Jump to content

Arthur Verney

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Arthur Verney
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịObodoézè Nà Ofú Dezie
Aha enyereArthur Dezie
ụbọchị ọmụmụ ya1943 Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya2013 Dezie

Arthur Verney (1943-2013) bụ onye ntị chiri si mba Britain , awere nkwarụ na onye kwuchite ọnụ n ikike ndị nwereahụ. nkwarụ -eme mkpọsa

Mmalite ndụ na agụmakwụkwọ Ya[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Verney na Birmingham. O nwere ọrịa spina bifida. Dịka nwa na-anụ ihe nke nne na nna ya chiri ntị (CODA), asụsụ mbụ ya ọ mụtara bụ British Sign Language . [1]

Mgbe ọ gachara ụlọ akwụkwọ Moseley Grammar School, Verney nwetara ọzụzụ dịka onye ọrụ ọdịmma ndị ntị chiri. Ọ gụrụ Social Work na Liverpool Polytechnic (1964-66). N'afọ 1970, Verney nwetara ọkwa dị ka onye nduzi mbụ nke ọrụ mmekọrịta mmadụ na ibe ya na ndị ntị chiri na North London Polytechnic na n'afọ 1975 ọ ghọrọ onye ọrụ ọrụ mmekọrịta mmadụ na ibe ya n'ụlọ ọrụ Welsh Office.[1]

Onye na-ahụ maka ikwuchite ọnụ ndị ogbi na ndị nwere nkwarụ ahụ[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 1980, Verney ghọrọ odeakwụkwọ ukwu na British Deaf Association (BDA). [2] N'oge ahụ, ọ bụ ụlọ ọrụ ebere nke ndị na-anụ ihe nọ n'isi ya. Verney bụ onye hụrụ maka ịgbanwe ya ka ọ bụrụ nzukọ nke ndị ntị chiri na-eduzi na maka akụkụ mkpọsa nke njikọ ahụ. N'afọ 1983, a họpụtara Jock Young, onye isi oche mbụ ntị chiri nke òtù ahụ. [3]

Verney nyere aka guzobe usoro ọzụzụ na Mahadum Durham maka ndị ntị chiri ka ha bụrụ ndị nkuzi asụsụ ndị ogbi, na n'afọ 1982 o guzobere ihe ga-aghọ Izu Ụka maka asụsụ ndị ogbi (asụsụ ógwè aka), iji kwalite mmata na ojiji nke asụsụ ahụ na Britain. N'afọ 1989, BDA nwere ihe karịrị otu ǹdè pound na ego mbụ ya, nke ahụ bụkwa n'ihi ọrụ ya.[1]

Verney bụụrụ otu n'ime ndị nkwalite, ya na Jock Young, nke European Union of the Deaf, nke a malitere na 1985 dị ka European Community Regional Secretariat, na-ejikọta

òtdị iche iche ùke n ndị ntị chiri si Germany, Netherlands na France iji krọụọ ọrụ ọnụ iji nye ndị ntị chiri ikna e Euro gbaa gburugburupe. Verney ghọrọ onye isi EUD site'afọ a 1989 ruo 1992. O nyekwara aka guzobe European Disability Forum (EDF). [4]

N'afọ 1992, mgbe ọ tinyesịrị akwụkwọ maka ịnata enyemaka ego nke o mechara nweta, Verney ghọrọ onye ọrụ mpaghara Europe nke Disabled People's International, nke ya na onye na-eme mkpọsa maka ikwuchite ọnụ ndị nwere nkwarụ ahụ bụ Rachel Hurst na-arụkọ ọrụ.[5] Otu n'ime ihe ndị ọ rụzuru bụ nhazi nke Ọgbakọ Ndị omeiwu nwere nkwarụ (December 1993), ebe mmadụ narị anọ na iri anọ nwere nkwarụ weere ọnọdụ ndị MEP ma nye European Commission akụkọ ọrụ n'onwe ha, o wee hazie mmemme ọmụmụ ihe na Europe gbaa gburugburu na ikike ruuru ndị mmadụ, Bioethics, ibi ndụ onwe onye na nnweta ihe.[6] O sonyekwara na mkpọsa Campaign for Independent Living emere. [7] Ọrịa manyere ya ịpụ n'ọrụ n'afọ 2002.

Ndụ onwe onye[dezie | dezie ebe o si]

Ọ lụrụ Ann Hilder n'afọ 1968, ha abụọ wee mụta nwa nwanyị. Ha gbara alụkwaghịm n'afọ 1990. Verney nwụrụ na 24 Septemba 2013. [1]

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 "Arthur Verney obituary", The Guardian, 18 November 2013. (in en) Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "guardian" defined multiple times with different content
  2. Brien. "Arthur Verney obituary", The Guardian, 2013-11-18. Retrieved on 2024-05-23. (in en-GB)
  3. Ladd (2003). Understanding deaf culture : in search of deafhood. Clevedon, England: Multilingual Matters. ISBN 1-85359-545-4. 
  4. "Passing Away of Arthur Verney", European Union of the Deaf. (in en)
  5. Wilkinson (2009). Defying disability : the lives and legacies of nine disabled leaders. London: Jessica Kingsley Publishers. ISBN 978-1-84310-415-5. 
  6. DPI Memory of past leaders. www.dpi-europe.org.
  7. EU programmes with relevance to persons with disabilities | Independent Living Institute (en). www.independentliving.org.

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]