Jump to content

Antone Smith

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Àtụ:Infobox NFL biographyAntone Smith (amụrụ na Septemba 17, 1985) bụ onye bọọlụ Amerịka na-agba nnọnaazụ. Ọ gbaara Pahokee bọọlụ ụlọ akwụkwọ sekọndrị. A na-ewere Smith dị ka onye na-agba nnọnaazụ na All America nọ n'ógó kpakpando ise ma kpọọ ya Mr Florida. Ọ gara n'ihu gbaa bọọlụ kọleji na Florida State. Ndị Detroit Lions denyere aha Smith dị ka onye na-enweghị onye ọrụ n'efu n'afọ 2009. Ọ bụkwarị onye òtù Minnesota Vikings, Houston Texans, Atlanta Falcons, Chicago Bears, New York Jets, na Tampa Bay Buccaneers.

Afọ ndị mbụ ya[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ ikpeazụ ya n'ụlọ akwụkwọ Pahokee High School, Smith duuru Pahokee gaa n'asọmpi bọọlụ steeti wee gbaa ọsọ ruru yaadị narị abụọ na iri asaa na isii na touchdown atọ n'egwuregwu mmeri, jiri yaadị puku abụọ , narị asatọ na iri na anọ na touchdown dị iri anọ na anọ na-emeri n'oge ahụ. N'ime afọ anọ ndị ahụ ọ na-agba bọọlụ n'ụlọ akwụkwọ sekọndrị, ọ chịkọtara ihe karịrị yaadị dị puku isii.

Rivals.com họpụtara Smith dị ka onye na-agba bọọlụ nke iri abụọ na ise n'ozuzu. Ọ bụ onye Parade All-American, onye kacha gbaa bọọlụ nke Afọ nke Palm Beach County , onye egwuregwu Old Spice National nke Afọ. A họpụtara ya dị ka Mr. Football maka steeti Florida. A họpụtara Smith dị ka MVP nke Nike Camp ma mgbe ọ nọ ebe ahụ, o dekọrọ oge ọsọ kacha dị mkpụmkpụ bụ kpọmkpọm 4.25 maka ọsọ yaadị iri anọ. Ọ gbara bọọlụ na CaliFlorida Bowl a ma kpọọ ya MVP.

Smith nọkwa n'òtù egwuregwu ndị ọsọ nke ụlọ akwụkwọ ahụ, ebe ọ na-asọ mpi dị ka onye na-agba ọsọ. Na asọmpi 2003 FHSAA 2A Region 4 Championships, ọ meriri ma ọsọ dash nke otu narị mita na nke mita narị abụọ n'ime oge kachasị mma nke bụ kpọmkpọm 10.63 ya na kpọmkpọm 21.71.[1] Ọ nọrọkwa otu akụkụ n'oge opupu ihe ubi na òtù ọgbọsọ nke steeti Florida. O gbara onye nke ise na ọsọ dash dị mita iri isii n'asọmmpi 2006 ACC Championships, n'ime oge kachasị mma nke bụ kpọmkpọm 6.83.[2]

Smith bụ onye elekwasịrị anya na onye na-akọ akụkọ nke "The Muck Bowl," ihe ngosi nke onwe ya.

Ọrụ Ya na kọleji[dezie | dezie ebe o si]

N'oge afọ ndị mbụ ya na steeti Florida na 2005, Smith hụrụ ọrụ na egwuregwu itoolu, na-esote Lorenzo Booker na Leon Washington n'azụ. O buuru bọọlụ ugboro iri atọ na isii maka yaadị 188 (5.2 avg) na touchdown atọ, ma bụkwara onye nke atọ na òtù n'azụ Booker na Washington na carries, rushing yards, na yards kwa egwuregwu. Na mmeri 55-24 nke Florida State meriri Mahadum Duke, Smith gbara ọsọ ugboro asaa maka oge dị elu 76 yards na touchdowns abụọ, nke abụọ n'ime ha bịara na oge dị ogologo 45-yard ebe ọ gbapụrụ ọtụtụ ndị na-agbachitere Duke.

Dị ka onye okenye, Smith duziri ACC na touchdowns jiri 15, na yaadị 792 na-agba ọsọ n'elu 177 carries (maka nkezi 4.5 yd).[3][4]

Smith mechiri ọrụ ya ka o nwetara 2,253 na-agba ọsọ na 26 touchdowns.[5]

Ọrụ Ya Dika ọkachamara[dezie | dezie ebe o si]

Tupu edere ya[dezie | dezie ebe o si]

Àtụ:Nfl predraft

Detroit Lions[dezie | dezie ebe o si]

Mgbe ọ gachara na 2009 NFL Draft, Smith gara Detroit Lions minicamp na mbido Mee maka nnwale. Lions bịanyere aka ka o soro ha dị ka Onye na-enweghị ego na Mee 8, 2009, e wee hapụ ya na Julaị 27.

