Asụsụ Aka

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Aka, nke a makwaara dị ka Yaka ma ọ bụ Beka, bụ asụsụ Bantu a na-asụ na Central Afrika Republic na Republic of kongo, n'akụkụ Osimiri Ubangi nke kewara mba abụọ ahụ.

Ndị Aka na-asụ asụsụ Aka, ndị pygmy nwere njikọ chiri anya na ndị na-asụrụ Ubangian Baka nke Cameroon, Kongo na Gabọn. N'ozuzu, a maara ndị a dị ka ndị Mbenga (Bambenga) ma ọ bụ kwa nụ Binga (Babinga), nke ikpeazụ bụ mkparị.

Ndi a ma ama, Aka na asu asụsụ Baka na-ekekorita okwu, karịsịa gbasara akụ na ụba ọhịa pụrụ iche, dị ka okwu maka osisi ndị a na-eri eri, osisi ọgwụ na nchịkọta mmanụ aṅụ. Nke a so na pasent iri atọ (30%) nke Aka nke na-abụghị Bantu na pasent iri atọ (30%) nke Baka nke na-adịghị Ubangian ma bụrụ ihe fọdụrụ n'asụsụ ndị nna nna Western Pygmy (Mbenga ma ọ bụ "Baaka") nke na-apụ n'anya.[1] Otú ọ dị, ọ ga-ekwe omume na Aka gbanwere gaa Bantu site n'asụsụ Ubangian metụtara Baka, n'ọnọdụ ahụ, ọnọdụ ahụ na-ebelata na otu agbụrụ na-anabata n'oké ọhịa na okwu pụrụ iche. Enweghị ihe akaebe maka njikọ asụsụ sara mbara na nke ọ bụla n'ime ndị Pygmy ndị ọzọ.[2]

Ndị Aka na-akpọ onwe ha Mraka n'otu na Beka n'ọtụtụ. Ndịa na asụ asụsụ ha na-iji mkpụrụedemede dị iche iche: Mò-Áka, Moyaka, Bayaka, Yaga, Bayaga, Gbayaka, Biaka, Beká, Yakwa, Yakpa, Yakpwa, Nyoyaka. A maara Aka ọdịda anyanwụ dị ka Benzele (Mbenzélé, Babenzélé, Bambenzele, Ba-Benjelle), mara kwa Aka ọwụwa anyanwụ dị ka Sese (Basese). Ndị a nwere ike ịbụ ire okwu dị iche iche; Nzari nwere ike ịbụ ọzọ.

Pygmies nke ugwu Gabọn kpọrọ Mikaya na Luma doro anya na ha bụ Aka ma ọ bụ na-asụ asụsụ nke ya na Aka nwere oyiri.

Ọmụmụ ụdaolu[dezie | dezie ebe o si]

Mkpụrụ okwu[dezie | dezie ebe o si]

Okwu ndị pụrụ iche nke oké ọhịa[dezie | dezie ebe o si]

Akwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

Serge Bahuchet (2012): "Asụsụ na-agbanwe agbanwe, na-anọgide na Pygmy". Human Biology: Mpịkọta nke 84: Mbipụta nke 1, Isiokwu nke 9.

Ihe odide[dezie | dezie ebe o si]

  1. Serge Bahuchet, 1993, History of the inhabitants of the central African rain forest: perspectives from comparative linguistics. In C.M. Hladik, ed., Tropical forests, people, and food: Biocultural interactions and applications to development. Paris: Unesco/Parthenon.
  2. Blench (in press)

Àtụ:Languages of the Central African RepublicÀtụ:Languages of the Republic of the Congo