Azụmahịa

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Azụmahịa¹ bụ ụzọ ọbụla mmadụ si achụta ihe ọ n'eri kwa ụbọchị. Ọbukwa ụzọ dị iche iche esi agbanwe ihe ahụrụ anya ọbụrụ ego ma ọbụ ụzọ esikwa eji ego agbanweta ihe ahụrụ anya. Uzọ ọzọ enwere ike isi hụta azụmahịa bụ iji ihe inwere gbanweta ihe ị nanwegị (trade by barter). Azụmahịa nwere ike inwe ọnọdụ ebe ọbụla n'abughi ahịa, mgbe mmadụ na ibe ya nọkọrọ, kwukọrịta ma nwee mkpebi gbasara ego na ngwongwo ma ọbụ ọrụ na ihe ndị ọzọ, azụmahịa ewerela ọnọdụ. Azụmahịa abụghị naanị maka uru ka eji azụ ya, ọnwere ulọ ọrụ mmasị ha bụ ịhụ na ndị mkpa ji nwetara ezi enyemaka.


Ebe azụmahịa dị iche iche gunyere: ọma ahia, ulọ ahịa, ọdụ ahịa nakwa ahịa ntanetị. Ọma ahịa:- bụ ebe ọtụtụ ndị mmadụ na azụ ihe dị iche iche, ọnye ọbụla nwere ike iburu ma ọbụ were ihe ọchọrọ ire gaa ebe ahụ nọrọ chere ọnye ga-azụ ya. Ọnye ọbụla chọkwara ịzụ ihe ọbụla nwekwara ike gaa ebe ahụ ma zụrụ ụdị ihe ọbụla ọchọrọ(market place). Ọma ahịa bụ ebe gọọmenti maọbụ obodo wepụtara maka azụmahịa dị iche iche. N'aka nke ọzọ, ndị igbo nwere ubochị ahịa anọ bụ Eke, Orie, Afọr na Nkwọ, obodo ọbụla nwekwara ọma ahịa ha n'ezukọ azụ ahịa ndịa. Ụlọ ahịa:- bụ ebe arụlụ ụlọ maka ịzụ ahịa, mmadụ nwere ike rụọ ụlọ tinyechaa ọnụ ahịa n'ime ya, ndị mmadu egoro nọrọ ebe ahụ na-azụkọrịta ahịa(shopping mall). Otu onye na-arụkwa ụlọ buru ibu nọrọ na-ere ahịa dị iche iche ndị mmadụ ana abịa na-azụrụ ahịa ebe ahụ(Super market). Ọdụ ahịa:- ndi na-ere otu udị ahịa nwere ike iga otu ebe gọọmentị ma ọbu obodo nyere ha nọrọ na azụ naanị otu ahịa ahụ dịka ndị n' arụpụta ma na-azụ akpụkpọ ụkwụ dị iche iche ma ọbụ ndị n'azụ naanị mgwa ọrụ eji arụ ulọ( building materials) wdg. Azụmahịa n'ikuku bụ ụdị azụmahịa eji ekwe ntị maọbụ komputa azụ. Mmadụ nwere ike ịnọ n'ụlọ ya were ekwe ntị maọbụ komputa banye na soshal midia zụọ ahịa na obodo ọzọ maọbụ ala bekee, ebulatara ya n'ụlọ.

Udị azụmahịa di iche iche gụnyere: Azụmahịa nkeonwe, azụmahịa mmekorita, obere ọnụ ọgụgụ azụmahịa, ụlọọrụ azụmahịa wdg. Azụmahịa nkeọnwe bụ mgbe mmadu na azụrụ ọnwe ya ahịa, ma uru ma ọghọm dị na ya bụ nke ọnye nwe ahịa(private business). Azụmahịa mmekọrịta bụ mgbe mmadụ abụọ maọbụ karịa jikọtara aka wee na azụ ahịa, uru na ọghọm dị na ya bụ nke ha niile. Azụpụta uru ha ekerie ya na onwe ha maọbụ were ya mee ka ahịa bawanye ụba (partnership business).

Ụzọ azụmahịa: enwere ụzọ azụmahịa abụọ nke bụ ọbere ọnụgugụ azụmahịa na nnukwu ọnụọgụgụ azụmahịa

Nkwalite azụmahịa na netwọk mmekọrịta[dezie | dezie ebe o si]

Otu n'ime ụdị nkesa ozi gbasara ngwaahịa na mgbasa ozi ya bụ mbipụta nke ozi na netwọk mmekọrịta. Ugbu a, ọ bụ otu n'ime ụdị mgbasa ozi na-ekwe nkwa. Dabere na nsonaazụ nke 2022, itinye aka na mgbasa ozi azụmaahịa na mgbasa ozi mmekọrịta bụ 26.8% n'etiti ndị ọrụ gbara afọ 16 ruo 64.

Usoro mgbasa ozi mgbasa ozi na-eduga nke ndị ahịa na-eji n'ụwa niile dịka nke Jenụwarị 2023:

  • Facebook (89% òkè nke ndị zaghachirinụ na-eji netwọk mmekọrịta a maka ịzụ ahịa azụmahịa);
  • Instagram (80%);
  • LinkedIn (64%);
  • YouTube (54%);
  • Twitter (44%);
  • TikTok (26%).

Uru nke azụmahịa na social media:

  • nnweta;
  • ikike ịhazi ndị na-ege ntị lekwasịrị anya n'ebe ọ bụla;
  • ịdị irè nke oge niile;
  • dịtụ ọnụ ala;
  • enwere ụdị dị iche iche na ụzọ nkwalite;
  • mmetụta nwa oge na ire ere mgbe emebere usoro nkwalite nke ọma.

Ọdịmma nke nkwalite azụmahịa na netwọk mmekọrịta:

  • obere oge ndụ nke mgbasa ozi;
  • mmetụta dị mkpirikpi site na mmetụta nke otu mgbasa ozi na-enweghị iji usoro mgbasa ozi arụpụtara nke ọma;
  • ohere dị mfe maka mmetụta ọjọọ nke ndị asọmpi na aha onye mgbasa ozi.

Otu n'ime ihe ndị a na-eme ugbu a bụ nhazi mgbasa ozi mgbasa ozi dịka azụmahịa na-erite uru maka ọtụtụ ndị mmadụ. Akụkụ bụ isi nke ndị mgbasa ozi na-elebara anya bụ profaịlụ mmekọrịta dị mma.


Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

https://en.opentran.net/igbo-english