Jump to content

Bhupathi Raju Srinivasa Varma

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

 

Bhupathi Raju Srinivasa Varma bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị India si Bhimavaram, Andhra Pradesh. A họpụtara ya ka onye otu nzuko omeiwu sitere na mpaghara Narasapuram Lok Sabha. Ọ bụ onye Bharatiya Janata Party. [1][2]

Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị

[dezie | dezie ebe o si]
Varma na-aṅụ iyi dị ka onye ozi union

Bhupathi Raju Srinivasa Varma rụrụ ọrụ maka AISAF dị ka onye ndu ụmụ akwụkwọ na 1980 wee bido ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya site na isonye na BJP na 1988 dị ka onye ọrụ BJP. N'agbata 1991 - 97 ọ rụrụ ọrụ dị ka onye isi oche mpaghara BJP Bhimavaram Town, jere ozi ugboro abụọ dị ka onye isi oche mpaghara West Godavari nke BJP site na 2008-14. Na 2014, ọ meriri dị ka onye kansụl nke Bhimavram municipal ward site na nkwado nke Telugu Desam Party. Ọ rụkwara ọrụ dị ka onye isi oche. Ọ rụrụ ọrụ dị ka Bharatiya Janata Party Secretary State si 2020-23. Na 2024, site na nkwado nke Telugu Desam Party na Jana Sena Party, a họpụtara ya ka ọ bụrụ MP na tiketi BJP sitere na mpaghara Narsapuram nwere nnukwu oke nke 2.76 lakh votes. [3]

Nhọrọ ndị a na-asọ mpi na nsonaazụ ya

[dezie | dezie ebe o si]
  • Onye omeiwu
Afọ Mpaghara Nsonaazụ ịtụ vootu onye mmegide ịtụ vootu oke
2024 Narasapuram WonY 7,07,343 Guduri Umabala 4,30,541 2,76,802
  • Ozi nke Atọ nke Modi

Ebem si dee

[dezie | dezie ebe o si]