Associated Aviation

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

 

Associated Aviation
airline
Oge/afọ mmalite1996 Dezie
mba/obodoNaijiria Dezie
dị na ngalaba nhazi mpagharaIkeja Dezie
ọdụ ụgbọ eluMurtala Muhammed International Airport Dezie
ọdịdị isi ụlọ ọrụIkeja Dezie
dissolved, abolished or demolished date2019 Dezie
webụsaịtịhttp://www.flyassociated.com/ Dezie
ICAO airline designatorSCD Dezie

Associated Aviation bụ ụlọ ọrụ ụgbọ elu nke dị na Ikeja, Lagos State, Nigeria. E guzobere ya n'afọ 1996 ma na-arụ ọrụ ịbụ ndị ndị njem nakwa ịbụ ibu n'ime Naịjirịa na mpaghara ọdịda anyanwụ Africa. Isi ụlọ ọrụ ya bụ Murtala Mohammed International Airport, Lagos.[1] Ka ọ na-erule June 2019, ọ naghịzi arụ ọrụ.[1]

Akụkọ ihe mere eme[dezie | dezie ebe o si]

Gọọmentị Naịjirịa setịpụrụ oge a kara aka n'April 30, 2007 maka ụlọ ọrụ ụgbọ elu niile na-arụ ọrụ na mba ahụ iji dozigharia ụlọọrụ ha ma ọ bụ ha kwụsị ọrụ, na mgbalị iji hụ na ọrụ na nchekwa ka mma. Ụlọ ọrụ ụgbọelu ahụ mezuru ụkpụrụ nke Nigerian Civil Aviation Authority (NCAA) n'ihe gbasara ndozighari ma debanye aha ya maka ọrụ. N'ọnwa Julaị afọ 2008, e rere ụlọ ọrụ ahụ nye otu ndị na-etinye ego bụ ndị malitere nnukwu mmụba ụzọ na nnweta ụgbọ elu ọhụrụ site na Embraer.

Ebe Ndị ọ Na-aga[dezie | dezie ebe o si]

Associated Aviation jere ozi n'ebe ndị a ka ọ na-erule Jenụwarị 2009:

  • Abuja
  • Benin
  • Calabar
  • Ibadan
  • Jedda
  • Lagos
  • Makurdi

Ụgbọ[dezie | dezie ebe o si]

Ụgbọ elu ụlọọrụ Associated Aviation gụnyere ụgbọ elu ndị a (na Jụn 2017):[2]

  • 1 Embraer EMB 120 Brasilia
  • 1 Embraer ERJ 145

Ihe mberede[dezie | dezie ebe o si]

EMB 120 Associated Aviation 5N-BJY.
  • N'abalị atọ n'ọnwa Ọktoba n'afọ 2013, ụgbọ elu Associated Aviation Flight 361 nke Embraer EMB 120 Brasilia na-arụ ọrụ dara mgbe ọ na-esi n'ọdụ ụgbọ elu Lagos na-aga Akure. Ụgbọelu ahụ nọ n'ọrụ iburu ozu onye bụbu Gọvanọ nke Ondo State, Dr. Olusegun Agagu maka olili. Ụgbọelu ahụ nwere mmadụ ịrị abụọ n'ime ya ma ọ dịkarịa ala mmadụ ịrị na isii n'ime ha nwụrụ.[3]

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 ch-aviation.com - Associated Aviation retrieved 23 June 2019
  2. "Directory: World Airlines", Flight International, 2007-03-27, p. 78.
  3. "Nigeria: Plane crashes after take-off from Lagos" https://www.usatoday.com/story/news/world/2013/10/03/nigeria-plane-crash-lagos/2914067/

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]