Anti-Fulani sentiment

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Anti-Fulani sentiment
sentiment
obere ụdị nkeRacism, nkwenkwe na ụkpụrụ Dezie

Echiche megidere ndị Fulani bụ iro a na-akpa ndị Fulani na Naijiria yana ịkpa oke a na-eme ha n’ihi ya. Ndị Fulani bụ agbụrụ ndị na-akwagharị akwagharị nke gbasasịrị n'ọtụtụ mba ọdịda anyanwụ Afrịka . Ndị Fulani nwere pacent 6 n'ọgụgụ nke ndị Naijiria. [1]

Iyi ọha egwu nke Islam[dezie | dezie ebe o si]

E bola ndi Fulani ebubo na ha na-akwado otu ndị Islam na-eyi ọha egwu dịka Boko Haram n'agbanyeghị na ha na-enwekwa mwakpo ndị oyi ọha egwu ahụ. Ebubo ndị a etinyela ndị otu dị iche iche na Naịjirịa dịka ndi otu Igbo nationalistnke Indigenous People of Biafra, obi siri ike ị ịgbasa okwu megidere gbasara ndị Fulani. [2]

Esemokwu ndị na-achị ehi na ndị ọrụ ugbo[dezie | dezie ebe o si]

Esemokwu nke ndị Herder – ọrụ ugbo na Naịjirịa bụ ọtụtụ usoro esemokwu dị n'etiti ndị Fulani na-achị ehi na ndị ọrụ ugbo na-abụghị Fulani maka ala, nke na-ebute ọgbaghara mgbe ụfọdụ. Ị ma akaa ebe ọ metụtara ndị Fulani na-achị ehi emeela ka a kọsiwa akụkọ na-emejọ ndị Fulani na Naịjirịa ike site na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na ụlọ ọrụ akụkọ. Na nzaghachi maka esemokwu a, ụfọdụ steeti dị na Naịjirịa atụpụtala ma ọ bụ wepụta iwu ka akwụsị ndị Fulani na-achị ehi ibubata ehi ha maka ịta nri. E boro iwu ndị a ebubo dịka ịkpa ókè megide ndị Fulani nke na-edozighị nsogbu ahụ. [3] Otu nkwado ndị Fulani Tabital Pulaaku International e bola onye omebe iwu Adamawa bụ Binos Dauda Yaroe ebubo okwu ịkpọasị mgbe ọ tara ndị Fulani na-achị ehi ụta na ha jiri ngwa ọgụ Naijiria a tọọrọ mmadu. [4]

Ntigbu[dezie | dezie ebe o si]

Ọgbaghara nke ndị Fulani na-achị ehi na ndị ọrụ ugbo ebutela igbu ọchụ sitere agbụrụ megide ndị Fulani. Na 1 Febuwarị 2018, mmadụ asaa ndị Fulani nọ na Gboko, Benue State, Naijiria ka eboro ebubo na ha mere ihe ọjọọ, nke na ndị mmadụ iwe ji tọọrọ ha n'ụgbọ ala njem ọha were kugbue ha. [5] Ka a wakpochara obodo ndị Berom na-akọ ugbo na Plateau Steeti na 23-24 June 2018, ndị ntorobịa Berom na Plateau Steeti gbochiri okporo ụzọ ma gbuchapụ ndi mmadụ ndị a na-enyo enyo na ha bụ ndị Fulani. [5] Ndị ìgwè mmadụ ndi iwe nọ na Edo Steeti gburu mmadụ ise bụ ndị eboro na ha bụ ndị Fulani na-achị ehi nị nke bu egbe. [6]

Fulani redio[dezie | dezie ebe o si]

Ndị isi na mpaghara ndịda na Middle Belt nke Nigeria ekwupụtala mmegide megide atụmatụ sitere n'aka gọọmentị etiti ka e guzobe ụlọ ọrụ redio na-asụ Fulani, na-ekwu na ọ ga-akwalite mgbasa ozi gbasara igbu ndị mmadụ na-abụghị Fulani, na-atụnyere mgbuchapụ Rwandan. [7]

Online[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 2016, n'ịzaghachi na nrigoro nke ọgbaghara nke ndị Fulani na-achị ehi, hashtag #fulaniherdsmen wuru n'etiti ndi mgbasa ozi ọha nke Naijiria, ma kpalie okwu mgbochi Fulani. [8] Mgbasa ozi ịntanetịna akụkọ adịgboroja gosiri ndị Fulani na-achị ehi dịka ndị ogbu mmadụ na-ịṅụ ọbara na-agụ agụ ma ọ bụ ndị na-eyi ọha egwu, akpalitere echiche megidere ndị Fulani. [9] Bishọp Katọlik Naịjirịa bụ Matthew Hassan Kukah a kpọla oku ka akwụsị "okwu ịkpọasị" na ịntanetị megidere ndị Fulani na-achị ehi. [10]

Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. Nigeria country profile at CIA's The World Factbook: "Fulani 6%" out of a population of 219 million (2021 estimate).
  2. Nigeria’s Diverse Security Threats.
  3. "Nigeria’s Anti-Grazing Laws Fail to Address the Root Causes of Rural Conflict", World Politics Review, March 16, 2018.
  4. Onimisi Alao, Yola. "Group fumes as tension over Sen Yaroe’s ‘anti-Fulani’ comment persists", The Nation, March 1, 2021.
  5. 5.0 5.1 Stopping Nigeria’s Spiralling Farmer-Herder Violence. Crisis Group (July 26, 2018).
  6. Disturbing video: Angry mob lynches Fulani herdsmen caught with firearms in Edo [Graphic – TheNewsGuru].
  7. Southern And Middle Belt Leaders Reject Fulani Radio Station Funded By Federal Govt.. Sahara Reporters (May 23, 2019).
  8. Onimisi Alao, Yola. "Making sense of Nigeria's Fulani-farmer conflict", BBC, 5 May 2016.
  9. "Fake news and Nigeria's herder crisis", BBC, 29 June 2018.
  10. "Nigeria: Bishop calls for end to hate speech against Fulani herdsmen", Independent Catholic News, 1 August 2019.