Bimbo Balogun
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
aha enyere | Bimbo |
Ebe ọmụmụ | Ȯra Ondo |
ọrụ ọ na-arụ | onye ọchụnta ego |
ebe agụmakwụkwọ | Ụlọ Ọrụ Na-enye Ọzụzụ Na agụmakwụkwọ Mmanụ |
Bimbo Balogun, nke a na-akpọ Abimbola Balogun mgbe ụfọdụ bu onye Naijiria nwetara ihe nrite ọla na nwanyị ọchụnta ego. Ọ bụ onye isi oche nke Bimbeads Concept. [1]
Mmalite
[dezie | dezie ebe o si]Bimbo Balogun bu onye Idoani na Ondo State, Naijiria. Ọ bụ nwa nke atọ sitere n’ezinụlọ mmadụ asaa. [2] Bimbo gụrụ akwụkwọ sekọndrị na kọleji gọọmentị etiti dị n'Idoani dị n'Ondo steeti. Mgbe nke a gachara, ọ gakwara ụlọ akwụkwọ Peteoleum Training Institute, Efurrun, Warri, Delta State ebe ọ gụrụ akwụkwọ n'ụlọ ọrụ Petroleum Marketing Technology. [3] Ka ọ gụchara ma mechaa ọrụ ndị ntorobịa nke mba na Naịjirịa, ọ malitere ịrụ ọrụ nke imeputa bead n'ihi enweghị ọrụ. [4] Kamgbe ahụ Bimbo nakweere iji shei oke osimiri, azụ kpakpando, oyster shell na ihe ndị ọzọ eji eme ọla. [4] N'ịgbakwụnye bead, Bimbo na-akwadokwa ihe ngosi ihe onyonyo nke Naijiria kwa izu nke gbadoro ụkwụ n'ịkụziri ndị ntorobịa na ụmụ nwanyị ka esi eme ọla. [5]
Ihe nrite na nnabata
[dezie | dezie ebe o si]N'oge mmalite nke ịchọ mma ya, Bimbo meriri akwụkwọ mmụta Goldman Sachs nke nyere ya ohere ịdebanye aha na Mahadum Pan Atlantic, Lagos State . [6] Ọzọkwa, ọ meriri The Accessory Company nke 2013 award sitere n'aka Wed Expo, [7] na Design School of The Year sitere n'aka Azaria 360. [7]
Ebensidee
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ BBC News. "The Nigerian woman who sold two necklaces and never looked back", BBC News, 22 June 2012. Retrieved on 12 November 2020. (in en-GB)
- ↑ Urban Woman Magazine (30 August 2018). Mrs Bimbo Balogun, CEO, Bimbeads Concept, is the Nigerian woman who sold two necklaces and never looked back (en-GB). Urban Woman Magazine. Retrieved on 12 November 2020.
- ↑ Bell Africana (30 March 2017). Meet The Founder Of Bimbeads Concept | Exclusive Interview (en-US). Bellafricana – Community for Creative Businesses. Retrieved on 12 November 2020.
- ↑ 4.0 4.1 Blueprint Newspaper Limited (2 April 2019). Bead maker recounts gain in business (en-US). Blueprint Newspapers Limited. Retrieved on 12 November 2020.
- ↑ III (2 April 2019). Bead maker recounts gain in business (en-US). Blueprint Newspapers Limited. Retrieved on 12 November 2020.
- ↑ Meet The Founder Of Bimbeads Concept | Exclusive Interview (en-US). Bellafricana – Community for Creative Businesses (30 March 2017). Retrieved on 12 November 2020.
- ↑ 7.0 7.1 Market Place Africa. Bimbo Balogun. marketplaceafrica.com. Archived from the original on 6 August 2020. Retrieved on 12 November 2020.