Antoinette Montaigne

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

 

Antoinette Montaigne
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịFrance, Central African Republic Dezie
Aha enyereAntoinette Dezie
aha ezinụlọ yaMontaigne Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya18 Jenụwarị 1965 Dezie
Ebe ọmụmụBangassou Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaFrench language, Asụsụ Sango Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jiMinister of Communication, Citizenship, Dialogue and National Reconciliation Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịUnion for a Popular Movement Dezie

Antoinette Montaigne bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị nwere ụmụ amaala France na Central Africa.[1] Ọ bụ onye ọka iwu gbasiri ụkwụ ike na ihe gbasara ikike ụmụ aka . ọ rụrụ ọrụ dị ka onye kansụl obodo na mpụga Paris na France. N'afọ 2014, a kpọrọ Montaigne ka ọ gaa Central African Republic ka ọ bụrụ Minista nke nkwukọrịta, Civics,mkparitaúka nakwa onye mkpezi na mkpedo na gọọmentị etiti. Ọ nọgidere n'ebe ahụ mgbe ọ hapụrụ gọọmentị ma na-elekọta ugbu a Central African Peace Academy.

France[dezie | dezie ebe o si]

Antoinette Montaigne bụ onye ọka iwu na-ahụ maka ikike ụmụaka na ụmụakan,alụ agha .[2] O nwere nzere doctorate na iwu mpụ ụmụaka na Mahadum Panthéon-Assas nke Paris ma na-arụ ọrụ iwu na France.[3][2]

Montaigne biri na Bussy-Saint-Georges, Seine-et-Marne, site na afọ 2001 ruo afọ 2014 .Site na Machị 2008 ruo 2014 ọ bụ onye kansụl obodo Union for a Popular Movement na-ejide ọfịs maka iwu na mmekọrịta mmadụ na ibe ya na imekọ ihe ọnụ.[2][1] Onye isi obodo Bussy-Saint-Georges kọwara ya dị ka "nwanyi na-alụ ọgụ ma nwee obi ike".[2] Montaigne bụ onye isi oche nke Council of Central Africans Abroad ma guzobe òtù abụọ iji kwado ụmụ amaala ụ gbọinyinya na mba ofesi, Zagaro Montaigne na DIPE Coaching and Consulting.[2] N'ọnwa Febụwarị afọ 2013, ọ tụrụ aro ka kansụl ahụ mee mkpebi maka ịdị n'otu na ndị agha obodo nke Central African Republic (2012-2014).[2]

Etiti mba Afrika[dezie | dezie ebe o si]

Montaigne bụ ezigbo enyị onyeisiaka na central Afrịka republican afọ 2014 ruo afọ 2016.(CAR) Catherine Samba-Panza.[2] Na mbido afọ 2014, praịm minista na-anọchi anya, André Nzapayeké, kpọrọ ya ka ọ laghachi na CAR iji were nhọpụta dị ka Minista nke nkwukọrịta, obodo, mkparịta ụka, na nkwekọrịta mba na gọọmentị ya. Montaigne nabatara ma si Paris gaa Bangui, isi obodo CAR, na 28 Jenụwarị - ọ ka bụ onye kansụl obodo n'oge ahụ.[2] N'abalị iri atọ n'ọnwa Machị afọ 2014, ọ bịanyere aka n'akwụkwọ mkpesa nye ndị niile nọ na Central Africa ka ha tinye ngwá agha ha ma banye na mkparịta ụka.[4] Iji gosipụta mmụọ nke imekọ ihe ọnụ, Montaigne gara ekpere na ụlọ alakụba dị na mpaghara ndị Alakụba nke Bangui.[5] Ọ gara Ivory Coast n'ọnwa Ọktoba n'afọ 2016 iji mụta banyere ihe nlereanya ha nke ime udo mgbe Agha Obodo nke Abụọ nke Ivory Coast gasịrị.[6]

Montaigne hapụrụ ọkwa minista ya na ngwụcha Ọktọba, mana ọ nọgidere dị ka onye ndụmọdụ onye isi ala.[3] O kwuru maka ọrụ ụmụ nwanyị na enye ọha obodo na mgbakõ Kansụl Gabon na France na Gabonese Embassy, Paris na Mee 2016.[7] Montaign bụzi onye isi nke CAR Peace Academy.[8]

Nrụtụ aka[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 "Centrafrique: qui sont les figures importantes du nouveau gouvernement?", Jeune Afrique, 28 January 2014. Retrieved on 14 November 2017. (in fr-FR) Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "jeune" defined multiple times with different content
  2. 2.0 2.1 2.2 2.3 2.4 2.5 2.6 2.7 "Conseillère municipale en Seine-et-Marne, elle devient ministre en Centrafrique", Figaro, 29 January 2014. Retrieved on 14 November 2017. (in fr-FR) Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "fig" defined multiple times with different content
  3. 3.0 3.1 Anderson. "The Mission", The New Yorker, 13 October 2014. Retrieved on 14 November 2017. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "ny" defined multiple times with different content
  4. "Appel au dialogue national et au dépôt des armes", Opinion Internationale, 1 April 2014. Retrieved on 14 November 2017. (in fr-FR)
  5. "RCA: fraternisation à la grande mosquée de Bangui – RFI", RFI Afrique, 29 March 2014. Retrieved on 14 November 2017. (in fr-FR)
  6. "Côte d'Ivoire/ La République centrafricaine s'inspire du modèle ivoirien de la réconciliation", Agence Ivoirienne de Presse, 22 September 2016. Retrieved on 14 November 2017. (in en)
  7. "La femme gabonaise célébrée ce samedi à Paris par le CGF", Info241, 5 May 2016. Retrieved on 14 November 2017. (in fr-FR)
  8. "Antoinette Montaigne : " La Centrafrique a besoin rapidement de la commission vérité, justice, réparation, réconciliation pour reconstruire le vivre ensemble. "", www.opinion-internationale.com, 22 September 2016. Retrieved on 14 November 2017. (in fr-FR)