Bangandu language

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

   

Bangandu
Ngombe
Native to Cameroon
Native speakers
(2,700 Bangandu cited 1977)[1]



12,000 Ngombe (2010 census)[1]
Language codes
ISO 639-3 Either:



bgf – Bangandu



nmj – Nombe
Glottolog bang1347  Ngombe-Bangandu



ngom1265  (extensive bibliography)
ELP

Bangando na Ngombe mejupụtara asụsụ Gbaya nke Cameroon na CAR.

E nwere uzọ otu abụọ: Bangando n'onwe ya (Bàngàndò), na Cameroon, na Ngombe (Ba(n)gando-Ngombe, Ngombe-Kaka) ndị gbara gburugburu Mambéré-Kadéï Prefecture gafee ókèala na Central African Republic. E nwere ọtụtụ ndị a na-akpọ Ngombe, ọ bụghịkwa ihe doro anya nke koodu ISO ụgha maka Ngombe.[2] N'ụwa niile, ewere asụsụ Bangando dị ka asụsụ n'achọ ikpochapụ, ebe ndị na asu asụsụ dị puku abụo, narị asaa ruo puku atọ na narị ise. Enwere ike inweta ọkwa ọnọdụ asụsụ site na Ethnologue Expanded Graded Intergenerational Disruption Scale.[3]

Nkesa[dezie | dezie ebe o si]

A na-asụ Bangandu na njedebe ndịda nke ngalaba Boumba-et-Ngoko (Mpaghara ọwụwa Anyanwụ) na obodo Moloundou, n'okporo ụzọ isi obodo Moloundou ruo Lokomo. A na-asụkwa Bangandu na obodo Congo. Na Cameroon na Congo, e nwere ọ dị ka puku abụo na narị asaa na asụ asụsụụ a (Voegelin & Voegelin 1977). (Bangandu, nke gọọmentị ime obodo na-akpọ Bangantou, ekwesịghị ka ewere n'ọbụ otu ihe dika Bageto, nke a na-akpọkwa Bananto, nke olumba Mpo.)[4]

Ọdiche dika nke bụkwazị Ngombe, a nasụ na Central African Republic n'agbata Gamboula (n'ókè Cameroon) na Berbérati.[4]

Ọnọdụ mmekọrịta na asụsụ[dezie | dezie ebe o si]

Ndị na-asụ Bangando nọkari gburugburu mpaghara ndịda Cameroon. Asụsụ Bangando bụ asụsụ aga agunwe na ọbụ asụsụ ana amụta site na ọnọdụ ma ọbụ ihe onye na amụya na ahụ dika ndị edemede J.W. Berry, S.H Irvine na E.G. Hunt si kwuo n'akwụkwọ ha Indigenous Cognition: Functioning in Cultural Context .[5] Mmụta asụsụ na-adabere n'ọhịa na-agụnye mkpuchi zuru oke nke onye ọ bụla n'ime obodo nke a na-asụ asụsụ ahụ. Ndị edemede J.W. Berry, S.H Irvine na E.G. Hunt gara n'ihu na ekwukwasa na enweghị agụmakwụkwọ ndị na-asụ asụsụ obodo na-enweta iji nwee ọganihu na mpụga obodo Bangando. Akụkụ a nke obodo Bangando nwere ike ijikọta ya na asụsụ Bangando. Ọtụtụ akụkọ nke ndị na-asụ Bangando, gụnyere akụkọ nke onye edemede Victor Barnouw dere nke dị na akwụkwọ akụkọ American Anthropologist na-egosipụtakarị ndị na-ekwu okwu dị ka ndị ọrụ ugbo na ndị na-achịkọta.[6]

Ịgụ ihe ọzọ[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 Bangandu at Ethnologue (18th ed., 2015) (subscription required)
    Nombe at Ethnologue (18th ed., 2015) (subscription required)
  2. Hammarström (2015) Ethnologue 16/17/18th editions: a comprehensive review: online appendices
  3. Language Status
  4. 4.0 4.1 (2012) in Binam Bikoi: Atlas linguistique du Cameroun (ALCAM), Atlas linguistique de l'Afrique centrale (ALAC) (in fr). Yaoundé: CERDOTOLA. ISBN 9789956796069. 
  5. J.W. Berry, S.H Irvine, E.G. Hunt, Indigenous Cognition: Functioning in Cultural Context, 1988
  6. Victor Barnouw, American Anthropologist, Basic Problems in Cross-Cultural Psychology: Selected Papers from the Third International Conference of the International Association for Cross-Cultural Psychology pg 405-406, 1978