Asụsụ Zaramo

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

   

Zaramo
Native to Tanzania
Region Pwani Region
Ethnicity 657,000 (2000)[1]
Native speakers
("few" cited 1991)[1]
Latin
Language codes
ISO 639-3 zaj
Glottolog zara1247
G.33[2]
ELP Zaramo

Zaramo bụ asụsụ Niger-Congo, bụbukwa asụsụ bụ isi nke ndị Zaramo nke ọwụwa anyanwụ Tanzania. A makwaara Zaramo dị ka Zalamo, Kizaramo, Dzalamo, Zaramu, Saramo na, Myagatwa. Asụsụ ahụ nọ n'ihe ize ndụ. Ndị agbụrụ nke ndị Zaramo ruru ihe dị ka 200,000, ma enwere naanị ndị agadi ole n'ole fọdụrụ.[3]

Ndị na-asụ asụsụ a dịkarịrị n'obodo nta ndị gbara obodo Dar es Salaam gburugburu. A na-eche na a n;enyefe Zaramo site na nne na nne na ụmụ n'ime obodo ndị a, ebe ọ ka nọ n'ihe ize ndụ dị egwu n'obodo ahụ.[4]

E nwere nsụgharị ole na ole nke asụsụ ahụ dị ma e wezụga nsụgharị ole na ise nke ndị na-asụ asụsụ ahụ, na mbipụta nke Agba Ọhụrụ site n'afọ 1975.

Nchịkọta[dezie | dezie ebe o si]

Zaramo nwere njikọ mkpụrụ ndụ ihe nketa n'ezinụlọ asụsụ Niger-Congo. A n'ekewa ya n'okpuru ezinụlọ Atlantic-Congo, Volta-Congo. (G.33)[5]

Akụkọ ihe mere eme[dezie | dezie ebe o si]

Zaramo bụ asụsụ gọọmentị nke agbụrụ Bantu dị n'ụsọ oké osimiri gbara isi obodo Tanzania, Dar es Salaam gburugburu. Ihe akaebe asụsụ n'akwado echiche na Zaramo sitere n'agbụrụ Luguru. Mbugharị nke ndị Zaramo na-aga n'ebe ọwụwa anyanwụ site n'ebe mbụ ha nọ na Tanzania abụwo isi iyi nke obere mgbanwe na asụsụ ọdịbendị ha.

Ndị Zaramo dị ka a maara ha taa bụ ndị agbụrụ ndị si na Kutu nakwa Luguru kwabata n'ihe dị ka afọ 1700. A kwadoro nna nna ha na Luguru, n'ihi na ha nwere otu asụsụ ahụ na naanị obere ọdịiche dị iche iche. Asụsụ nke Zaramo na ndị nke Jutu, Luguru, Kwere, nakwa Kami na-aghọta. Ọtụtụ ndị Zaramo nke taa họọrọ ịsụ asụsụ nke Tanzania.[6]

Ọ bụ ezie na ọnụ ọgụgụ agbụrụ nke ndị Zaramo ruru ihe dị ka 200,000, taa enwere naanị ndị agadi ole n'ole na-asụ asụsụ Zaramo. Ọtụtụ ndị Zaramo na-asụ Swahili dị ka asụsụ mbụ ha taa ma nabata aha Swahili-Arabic. Ha na-akwado Swahili karịa asụsụ ha nọ n'ihe ize ndụ maka ojiji ya na nkwurịta okwu na azụmahịa.

Ebe a na-ekesa ya[dezie | dezie ebe o si]

Ọnọdụ gọọmentị[dezie | dezie ebe o si]

Zaramo abụghị asụsụ gọọmentị nke mba m'ọbụ mpaghara ọ bụla. Ka ọ dị ugbu a, naanị ebe Zaramo ka dị bụ na mpaghara Pwani nke ọwụwa anyanwụ Tanzania. Mpaghara a dị n'etiti obodo abụọ - Bagamoyo na Dar es Salaam. Ime obodo, mpaghara dị n'ụsọ oké osimiri bụ ebe obibi nke ndị Zaramo bụ ndị bụ naanị agbụrụ na-asụ asụsụ ahụ.

Olumba dị iche iche[dezie | dezie ebe o si]

Enweghị olumba a maara nke Zaramo. Ọ n'ekerịta okwu yiri ya: 68% na Kutu [kdc], 65% na Kami [kcu], 61% na Kwere [cwe] nakwa Doe [doe].[5] Njikọ a gosipụtara site na mmekọrịta akụkọ ihe mere eme n'etiti agbụrụ ndị ahụ.

Ihe Nlereanya[dezie | dezie ebe o si]

E nwere ihe atụ ole na ole nke asụsụ Zaramo. Otu onye na-asụ asụsụ obodo nyere onye dere Short Specimens of the Vocabularies of Three Unpublished African Languages: Gindo, Zaramo, na Angazidja ndepụta nke okwu n'ahịrịokwu.[7]

Okwu Bekee ma ọ bụ ahịrịokwu Nsụgharị Zaramo
Basket Mgel
Oche Kigoda
Enyi Mbwiga
Ụlọ Ng'anda
Obodo Kayi
Amaghị m Sitangile
Gịnị bụ aha gị? Tagwa lako nani?

Usoro ide ihe[dezie | dezie ebe o si]

Asụsụ Zaramo n'eji mkpụrụ edemede Latin maka usoro edemede ya.[8] Ihe odide Latin bụ usoro ederede a n'ejikarị eme ihe n'ụwa. Asụsụ ụfọdụ gbanwere mkpụrụ akwụkwọ site na mgbakwunye nke mkpụrụ edemede ọhụrụ dịka Zaramo, na asụsụ ndị ọzọ sitere na akwụkwọ edemede Niger-Congro.

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

Edensibịa[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 Zaramo at Ethnologue (18th ed., 2015) (subscription required)
  2. Jouni Filip Maho, 2009. New Updated Guthrie List Online
  3. Did you know Zaramo is critically endangered? (en). Endangered Languages. Retrieved on 2017-04-07.
  4. OLAC resources in and about the Zaramo language. www.language-archives.org. Retrieved on 2017-05-01.
  5. 5.0 5.1 "Zaramo", Ethnologue. Retrieved on 2017-05-01. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "Zaramo" defined multiple times with different content
  6. Zaramo - Dictionary definition of Zaramo | Encyclopedia.com: FREE online dictionary (en). www.encyclopedia.com. Retrieved on 2017-05-01.
  7. Steere (1859-01-01). Short Specimens of the Vocabularies of Three Unpublished African Languages: Gindo, Zaramo, and Angazidja (in en). C. Cull. 
  8. ScriptSource - Latin. scriptsource.org. Retrieved on 2017-05-01.

Àtụ:Languages of Tanzania

Akwụkwọ Nsọ[dezie | dezie ebe o si]

Àtụ:Narrow Bantu languages