Annette Georges

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Annette Georges
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
Aha enyereAnnette Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1957 Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie

Annette Mary Solange Georges (Amụrụ n'afọ 1957) bụ onye ọka iwu, onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Seychelles na onye isi mbụ nke Seychelles United Opposition Party.[1]

A mụrụ Annette Georges na Seychelles n'afọ 1957. Ọ tolitere n'ezinụlọ nke etinyelarị aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke mba ya. Nna ya bụ onye minista na onye otu Seychelles National Assembly na tiketi nke Seychelles Democratic Party (SDP) nke mechara ghọọ SDP-SPUD mgbe ya na Seychelles People's Unity Party (SPUP) jikọrọ aka.[1]

Ọ gụrụ akwụkwọ iwu na United Kingdom ma kpọọ ya ka ọ bụrụ onye ọka iwu n'afọ 1980. Ọrụ mbụ ya mgbe o si na United Kingdom lọta bụ ọkwa n'ọfịs Attorney General. Ọ rịgooro n'ọkwa ruo mgbe ọ ghọrọ osote onye ọka iwu ukwu. N'afọ 1985, a họpụtara ya ka ọ bụrụ onye majie.[1]

Annette Georges bụ onye guzobere Parti Seselwa, otu n'ime òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị mbụ malitere mgbe ekwupụtara Seychelles dị ka steeti nwere ọtụtụ òtù. Parti Seselwa mechara jikọta ya na òtù mmegide abụọ ọzọ iji guzobe United Opposition (UO) Party, nke ọ bụ onye na-ahụ maka akụ na ụba na onye ndú ya.[1] N'afọ 1994, Georges kwụsịrị dịka onye ndu, a họpụtakwara Wavel Ramkalawan dịka onye nọchiri ya.[2]

Georges bụ onye na-azọ ọkwa osote onye isi ala nke Seychelles National Party maka ntuli aka afọ 2001 n'afọ 2006.[3]

Ebenside[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 Secretariat (1999). Women in Politics: Voices from the Commonwealth (in en). Commonwealth Secretariat. ISBN 9780850925692.  Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name ":0" defined multiple times with different content
  2. SNP History. Seychelles National Party. Archived from the original on 2007-10-12.
  3. SNP Seychelles: Thank You Mrs Annette Georges.flv (25 January 2010). Archived from the original on 2022-01-21.