Jump to content

Begum Serajunnessa Choudhury

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Begum Serajunnessa Choudhury
mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
Ebe ọmụmụRajnagar Upazila Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya1974 Dezie

 

Begum Serajunnesa Choudhury ( Bengali) bụ onye otu ọgbakọ omebe iwu nke atọ nke Pakistan dịka onye nnọchite anya East Pakistan . [1]

Ndụ mmalite na ezinụlọ

[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Choudhury na 1910, nye ezinụlọ Dewan nke Rajnagar na Sylhet District, Eastern Bengal na Assam, British India . Nna ya, Dewan Abdul Halim Chowdhury, bụ onye Bengali Muslim zamindar nwere mmetụta. Ọ gụrụ akwụkwọ na nzuzo n'ụlọ ya, ebe ọ gụrụ akwụkwọ Bengali, Bekee na Islamic Studies . [2]

Ọ lụrụ Abdur Rasheed Choudhury nke Dargapasha, [3] onye otu Assam omebe iwu ma mesịa bụrụ onye otu Central Legislative Assembly na Delhi . [4] Ha biri na Rashid Manzil, Sylhet ma mụọ ụmụ asaa; ụmụ nwoke ise, gụnyere Humayun Rashid Choudhury na Faruk Rashid Chowdhury, na ụmụ nwanyị abụọ. [5]

Mgbe di ya nwụsịrị na 1944, Serajounnessa Choudhury mere nlekọta nke ihe onwunwe zamindari ya na ubi tii. Ọ ghọrọ onye isi njikwa nke Rashid Enterprises Limited na Hamdard Tea Company Limited, osote onye isi oche nke Pakistan National Tea Association, mutawalli (onye nlekọta) nke Serajnagar na Rashidabad Waqf Tea Garden. Ọ rụkwara ọrụ dịka onye so na kọmitii njikwa nke Durgapasha Abdur Rashid Kindergarten. [2]

Choudhury bụ onye otu ọgbakọ omebe iwu nke atọ nke Pakistan . Na nzuko omeiwu, ọ jụrụ ihe mere alaka ụlọ ọrụ ozi nile ji dịrị na West Pakistan . [6]

Ọnwụ

[dezie | dezie ebe o si]

Ọ nwụrụ na 1974, na Bangladesh . [3] Begum Sirajunnesa Chowdhury Hall nke Shahjalal University of Science and Technology ka akpọrọ aha ya. [7]

Ntụaka

[dezie | dezie ebe o si]
  1. Assembly (1965). Parliamentary Debates. Official Report (in en). Manager of Publications.. 
  2. 2.0 2.1 Rahman, Fazlur (1991). "বেগম সিরাজুন্নেসা", সিলেটের মাটি, সিলেটের মানুষ (in bn). MA Sattar. 
  3. 3.0 3.1 "Man in the News; U.N. Enthusiast at Assembly Helm: Humayan Rasheed Choudhury", The New York Times, 1986-09-23. Retrieved on 2016-04-12.
  4. Nasrine R Karim. "Lest we forget Humayun Rasheed Choudhury", The Daily Star, July 11, 2003. Retrieved on March 13, 2015.
  5. "A Legacy of Love", The Daily Star, 2010-06-25. Retrieved on 2017-12-22.
  6. Assembly (1966). Debates: official report (in en). Manager of Publications.. 
  7. Shahjalal University of Science & Technology. www.sust.edu. Retrieved on 2022-01-27.