọ bi ma na-arụ ọrụ na Cameroon, nke dị n'ụsọ oké osimiri ọdịda anyanwụ nke ọbọdọ Africa.[1]

Nzouankeu bụ ónyé na-ede akwụkwọ akụkọ kwa ụbọchị nke Cameroon Le Jour, akwụkwọ akụkọ kwa afọ nke Britain The Guardian, yana ụlọ ọrụ redio Dutch Radio Netherlands Worldwide. Ọ malitere ọrụ ya na-enye aka na ndị na-ekesa akụkọ n'ịntanetị ma na-aga n'ihu na-ede màkà akwụkwọ akụkọ dị ichè ichè n'ịntanụ.[2]

Otu n'ime akụkọ ya "Cameroun: la double vie des homosexuels" (Cameroon: ndụ abụọ nke ndị na-edina ụdị onwe ha) kọwara ihe ọjọọ si na usoro iwu nke mba ya iji mee ka ndị na-eme enyi nwoke bụrụ ndị omempụ ma kpaliri arụmụka dị mkpa ma kpalie mmeghachi omume obi ọjọọ. N'ịkụ obi ike ya maka ịdọrọ uche gaa n'okwu a a machibidoro iwu, European Commission nyere Nzouankeu Lorenzo Natali Media Prize na Africa Division na Disemba 8, 2011 na Brussels, Belgium. E bịdọrọ ihe Nríte ahụ na 1992 iji "mata ma mee emume dị mma na ịkọ akụkọ gbasara nsogbu mmepe na-adịgide adịgide".[2][3] Ọ bụ otu n'ime ndị nta akụkọ iri na asaa si gburugburu ụwa ka a ga-asọpụrụ ya na ihe Nríte màkà ọrụ nta akụkọ dị ịrịba ama na isiokwu nke mmepe, ikike mmadụ na ọchịchị ónyé kwuo uche ya.[4]

Nzouankeu bi na Yaoundé, isi ọbọdọ Cameroon.[2]

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. Cameroun, journée de la femme: Anne Mireille Nzouankeu " Elle a sa place comme toutes les autres journées qui existent" (2012-03-09). Archived from the original on 2012-03-09. Retrieved on 2020-11-11.
  2. 2.0 2.1 2.2 Linking Southern Journalists: Anne's reflections | Panos London (en). Retrieved on 2020-11-11.
  3. WONG (2020-01-27). Lorenzo Natali Media Prize 2020 (en). International Cooperation and Development - European Commission. Retrieved on 2020-11-11.
  4. Press Corner: Lorenzo Natali Prize 2011 awarded (en). European Commission - European Commission (2011-12-08). Archived from the original on 2019-06-21. Retrieved on 2020-11-11.