Beatrice Mukansinga

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Beatrice Mukansinga
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịRwanda Dezie
Aha enyereBeatrice Dezie
Ọrụ ọ na-arụwomen's rights activist Dezie
Ihe nriteGinetta Sagan Award Dezie

Beatrice Mukansinga bụ onye na-ahụ maka ihe ndị ruuru ụmụnwanyị na Rwanda nke na-elekwasị anya na ụmụnwanyị ndị mgbukpọ agbụrụ nke Rwanda metụtara nke ukwuu.

Akụkọ ndụ[dezie | dezie ebe o si]

Ọ hapụrụ Rwanda n'oge mgbukpọ agbụrụ wee kwaga Kenya. Mgbe o si Kenya laghachi Rwanda n'afọ 1995, ihe na-erughị otu afọ mgbe mgbukpọ ahụ gasịrị, e gbukwara ndị ezinụlọ ya gụnyere ndị mụrụ ya na ụmụnne isii n'oge mgbukpọ agbụrụ ahụ n'afọ 1994.[1][2]

Aka Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

  Ọ sonyeere òtù ọrụ ebere nke ọha na eze bụ Barakabaho Foundation na -afo 1995, mgbe ọ laghachiri Rwanda.[2] Ọ malitere ịrụ ọrụ na nzukọ ahụ na-enye enyemaka maka ụmụ nwanyị ndị lanarịrị mgbukpọ agbụrụ.[3][4]

O mechara guzobe otu MBWIRA NDUMVA (Kwuo, Ana m ege ntị) n'afọ 1996 dị ka otu nzukọ jikọtara ya na Barakabaho Foundation. Ọ malitere nzukọ ahụ iji kwado ma nye nduzi maka ụmụnwanyị na-enweghị nne na nna na ndị e dinara n'ike bụ ndị a chụpụrụ n'ihi mgbukpọ agbụrụ nke Rwanda n'afọ 1994.[5]

A kpaliri ya ka o guzobe otu Mb disput Dumva mgbe ọ nwetasịrị ahụmịhe na echiche site n'aka onye gburu agbụrụ na onye e dinara n'ike. Beatrice bukwa Nwanyi amaama nkeoma n'aka ịgba ume na ime ka ụmụnwanyị e dinara n'ike n'oge mgbukpọ agbụrụ ahụ kwenye ịzụlite ụmụ ha kama ịhapụ ụmụaka ahụ.[6] Amnesty International nyere ya Ginetta Sagan Fund Award na 1998 iji kwado enyemaka ya nye ndị lanarịrị mgbukpọ agbụrụ nke Rwanda.[7][2]

N'ọnwa Ọgọstụ 2021, edepụtara ya dị ka otu n'ime ụmụnwanyị asaa na-eme ngagharị iwe n'Afrịka nke kwesịrị isiokwu Wikipedia site na Global Citizen, otu mba ụwa na òtù nkwado.[5]

Edensibịa[dezie | dezie ebe o si]

  1. Simon (2000). Between Hope and Despair: Pedagogy and the Remembrance of Historical Trauma (in en). Rowman & Littlefield. ISBN 978-0-8476-9463-1. 
  2. 2.0 2.1 2.2 Ginetta Sagan human rights award goes to Rwandan (August 12, 1998). www.almanacnews.com. Retrieved on 2021-08-10.
  3. McKinley. "Legacy of Rwanda Violence: The Thousands Born of Rape", The New York Times, 1996-09-23. Retrieved on 2021-08-10. (in en-US)
  4. Survivors of genocide bear the heaviest burden (en). The Independent (2011-09-17). Retrieved on 2021-08-10.
  5. 5.0 5.1 7 Notable African Women Activists Who Deserve Wikipedia Pages (en). Global Citizen. Retrieved on 2021-08-10.
  6. Local reverend finds Rwanda rich in warmth, friendliness (en-US). Chico Enterprise-Record (2006-10-22). Retrieved on 2021-08-10.
  7. The Ginetta Sagan Award (en-US). Amnesty International USA. Retrieved on 2021-08-10.