Babungi Josephine Bebona

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Babungi Josephine Bebona
Born06-Jan-1973
Bundibugyo District, Western Region of Uganda
NationalityUgandan
CitizenshipUgandan
EducationSemuliki High School, Bundibugyo
Kabale School of Nursing and Midwifery
Rubaga School of Nursing and Midwifery
OccupationPolitician and midwife
EmployerBundibugyo District Local Government
Member of Parliament
Known forPolitics
TitleMember of Parliament
Political partyNational Resistance Movement (NRM)

Babungi Josephine Bebona nke a makwara dị ka Josephine Babungi Bebona bụ onye na-amụ nwa na nwanyị Member of Parliament maka Bundibugyo District dị ka nke Maach, na afọ 2021 na 11th parliament nke Uganda. Ọ nwere njikọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị na National Resistance Movement (NRM) ma ọ nọ na ndị omeiwu Uganda kemgbe afọ 2016.[1][2][3]

Mmalite na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Babungi Josephine Bebona na 06-Jan-1973 na Bundibugyo District na Western Region nke Uganda, nke dị n'ókè nke Democratic Republic of the Congo. Ọ gara Semuliki High School na Bundibugyo ebe ọ gụsịrị akwụkwọ sekọndrị ya na afọ 1989. O nwetara asambodo nke Enrolled Midwifery na 1997 site na Kabale School of Nursing and Midwiferay. N'afọ 2004, Babungi Josephine Bebona nwetara asambodo ndebanye aha na Midwifery site na Rubaga School of Nursing and Midwiferay.[1]

Ahụmahụ ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Babungi Josephine Bebona bụ onye na-amụ nwa site na afọ 1999 ruo na afọ 2003. Ọ ghọrọ onye nọọsụ na Bundibugyo District Local Government site na afọ 2005 ruo na afọ 2016. Ọ na-eje ozi ugbu a dị ka nwanyị Member of Parliament maka Bundibugyo District kemgbe afọ 2016 ruo ugbu a.[1]

Ewezuga ọrụ ndị omeiwu ya, ọ nọdụrụ na kọmitii ụfọdụ nke: Kọmitii na HIV / AIDS & Related Disease dị ka onye otu yana Kọmitii ahụike dị ka onye so.[1][4]

ỤlọOnyinye ndị ọzọ[dezie | dezie ebe o si]

Babungi Josephine Bebona bụ n'ezie onye kwenyere na nha nhata na udo n'ime mpaghara ya na mba ahụ n'ozuzu ya. O nyere aka n'idozi esemokwu agbụrụ dị n'etiti Bakonjo na Bamba na Bundibugyo District.[2] O sonyere n'ikesa enyemaka maka ezinụlọ ndị idei mmiri metụtara na Bundibugyo na njikọ aka na Uganda Red Cross Society na Gọọmentị Uganda na 2019 nakwa, ọ rịọrọ Ọfịs Praịm Minista nke Uganda ka ọ tinye Bundibugwo District na atụmatụ ịkwaga ebe ọ bụ na mpaghara ahụ na-ata otu ọdachi ahụ kwa afọ.[5][6] O sonyekwara na arụmụka afọ ole ọ ga-anọgide na-enweghị mkpebi site n'oge arụmụka ahụ kwụsịrị na 2017.[7] Babungi Josephine Bebona malitere ọrụ mmepe nkà ụmụ nwanyị nke e bu n'uche inyere ndị nwere nkwarụ (PWDs) aka nke onye isi oche nke ndị omeiwu nke Uganda mechara malite na 2018.[8]

Ọ bụ onye otu Kọmitii na-ahụ maka HIV / AIDS na Related Matter ebe o jisiri ike nweta akara nke 67.86.[4] O sonyere n'ọtụtụ ọrụ nke gụnyere ịzụta Mattresses na Grade 1 P.L.E Pupils, nyere Dr. Bukombi Of Kikyo Health Center na Bundibugyo Hospital A Diabetes Machine, nyere ụfọdụ ndị ọrụ ugbo Goats na Cows, nyere 30 Plastic Seats na 1,000,000UGX Na Mijosa Group.[4]

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

  • Ndepụta nke ndị otu nke iri na otu nke Uganda
  • Ógbè Bundibugyo
  • National Resistance Movement
  • Nzukọ omeiwu nke Uganda
  • Onye omeiwu
  • Richard Gafabusa
  • Christopher Kibanzanga

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]

Ebenside[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 Parliament of Uganda. www.parliament.go.ug. Archived from the original on 2021-04-27. Retrieved on 2021-03-13.
  2. 2.0 2.1 Simon. "Bundibugyo clashes: 80 suspects arrested, nine bodies recovered", The New Vision, Vision Group, 1 March 2016. Retrieved on 14 March 2021.
  3. "NRM Parliamentary Caucus", NATIONAL RESISTANCE MOVEMENT. Retrieved on 14 March 2021.
  4. 4.0 4.1 4.2 (April 2020) The Parliamentary Performance Scorecard 2018- 2019. Kampala: AFRICA LEADERSHIP INSTITUTE, 85,352,690, 691. ISBN 978-947478-111-0. 
  5. "Red Cross distributes relief to flash floods affected families in Bundibugyo", Uganda Red Cross Society, 12 September 2019. Retrieved on 14 March 2021.
  6. "Disaster In Bundibugyo", NBS, 9 December 2019. Retrieved on 14 March 2021.
  7. "Where your MP stands on age limit debate", Daily Monitor, 16 September 2017. Retrieved on 14 March 2021.
  8. Nyamwongera. "Bundibugyo District on the spot for marginalizing PWDs", Insider, 29 October 2018. Retrieved on 14 March 2021.