Minnesota Vikings[dezie | dezie ebe o si]

Ndị Minnesota Vikings bịanyere Smith aka ka o soro ha n'ụbọchị nke ise n'ọnwa Ọgọstụ n'afọ 2009, mgbe ndị òtù ahụ hapụrụ onye na-anabata Aundrae Allison ma ndị otu ahụ tọhapụrụ ya n'ụbọchị mbụ n'ọnwa itoolu.

Houston Texans[dezie | dezie ebe o si]

Ndị Houston Texans practice squad bịanyeere Smith aka isoro ha na Septemba 24.

Atlanta Falcons[dezie | dezie ebe o si]

Ndị òtù Atlanta Falcons' practice squad bịanyeere Smith aka isoro ha n'ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa Ọktoba n'afọ 2009, mgbe ndị òtù ahụ hapụchara onye mgbachitere D. J. Shockley. Mgbe nkwekọrịta ya gwụsịrị mgbe oge ahụ gasịrị, Falcons bịanyere Smith aka ọzọ na nkwekọrịta n'ọdịnihu na Jenụwarị 4, 2010. A maara Smith nke ọma dị ka onye egwuregwu pụrụ iche mgbe ọ nọ na Atlanta, mana o mere nke ọma na carries dị ole na ole. N'izu nke iri na abụọ n'afọ 2013, Smith gbara ọsọ maka mita dị iri asatọ na asatọ na otu touchdown megide Tampa Bay Buccaneers. O gosikwara onwe ya n'izu nke iri na atọ mgbe ọ gbara ọsọ maka ihe karịrị yaadị iri ise na otu touchdown megide Buffalo Bills.

N'ime izu mbụ nke oge 2014 megide New Orleans Saints, Smith nwere mmetụ atọ maka ngụkọta dị yaadị iri isii na otu, otu n'ime ha bụ nnabata touchdown dị yaadị iri ise na anọ sitere na QB Matt Ryan.[6] N'izu nke iri na otu megide Carolina Panthers, Smith gbajiri ụkwụ ya na-ekpuchi punt, nke ga-eme ka ọ ghara iso n'egwuregwu ndị ọzọ n'ime afọ ahụ fọdụrụnụ.

Na Machị 10, 2015, Smith bịanyegharịrị aka n'akwụkwọ ịgba na Falcons.[7] Na Septemba 5, 2015, ndị Falcons tọhapụrụ Smith na nkwekọrịta idu-ụlọ maka mmerụ ahụ o merụrụ.[8]

Chicago Bears[dezie | dezie ebe o si]

N'October 12, 2015, Smith bịanyere aka ịgba na òtù Chicago Bears. Na Disemba 23, 2015, ndị Bears hapụrụ Smith ọ pụọ.

New York Jets[dezie | dezie ebe o si]

Ndị New York Jets bịanyere aka ka Smith soro ha n'abalị iri na isii n'ọnwa Ọgọstụ afọ 2016.[9] Na Septemba 3, 2016, ndị Jets tọhapụrụ ya.[10]

Tampa Bay Buccaneers[dezie | dezie ebe o si]

N'abalị iri na asaa n'ọnwa Ọktoba n'afọ 2016, ndị Buccaneers bịanyere aka ka Smith soro ha.[11] E debere ya na ndị merụrụ ahụ na Nọvemba 7, 2016, na mmerụ ahụ n'ikpere.[12]

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. FHSAA 2A Region 4 – Boys (Raw).
  2. ACC Championships – Complete Results.
  3. Florida State Seminoles Official Athletic Site. Florida State Seminoles (December 3, 2018).
  4. Antone Smith College Stats - College Football at Sports-Reference.com. College Football at Sports-Reference.com.
  5. Antone Smith. ESPN.com.
  6. Antone Smith. NFL.com.
  7. McClure (March 10, 2015). Brooks Reed, Justin Durant to Atlanta. ESPN.com. ESPN. Retrieved on March 10, 2015.
  8. Falcons Reach 52-Man Roster. AtlantaFalcons.com (September 5, 2015). Archived from the original on September 14, 2015. Retrieved on September 12, 2015.
  9. Allen (August 16, 2016). Jets sign RB Antone Smith, Place Pierce on IR. NewYorkJets.com. Archived from the original on August 17, 2016. Retrieved on August 16, 2016.
  10. Lange (September 3, 2016). Jets Release 18 Players Ahead of Deadline. NewYorkJets.com. Archived from the original on September 7, 2017.
  11. Smith, Scott (October 17, 2016). Louis Murphy Returns to the Field. Buccaneers.com. Archived from the original on November 17, 2017.
  12. Hansbrough Promoted as Two Go to IR. Buccaneers.com (November 7, 2016). Archived from the original on December 20, 2016.

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]