Atụmatụ Ọmụmụ Maka Ụmụ agbọghọ
Atụmatụ ọmụmụ maka ụmụ agbọghọ bụ usoro ọmụmụ agụmakwụkwọ nke Juan Luis Vives chepụtara na narị afọ nke iri na isii maka agụmakwụkwọ ụmụ agbọghọ, nke kachasị maka Princess Mary, nwa nwanyị na onye nketa nke Henry nke Asatọ nke England na nwunye mbụ ya, Catherine nke Aragon . [1] [2]
Edere usoro ọmụmụ a na arịrịọ nke eze nwanyị mgbe ahụ. [3] [4] Vives nyefee ọrụ ahụ, De Raatione Studii Puerilis n'ụdị ogologo akwụkwọ ozi, nke e si na Oxford, England dee na ọnwa October afọ 1523. [5] Ederede abụọ dị iche iche gụnyere; otu, na ndụmọdụ maka agụmakwụkwọ nwa agbọghọ, ezubere na Princess Mary Tudor; Ihe odide nke abụọ, bụ́ nke na-ekwu banyere agụmakwụkwọ ụmụ nwoke, bụ Charles Mountjoy, onye bụ́ nwa nke chamberlain eze nwanyị bụ́ William Mountjoy. [4]
Ederede maka Princess Mary Tudor dụrụ ọdụ ka o “jiri mkpịsị aka ya dee ihe ọ bụla onye nkuzi kwesịrị họpụta”, na ọ lekwasịrị anya karịsịa n'ịmụ aha Latin maka "uwe, akụkụ nke ụlọ, nri, nkewa oge, ngwá egwú. ngwá ọrụ, [na] arịangwá ụlọ". [6]
- ↑ p.27, Susan James, Catherine Parr: Henry VIII's Last Love, Tempus Publishing, Stroud, Gloucestershire
- ↑ Wilcox (13 November 1996). Women and Literature in Britain, 1500-1700 (in en). Cambridge University Press. ISBN 978-0-521-46777-3.
- ↑ (13 August 2018) In Defence of Women (in en). Modern Humanities Research Association. ISBN 978-1-78188-774-5.
- ↑ 4.0 4.1 Vives (15 March 2000). The Education of a Christian Woman: A Sixteenth-Century Manual (in en). University of Chicago Press. ISBN 978-0-226-85814-2.
- ↑ Doran (21 June 2011). Mary Tudor: Old and New Perspectives (in en). Macmillan International Higher Education. ISBN 978-0-230-34510-2.
- ↑ Roches (November 2007). From Mother and Daughter: Poems, Dialogues, and Letters of Les Dames des Roches (in en). University of Chicago Press. ISBN 978-0-226-72339-6.