Atassi family

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Atassi family
Wikimedia disambiguation page

  Aha Atassi, nke a na-akpọkwa Atassi (Arabic) (Turkish: Atasi/ Atasizade) bụ aha ezinụlọ a ma ama na Homs, Siria, nke agbụrụ dị elu na oge ochie, nke malitere na narị afọ nke iri na ise AD. N'oge na-adịbeghị anya, ndị ezinụlọ ahụ na-eduga mmegide mba megide iwu French. Ike na ùgwù nke ezinụlọ ahụ ruru n'ókè dị elu mgbe e guzobere Republic of Syria nke oge a na nari iri itoolu iri atọ na isii, mgbe a họpụtara onye isi ala ya nke abụọ, Hashim al-Atassi dịka onye isi ala. Abụọ n'ime mmadụ asaa so na nzukọ iwu kwadoro iwu mbụ nke Siria na nari iri itoolu iri na itoolu bụ Atassis a ma ama: Wasfi al-Atassi na Hashim al-Aatassi. Ụmụ abụọ ọzọ, Lu'ay al-Atassi na Nureddin al-Aatassi, bụ ndị e debere dịka ndị isi ala n'afọ ndị nari iri itoolu na iri isii. Ndị òtù ezinụlọ gụnyere ndị majie, ndị gọvanọ, ndị nnọchi anya, ndị isi otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ndị isi agha na ndị ọrụ gọọmentị ndị ọzọ n'oge Ottoman na nke oge a.