Atụmatụ Omume nke Osimiri Zambezi

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Atụmatụ Omume nke Osimiri Zambezi

Zambezi River System Action Plan (ZACPLAN) bụ atụmatụ mba dị iche iche n'okpuru United Nations Environment Program (UNEP) iji tinye ojiji dị irè, na njikwa nke usoro Osimiri Zambezi.[1][2] Ọ gụnyere mba asatọ ndị a depụtara: Angola, Botswana, Malawi, Mozambique, Namibia, Tanzania, Zambia, na Zimbabwe. Mba ndị a niile dị n'ebe ndịda Afrịka na-eji ọdọ mmiri Zambezi eme ihe; atụmatụ a na-anwa ijikwa ihe onwunwe n'otu n'otu, na n'etiti Mba SADCC iji mezuo ebumnuche mba, na nke mba ụwa maka ihe onwunwa mmiri.[2] N'ihi nnukwu ọdọ mmiri nke Osimiri Zambezi na ndị na-eso ya, atụmatụ usoro osimiri Zambezi bụ njedebe nke kọmitii UN, iji lekwasị anya na atụmatụ na ọchịchọ maka ime ka mmirir tolite. Asọmpi a na-emepụta ojiji na-adịghị mma, na ojiji na'ụzọ na-adịghị arụ ọrụ nke ihe onwunwe maka mba ndị a niile n'ụzọ bara uru.[2][3]

Mkparịta ụka mbụ nke atụmatụ a malitere na mbido afọ 1980 iji nweta ihe mgbaru ọsọ iji bulie ụzọ n'iji ọdọ mmiri Zambezi. E chepụtara ndepụta nke ebumnuche n'ụdị ọrụ nke Ụdị I, nakwa ọrụ nke Ụdị II. Mkparịta ụka mbụ metụtara ọrụ nke mbụ na nke abụọ ekwekọrịtaghị na mbụ, dịka mmekọrịta ndọrọ ndọrọ ọchịchị n'etiti ihe onwunwe, na mba enweghị ike ịbịaru nkwekọrịta nke ọrụ mbụ emere n'oge gaara aga.[3]

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. Geo-3: Global Environment Outlook. www.unep.org. Archived from the original on 19 November 2002. Retrieved on 14 January 2022.
  2. 2.0 2.1 2.2 SADC TODAY: August 2004 - SARDC. www.sardc.net. Archived from the original on 28 February 2005. Retrieved on 14 January 2022.
  3. 3.0 3.1 Treatise. hallway.evans.washington.edu. Archived from the original on 2018-03-24. Retrieved on 2023-04-04.